Ihe anyị ma maka ndị omekome wakporo 'Oko-Ekwulobia flyover' n'Anambra steeti

Ihe a napụtara ndị omekome

Ebe foto si, Nigeria Police

Nkọwa foto, Ihe a napụtara ndị omekome
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị uweojii n'Anambra steeti ekwupụtara etu mkpamkpa ahụ kpara na mpaghara Oko-Ekwuluobia Flyover dị n'Aguata na steeti ahụ si kpaa.

Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii sị na ndị ọrụ nchekwa gburu otu onye n'ime ndị omekome ahụ ma nara ha egbe AK-47 abụọ nakwa ụgbọala anọ ha ji bịa.

Tochukwu gbakwụnyere na mmadụ abụọ ndị nkịtị nwụrụ n'oge ahụ ebe ụgbọala ndị uweojii gbara ọkụ.

N'okwu ya "Ndị ọrụ nchekwa na ndị omekemo kwakọtara mgbọ n'ụtụtụ Julaị 9, 2025 n'ebe "Oko-Ekwuluobia flyover' dị na gọọmenti okpuru ọchịchị Agụata, n'Anambra steeti".

"Ndị ọrụ nchekwa gburu otu onye n'ime ndị omekome, napụta ha egbe AK-47".

Ụgbọala a napụrụ ndị omekome ahụ gunyere " Toyota Camry akara ya bụ ENU 58 SC, GLK Mercedes Benz, Lexus 330 akara ya bụ No: ENU 815 AP nakwa Toyota Highlander akara ya bụ GDD 517 RW".

Etu ọgbaaghara ahụ si bido

Dịka Tochukwu Ikenga si kwuo, ndị omekome ahụ rutere n'ebe Oko-Ekwulobia flyover bido na-agba ndị mmadụ egbe aghara aghara.

Ọ sị na ọ bụ oge ahụ ka ndị ọrụ nchekwa gara zute ha nke butere nkwakọrịta mgbọ.

N'oge ahụ ka "mmadụ abụọ ndị nkịtị nwụrụ mana e tinyela ozu ha n'ọba ozu".

Ọ kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ merukwara ahụ.

Ebe ọzọ ndị omekome wakporo

Tochukwu Ikenga kọwakwara na ndị omekome wakpokwara Isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Oko, mana enweghị onye nwụrụ ahụ maọbụ onye nwụrụ.

Dịka ihe a niile na-eme, kọmịshọna ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Ikioye Orutugu gwara ndị steeti ahụ ka obi ruo ha ala ma kwee nkwa nchekwa zuruoke.

Cheta na ihe na-erubeghị izu ụka anọ maọbụ ọnwa Mee ka ndị omekome mwakporo ndị Ebonyi Development Union na-enwe nzukọ n'ogboji, n'Anambra steeti ma gbuo mmadụ ruru iri.

Ọzọ bụkwa mgbe ihe ọdachi mere n'ụlọakwụkwọ nkanụụzụ Federal Polytechnic Oko dị n'okpuru ọchịchị Orumba Nọt n'Anambra steeti n'onwa Juun.

Ọ bụkwa n'ọnwa Mee ka a kwugburu nwaanyị dị ime na steeti ahụ.