Ihe ndị uweojii kwuru gbasara nwaanyị dị ime a kwụgburu n'osisi n'Anambra steeti

Ihe ndị uweojii kwuru gbasara nwaanyị dị ime a kwụgburu n’osisi n’Anambra steeti

Ebe foto si, Ndị Uweojii n'Anambra steeti/Gettyimages

Nkọwa foto, Ikioye Orutugu Kọmishọna ndị uweojii n'Anambra steeti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Kọmịshọna ndị uweojii Anambra steeti bụ Ikioye Orutugu akpọọla oku ka ndị ọnụ na-eru n'okwu na ndị ndu obodo n'okpuru ọchịchị Idemili North nye aka ịrọpụta ozi ndị ga-enye aka mee ka a chọpụta ndị gburu nwaanyị dị ime na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru nke a n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Tuzde 6 Mee 2025.

Ọ kọwara na nwaanyị ahụ di ime bụ onye a kwụgburu n'elu osisi 'cashew' n'okporoụzọ sitere Uke gawa Ideani.

Ikenga kwuru na kọmịshọna ndị uweojii kọwara ihe ọdachi ahụ dịka nke na-agba anyammiri ma bụrụkwa ihe ịmaatụ na-egosi 'mmadụ enweghị obi mmadụ n'ebe ibe ya nọ".

Ozi ahụ kwuru na ya bụ kọmịshọna nyere iwu ka e mee ezigbo nnyocha miri emi iji chọpụta ndị aka ha dị n'arụ ahụ ma mee ka ha nata ikpe nkwụmọọtọ.

Dịka ozi ahụ siri kwuo, e budatala ozu ya bụ nwaanyị dị ime ma bugaa ya n'ọbaozu dịka ndị uweojii na-akpọ ọhanaeze oku ka ha nye aka chọpụta onye nwaanyị ahụ bụ.

Ihe anyị ma maka ozu nwagbọghọ dị ime a sị a hụrụ n'elu osisi n'Anambra steeti

Ihe anyị nụrụ gbasara nwagbọghọ dị ime a sị a hụrụ ozu ya n’elu osisi n’Anambra steeti

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwwanyị bu afọ ime

Akụkọ fesara ebe niile n'ụbọchị Mọnde 5 Mee 2025 na otu nwaagbọghọ dị ime ka na-eto a maghị onye ọ bụ jiri aka ya kwụgbuo onwe ya n'elu osisi n'obodo Umuezu dị n'okpuru ọchịchị Idemili North n'Anambra steeti.

Ụfọdụ mmadụ setere onyonyoo nwaagbọghọ ahụ ma kesaa ya n'ọbaozi dị iche iche, bụ nke ọtụtụ mmadụ kọwara dịka nke na-amapụ obi.

Foto ahụ gosiri ozu nwaagbọghọ ahụ dị ime ebe ọ kwụ n'elu osisi 'cashew' ma gosikwa ekwentị ya ebe ọ tọgbọ ya n'akụkụ.

Ka o sina dị, ya bụ onyonyoo akọwaghị onye nwaagbọghọ ahụ bụ maọbụ ebe o si kama ụfọdụ mmadụ kwuru na o nwere ike ịbụ n'ihi ihe isiike mere o jiri wepụ ndụ ya.