Ihe anyị chọpụtara gbasara onye Nollywood bụ Nkechi Nweje a sị nwụrụ

Ebe foto si, nkechi.nweje/Instagram
Akụkọ fesara ebe niile n'ụbọchị Fraịde 21 Maachị 2025 gbasara ọnwụ onye na-eme ejije a ma ama bụ Nkechi Nweje.
Ụfọdụ kwuru na ya bụ nwaanyị Ọnịcha nwụrụ ka ọ rịachara obere ọrịa a kpọghị aha.
Oge BBC News Igbo kpọtụụrụ onyeisi otu jikọtara ndị na-eme ejije na Naịjirịa bụ Emeka Rollas, o kweghị aza oku ekwentị ya maọbụ zaghachi ozi ndị e zigaara ya.
Mana ụfọdụ ndị Nollywood amalitela izipụ ozi arrịrị n'akara soshal midịa ha dị iche iche.
Otu n'ime ndị kwupụtara ọnwụ Nweje bụ Stanley Chibueze Ajemba, onye aha e ji mara ya bụ Stanley Ontop.
Dịka nwamadị ahụ siri dee n'akara Instagram ya, Nkechi Nweje nwụrụ n'ụtụtụ Fraịde 21 Maachị 2025.
Akụkụ ozi ahụ sịrị "Nollywood nọ n'anyammiri dịka otu n'ime ndị ma ka e si eme ejije bụ Nkechi Nweje nwụrụ ka ọ rịachara obere ọrịa".
"E nweghị m ike depụta ya kemgbe ụtụtụ maka na ọ dị m ka ọ bụ na nrọ," ka Stanley Ontop dere na Instagram.
Ka o sinadị, BBC ka na-agba mbọ inweta ozi rijuru afọ gbasara akụkọ ahụ site n'aka ndị ezinaụlọ Nkechi Nweje maọbụ ikwu na ibe ya.









