Ihe anyị ma banyere ụlọọrụ Innoson a kụkpọrọ n'Anambra steeti

Ụlọọrụ Innoson ahụ a kụkpọrọ
Nkọwa foto, Ụlọọrụ Innoson ahụ a kụkpọrọ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Mịnịstrị na-ahụ maka ọrụ n'Anambra steeti akụkpọọla ogige ngosi ụlọọrụ Innoson Vehicle Manufacturing Company dị n'Owerri Road, Umudim n'okpuru ọchịchị Nnewi.

Akụkọ kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Wenezde 16 Eprel, 2025 ka ndị ọrụ mịnịstrị ahụ bịara jiri nnukwu ụgbọala caterpillar kurie ụlọ ahụ nakwa ụfọdụ ụlọ ndị ọzọ dị n'ụzọ ahụ.

Oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo gara ebe ahụ ịgba ụfọdụ ndị a kụriri ụlọ ha ajụjụ ọnụ, ụfọdụ n'ime ha gosiri mwute ha banyere agwa gọọmenti kpasara ha.

Gọọmenti kụkpọrọ ụlọ Maazị Anthony Onebunne

Ebe foto si, Gọọmenti kụkpọrọ ụlọ Maazị Anthony Onebunne

Nkọwa foto, Gọọmenti kụkpọrọ ụlọ Mazị Anthony Onebunne

Otu onye n'ime ha bụ Maazị Anthony Onebunne kọwaara anyị etu nkuri a si mee.

N'okwu ya "Gọọmenti bịara n'ọnwa Nọvemba 2024 gwa anyị ha ha chọrọ ịrụ okporoụzọ ahụ. Ha mapụtara ụfọdụ ebe ha ga-akụkpọ, ha ji mkpịsị odee ojii na nke na-acha ọbara ọbara mapụta ebe ndị ahụ, anyị hụrụ ya".

"N'ọnwa Febụwarị 2025, ndị ọrụ gọọmenti bịara rụọ ọwammiri n'ụzọ ahụ, mana ka izuụka abụọ gara, ha laghachitara kụkpọọ ebe ndị ahụ ha ji mkpịsị odee oji mapụta," ka Maazị Onebunne kwuru.

Ụlọ Maazị Anthony Onebunne gọọmentị kụkpọrọ
Nkọwa foto, Ụlọ Maazị Anthony Onebunne gọọmentị kụkpọrọ

Maazị Onebunne kwuru na ndị ọrụ gọọmenti bịakwara ọzọ n'ụbọchị Tuzde 15 Eprel 2025 gwa ha na ha nwere naanị abalị iri iji wepụ ihe ọbụla ha nwere n'ebe ndị ahụ ha ji mkpịsị odee na-acha ọbara ọbara mapụta maka na gọọmenti ga-akụkpọ ya.

Mana Maazị Onebunne kwuru na ndị ọrụ ahụ laghachitara ụbọchị Wenezde 16 Eprel malite ịkụkpọ ụlọ ha.

Mbọ anyị gbara inweta ọnụ mmiri okwu ụlọọrụ Innoson banyere ụlọ ha gọọmenti kụkpọrọ kụrụ afọ n'ala.

Ogige ụlọụka St. Micheal the Archangel Catholic Church Umudim, Nnewi gọọmenti kụkpọrọ mpaghara ihu ya
Nkọwa foto, Ogige ụlọụka St. Micheal the Archangel Catholic Church Umudim, Nnewi gọọmenti kụkpọrọ mpaghara ihu ya

Ebe ndị ọzọ gọọmenti kụkpọrọ gụnyere ihu ụlọụka St. Micheal The Archangel Catholic Church Umudim, Nnewi.

Anyị gbara mbọ ịgba ụkọchukwu ụlọụka ahụ ajụjụ ọnụ mana ọ gwara anyị na ọ nọghị nso.