Lee ihe onyeisi AGN kwuru banyere ndị Nollywood abụọ a sị nwụrụ n'Imo Steeti

Ebe foto si, Emeka Rollas/Instagram/AGN/X
Onyeisi otu jikọrọ ndị na-eme ejije na Naịjirịa a maara dịka Actors Guild of Nigeria (AGN) bụ Emeka Rollas ekwuola na ya nụrụ maka ọnwụ mmadụ abụọ ahụ mana odoghị ya anya na ha bụ ndị otu AGN.
Emeka Rollas gwara BBC Igbo na ọ na-eche ka o nweta nkọwa n'aka onyeisi AGN n'Imo steeti iji chọpụta ka ndị ahụ a bụ ndị otu ha.
Ọ gara n'ihu dọọ ndị otu AGN niile aka na ntị ka ha kpachara anya ma soro usoro iwu dobere tupu ha esonye n'ihe ejije ọbụla iji gbochie nsogbu maọbụ ọghọm ọbụla.
Ihe anyị ma gbasara ndị Nollywood abụọ a si nwụrụ n'Imo steeti

Ebe foto si, Nigerian Police, Actors Guild ofNigeria/X
Akụkọ fesara n'ọgbọ nziritaọzị soshal midịa na mmadụ abụọ na-eme ejije nwụrụ n'Owere bụ isi obodo Imo steeti oge ha mechara ejije.
Ya bụ akụkọ fesara n'ụbọchị Fraịde 18 Eprel 2025 kwuru na mmadụ abụọ ahụ gụnyere otu onye na-eme ejije a ma ama na otu onye na-ese onyonyoo.
Dịka ụfọdụ mmadụ siri kwuo na soshal midịa, onye nhazi ejije nwere obiụtọ na ejije ya akụrụla ọnụ bụ nke mere o ji zụtara ndị ha na ya soro mee ejije otu mmanya ọkụ a ma ama iji kelee ha.
A sịrị na dịka ọ gasịrị elekere ole na ole, mmadụ anọ ndị ṅụrụ mmanya ahụ malitere ịgbọ agbọọ mana dịka ọnọdụ ahụ kawanyere njọ, e mere ka ndị ọzọ mara maka ya.
Akụkọ sịrị na e mechara bugaa ha ụlọọgwụ bụ ebe a nọ kwupụta abụọ n'ime ha dịka ndị nwụrụ anwụ.
Anyị agbaala mbọ inweta Onyeisi otu jikọrọ ndị na-eme ejije na Naịjirịa a maara dịka Actors Guild of Nigeria (AGN) bụ Emeka Rollas mana o nweghị isi.
Ihe ndị uweojii kwuru
Oge BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye, ọ kọwara akụkọ ahụ dịka eziokwu.
"Anyị nụrụ maka ndị na-eme ejije nwụrụ n'Owere mana o dobeghị anyị anya ma ọ bụ naanị otu onye ka ọ bụ mmadụ abụọ nwụrụ".
"Anyị nụrụ na ha nwụrụ ka ha richara nri ma ṅụọ mmanya oge ha mechara ejije. Ka ọ dị ugbua, anyị amalitela ime nnyocha rijuru afọ iji chọpụta ihe butere ọnwụ ha," ka Okoye gwara anyị.
Ọ sịrị na ha ga-enyocha ozu ndị nwụrụ anwụ iji chọpụta kpọmkwem ihe butere ọnwụ ha.









