Ụlọikpe ekpebiela na ọ bụ Nicholas Ukachukwu meriri ntuliaka imeụlọ APC mere n'Anambra Steeti

Valentine Ozigbo kpụpụrụ pati All Progressives Congress (APC) ụlọikpe maka ebubo na ha gwuru ya chandum na ntuliaka ime ụlọ APC mere n'Anambra steeti n'ụbọchị Satọde, Eprel 5, 2025 iji họpụta onye ga-azọrọ ha ọkwa Gọvanọ steeti ahụ n'ọnwa Novemba 2025.
Nkọwa foto, Nicholas Ukachukwu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 12

Ụlọikpe ukwu Naịjirịa dị n'Awka isi obodo Anambra steeti, ekpebiela na ọ bụ Nicholas Ukachukwu meriri ntuliaka imeụlọ pati All Progressives Congress (APC) mere n'Anambra steeti ma bụrụ onye ga-eji ọkọlọtọ APC zọọ ọkwa Gọvanọ na ntuliaka a ga-eme na Nọvemba 8, 2025 na steetị ahụ.

Cheta na esemokwu dapụtara oge mpụtara ntulaiaka imeụlọ APC mere gbara n'anwụ. Nke mere ka ks Valentine Ozigbo kpụpụ ha n'ụlọikpe.

Na mkpebi ya, Ọkaikpe Evelyn Anyadike kpebiri na Valentine Ozigbo egosipụtanwughị na e nwere nrụrụaka maọbụ ụdịrị chandum ọbụla na ntuliaka imeụlọ ahụ APC mere.

Ọkaikpe Anyadika gara n'ihu kwuo na ụlọikpe enweghị ikike ịkwụsị maọbụ tinye aka n'ihe gbasara iwu otu ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ihe ndị ọzọ ha na-eme.

Valentine Ozigbo akpụpụla APC ụlọikpe maka igwu ya chandum na ntuliaka ime ụlọ Anambra Steeti

Ozigbo kwuru na e mere ntuliaka ahụ n'ụzọ megidere iwu ma kpọọ oku ka a kagbuo mpụtara ya.

Ebe foto si, Valentine Ozigbo/Facebook

Nkọwa foto, Ozigbo kwuru na e mere ntuliaka ahụ n'ụzọ megidere iwu ma kpọọ oku ka a kagbuo mpụtara ya.

Valentine Ozigbo akpụpụla pati All Progressives Congress (APC) ụlọikpe maka ebubo na ha gwuru ya chandum na ntuliaka ime ụlọ APC mere n'Anambra steeti iji họpụta onye ga-ejiaha ha zọọ ọkwa Gọvanọ steeti ahụ n'ọnwa Novemba 2025.

Cheta na akwụkwọ ozi mkpesa Ozigbo degaara otu kọmitii APC na-ahụ maka mkpesa ntuliaka n'ụbọchị Tuzde 8 Eprel, 2025, katọrọ ntuliaka ime ụlọ ahụ ha mere n'Anambra steeti ma kwuo na APC gwuru ya chandum.

Ọ gara n'ihu kwuo na e mere ntuliaka ahụ n'ụzọ megidere iwu ma kpọọ oku ka a kagbuo mpụtara ya.

N'ozi akwụkwọ ozi ọzọ Ozigbo wepụtara n'akara soshal midịa ya mere ka a mata na ọ kpụpụla APC ụlọikpe.

O kwuru na ọ bụghị Nicholas Ukachukwu meriri ntuliaka ahụ ma gaa n'ihu kwuo na Ukachukwu etozughị ịzọ ntuliaka ime ụlọ ahụ.

N'ọnwa Febrụwarị 2025, Valentine Ozigbo wepụtara ozi na ọ banyela pati All Progressives Congress (APC) ma kwuo na ọ gbaala arụkwaghịm na LP.

Ebe foto si, Valentine Ozigbo/Facebook

Nkọwa foto, N'ọnwa Febụwarị 2025, Valentine Ozigbo wepụtara ozi na ọ banyela pati All Progressives Congress (APC) ma kwuo na ọ gbaala arụkwaghịm na LP.

Valentine Ozigbo kwuru na mkpebi ya ịkpụpụ APC ụlọikpe abụghị maka nrite onwe ya kama na ọ bụ iji hụ na e mere ihe etu ọ kwesịrị ma chọọ mpụ na nrụrụaka obula ọsọ ụkwụ eru ala.

Cheta APC mere ntuliaka ime ụlọ ha ụbọchị Satọde 5 Eprel 2025 iji họpụta onye ga-eji aha pati ha zọọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti.

Ọtụtụ ndị a ma ama na-zọrọ ntuliaka ime ụlọ ahụ e mere n'ogige Prof Dora Akunyili Women Development Centre Awka, Anambra Steeti gụnyere Valentine Chineto Ozigbo, Paul Chukwuma, Ọkammụta Obiora Francis Okonkwo, Johnbosco Obinna Onukwo, Edozie Madu, Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu na Chukwuma Michael Umeoji.

Mana mpụtara ntuliaka ahụ kwuru na ọ bụ Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu ji vootu dị 1,455 merie Valentine Ozigbo onye ritere naanị vootu 67.

PDP ahọpụtala Jude Ezenwafor dịka onye ga-azọrọ ha ọkwa Gọvanọ n'Anambra Steeti

Jude Ezenwafor bụ onye meriri ntuliaka ime ụlọ PDP n'Anambra steeti
Nkọwa foto, Jude Ezenwafor bụ onye meriri ntuliaka ime ụlọ PDP n'Anambra steeti

Jude Ezenwafor abụrụla onye ga-eji aha pati Peoples Democratic Party (PDP) zọọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti dịka o turu ugo na ntuliaka ime ụlo PDP mere ụbọchị Tuzde 8 Eprel iji họpụta onye ga-azọrọ ọkwa Gọvanọ na Nọvemba 8, 2025.

Jude Ezenwafor ji vootu 798 merie na ntuliaka ime ụlọ ahụ e mere n'ogige Dora Akunyili Women Development Centre, Awka.

Ndị delegate dị narị itoolu, iri itoolu na itoolu (999) si na wọọdụ dị iche iche dị na steetị ahụ binyere aka ma họpụta Ezenwafor dịka onye ga-eji aha PDP zọọ ọkwa Gọvanọ steeti ahụ.

Onye bụ Jude Ezenwafor?

Oge e nyefere Jude Ezenwafor asambodo mmeri ya na ntuliaka ime ụlọ ahụ
Nkọwa foto, Oge e nyefere Jude Ezenwafor asambodo mmeri ya na ntuliaka ime ụlọ ahụ

Jude Ezenwafor bụ onye Nnobi dị n'okpuru ọchịchị Idemili Saụt, Anambra steeti.

Ọ bụ onye ji ego achụ ego na-eme ahịa ire ụlọ. O kwere nkwa inweta ezi nchekwa ma wulite ọnọdụ agụmakwụkwọ ma ọ bụrụ na o merie na ntuliaka ọkwa Gọvanọ ahụ.

PDP na-eme ntuliaka ịhọpụta onye ga-azọrọ ha ọkwa Gọvanọ n'Anambra steeti

PDP
Nkọwa foto, PDP n'Anambra steeti

N'Anambra, otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) na-eme ntuliaka ịhọpụta onye ga-eji patị ha zọọ ọkwa Gọvanọ na steeti ahụ.

Ndị ga-ahọpụta onye ga-eji otu patị PDP zọọ ọkwa ahụ anọrụla oche n'ogige Dora Akunyili Women Development Centre bụ ebe ha na-eme ntuliaka ahụ.

Mana n'oge akụkọ a pụtara, onye ntaakụkọ BBC na-ekwu na-amabeghị mmadụ ole so na-ọzo ọkọrọtọ PDP.

PDP
Nkọwa foto, PDP n'Anambra steeti

Ọ sị "ndị ga-atụ vootu anọrụla ala n'oche ma na-eche ka e mee ha nyocha nke a na-akpọ "accreditation".

O tinyekwara na "udo dị n'ogige ebe ahụ ugbua, mana anyị na-aghọta na-amabeghị mmadụ ole na-azọ ọkọrọtọ PDP".

"Anyị hụrụ na e were igbe abụọ a ga-etinye vootu, mana ugbu a e wepụla otu ma hapụ naanị otu igbe nke na-egosi na o wereike ọ bụrụ naanị otu onye na-azọ ọkọrọtọ PDP".

Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuola na a ga-eme ntuliaka Gọvanọ n'Anambra steeti n'ụbọchị Satọde 8, n'ọnwa Nọvemba 2025.

PDP
Nkọwa foto, Ogo e wepụrụ otu igbe vootu n'ọgbakọ PDP n'Anambra

APC ahọpụtala Nicholas Ukachukwu ka ọ zọọrọ ha Gọvanọ Anambra Steeti

Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu

Ebe foto si, Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu/Facebook

Nkọwa foto, Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu

Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu eturula ugo na ntuliaka imeụlọ pati All Progressives Congress.

Na ntuliaka ahụ e mere n'ogige Prof Dora Akunyili Women Development Centre Awka, Anambra Steeti, Nicholas Ukachukwu ji vootu dị 1,455 merie Valentine Ozigbo onye ritere naanị vootu 67.

Johnbosco Onunkwo ritere naanị 26 vootu ebe Edozie Madu bụ naanịvootu 8 ka o ritere.

Onyeisi ntuliaka imeụlọ ahụ ma bụrụkwa Gọvanọ Cross Rivas steeti bụ Bassey Otu, kelere ndị otu pati ahụ, ndị ọrụ nchekwa maka mbọ ha gbara iji hụ na ntuliaka ahụ gara nke ọma ma kpọọ oku ka onye ọbụla kwado Nicholas Ukachukwu iji hụ na APC meriri na ntuliaka Gọvanọ Anambra steeti n'ọnwa Nọvemba, 2025.

N'okwu ekele ya, Ukachukwu kelere Onyeisiala Bola Tinubu na ndị ndu APC maka ntụkwasiobi ha nwere n'ebe ọ nọ ma kwe nkwa ime ha obi aṅụrị ma ọ bụrụ na o merie ntuliaka Gọvanọ Anambra steeti.

APC amalitela ntuliaka maka ịhọpụta onye ga-azọ ọkwa Gọvanọ n'Anambra Steeti

Mgbe e mechara nnyocha ndị delegate ga-atụ vootu

Ebe foto si, ABSTV

Pati All Progressive Congress (APC) emechaala nyocha ndị 'delegate' ga-atụ vootu iji họpụta onye ga-eji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti.

Ha malitere ime nnyocha ndị kamgbe ehihie n'ebe dị iche iche n'obodo Awka tupu ha niile awuchie n'ọgbọ Dora Akunyili Development Centre n'ihe dịka elekere isii nke mgbede iji malite ịtụ vootu.

Ndị ndu pati ahụ n'Anambra Steeti kwuru na nnyocha ahụ gara ọfụma nke gosiri na ha dị njikere irubere ọchịchị onye kwuo uche ya isi.

Ndị 'delegate' kwụụ n'ahịrị

Ebe foto si, ABSTV

Labour Pati họpụtara George Muoghalu ka ọ zọọrọ ha ọkwa Gọvanọ

Muoghalu ji vootu 573 merie Chuma John Nwosu na ntuliaka ime ụlọ ahụ e mere ụbọchị Satọde 5 Eprel n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ Finotel Hotel dị n'Awka isi obodo Anambra steeti.
Nkọwa foto, George Muoghalu ji vootu 573 merie Chuma John Nwosu na ntuliaka ime ụlọ ahụ e mere ụbọchị Satọde 5 Eprel n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ Finotel Hotel dị n'Awka isi obodo Anambra steeti.

George Muoghalu eturulaugo na ntuliaka ime ụlọ Labour Pati ma bụrụ onye ga-eji aha ha zọọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti n'ọnwa Nọvemba 2025.

Muoghalu ji vootu 573 merie Chuma John Nwosu na ntuliaka ime ụlọ ahụ e mere ụbọchị Satọde 5 Eprel n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ Finotel Hotel dị n'Awka isi obodo Anambra steeti.

Cheta na tupu e mee ntuliaka ahụ, George Muoghalu kpọrọ oku ka pati ya họpụta onye ọnụ kara aka iji hụ na ha nwetara mmerie na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra steeti.

A họpụtagharịala Soludo ka onye ga-azọ ọkwa Gọvanọ n'aha pati APGA

Gọvanọ Soludo meriri na-enweghi onye maara ya aka n'ihu

Ebe foto si, ABSTV

Ntuliaka ime ụlọ nke ndị Pati All Progressives Grand Alliance, APGA mere họpụtara Gọvanọ Chukwuma Soludo ka onye ga-eji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa Gọvanọ n'ọnwa Nọvemba 2025.

Ndị delegate puku atọ, otu narị na iri isii na asatọ (3,168) si na wọọdụ niile dị na steetị ahụ kwupụtara na ọ bụ Soludo ka ha chọrọ site n'ịza 'ehh' maọbụ 'mba'.

Ntuliaka nke e ji olu mee gakwara n'ihu gosi na ọ bụ Soludo ka ndị pati APGA họọrọ.

Mgbe ọ na-abata mmeri a, Gọvanọ Soludo kwuru na obi juru ya afọ na nkwado a ndị pati ya nyere ya ma rịọ ka ndị Anambra nye ya otu nkwado ahụ maka ọdịmma nke steeti ha.

Etu pati dị iche iche si mee ntuliaka imeụlọ ha

Njirmara pati APC, PDP APGA na LP

Ebe foto si, PDP/LP/APC/APGA/X

Nkọwa foto, Njirmara pati APC, PDP APGA na LP

Satọde 5 Eprel bụ ụbọchị ikpeazụ ụlọọrụ Independent National Electoral Commission nyere otu pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche ịme ntuliaka ime ụlọ ịhọpụta ndị ga-azọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti nke a ga-eme n'ọnwa Nọvemba 2025.

Akụkọ na-eleba anya etu pati dị iche iche gụnyere All Progressive Congress (APC) All Progressive Grand Alliance (APGA), Peoples Democratic Party (PDP) na Labour Party (LP) si eme ntuliaka ime ụlọ ha.

Ntuziaka INEC nyere pati dị iche iche banyere ntuliaka ime ụlọ

Ebe foto si, INEC/X

Nkọwa foto, Ntuziaka INEC nyere pati dị iche iche banyere ntuliaka ime ụlọ

All Progressive Grand Alliance (APGA)

Mgbe ndị 'delegate' APGA kwụụ n'ahịrị

Ebe foto si, ABSTV

Pati All Progressive Grand Alliance (APGA) amalite ime ntuliaka maka ịhọpụta onye ga-eji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti n'ọnwa Nọvemba 2025.

A na-atụ anya na ndị 'delegate' mmadụ puku atọ na narị abụọ ga-atụ vootu iji họpụta onye ahụ n'ọgbọ Alex Ekwueme dị n'Awka.

A họọrọ ndị a site na wọọdụ narị atọ na iri abụọ na isii niile dị n'Anambra Steeti, ndị e nyochara ma chọpụta na ha tozuruoke ịtụ vootu.

Ndị 'delegate' si Njikoka

Ebe foto si, ABSTV

Kepukepu na-ekwu na APGA ga-ahọpụtala Govanọ Charles Soludo dịka onye ga-eji aha pati zọọ ọkwa Gọvanọ steeti ahụ.

Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị pati ahụ gụnyere ndị ndu donyere Soludo ukwu, kwuo na ha nwere ntụkwasịobi n'ebe ọ nọ, na ha chọrọ ka ọ chịa Anambra steeti ọzọ.

All Progressives Congress (APC)

Foto ndị na-azọ ntuliaka ime ụlọ APC n'Anambra steeti

Ebe foto si, Instagram

Nkọwa foto, Foto ndị na-azọ ntuliaka ime ụlọ APC n'Anambra steeti

Pati All Progressives Congress (APC) họpụtara ụbọchị Satọde 5 Eprel 2025 maka ime ntuliaka ime ụlọ ha iji họpụta onye ga-eji aha pati APC zọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti.

Ọtụtụ ndị a ma ama na-azọ ntuliaka ime ụlọ a ga-eme n'ogige Prof Dora Akunyili Women Development Centre Awka, Anambra Steeti.

Ha gụnyere Valentine Chineto Ozigbo, Paul Chukwuma, Ọkammụta Obiora Francis Okonkwo, Johnbosco Obinna Onukwo, Edozie Madu, Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu na Chukwuma Michael Umeoji.

Ebe a ga-anọ mee ntuliaka ime ụlọ APC
Nkọwa foto, Ebe a ga-anọ mee ntuliaka ime ụlọ APC

Chukwuma Michael Umeoji

Chukwuma Michael Umeoji

Ebe foto si, Chukwuma Michael Umeoji/APC/Facebook

Nkọwa foto, Chukwuma Michael Umeoji
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Chukwuma Michael Umeoji gbara afọ 58 bụ otu n'ime ndị na-azọ ntuliaka ime ụlọ APC maka ịzọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti n'onwa Novemba 2026.

A mụrụ ya n'Ezinifite dị n'okpuru ọchịchị Aguata. Ọ gara ụlọakwụkwọ Ojiako Memorial Nursery and Primary School, Adazi Nnukwu, Nwora Umunna Primary School Onitsha na Government Primary School Ajali ebe o nwetara nzere first school leaving certificate.

Ọ gakwara ụlọakwụkwọ Saint Peter's secondary school, Achina; Boys Secondary School Ezinifite na Uga Boys Secondary ma nweta asambodo Secondary School Certificate.

Ụlọakwụkwọ ndị ọzọ ọ gara gụnyere

mahadum University of Nigeria Nsukka (UNN) nakwa mahadum Nnamdi Azikiwe University, Awka

Ọ bụbu onye nọchitere anya Aguata n'ụlọomeiwu nta Naịjirịa ma bụbụrụ onyeisioche okpuru ọchịchị Aguata.

Umeoji bụ onyeisi ụlọọrụ Bantu Nigeria Limited na Harvestech Nigeria Limited. Ọ malitere ụlọọrụ ndị a n'afọ 2000.

Ọ bụ onye maara ihe ekwe na-akụ banyere ụlọ obibi nakwa mmepe obodo.

Mana ka ọ dị ugbua, akụkọ kwuru na Chukwuma Umeoji wezugara onwe ịzọ ntụliaka ime ụlọ APC.

Akwụkwọ ozi odeakwụkwọ APC bụ Felix Morka wepụtara kọwara na Umeoji wezugara onwe dịka ya na ndị nkwado ya nwere nkwekọrịta.

Valentine Chineto Ozigbo

Valentine Chineto Ozigbo

Ebe foto si, Valentine Chineto Ozigbo/X

Nkọwa foto, Valentine Chineto Ozigbo

Valentine Chineto Ozigbo bu onye Amesi dị n'okpuru ọchịchị Aguata. A mụrụ ya n'afọ 1970. Ọ gbara afọr 54.

Tupu Valentine Ozigbo amalite njem ndọrọndọrọ ọchịchị ya, ọ rụrụ ọrụ ma jide ọkwa dị elu n'ụlọọrụ dị iche iche nke gụnyere ụlọọrụ Transcorp Group, ụlọakụ NAL Merchant Bank, Diamond Bank, Continental Trust Bank, FSB International Bank, Standard Trust Bank, United Bank for Africa na Bank PHB.

Ozigbo ji aha PDP zoo ọkwa Gọvanọ Anambra State n'afọ 2021.

Ntụliaka ahụ bụ Charles Chukwuma Soludo nke pati All Progressive Grand Alliance (APGA) turu ugo na ya.

N'afọ 2022, Ozigbo gbara pati PDP arụkwaghịm ma banye Lebọ Pati (LP).

Na Lebọ Pati (LP), ọ rụrụ ọrụ ma gba gbaa mbọ na achumntavootu vootu pati ahụ na ntuliaka e mere na 2023.

O bụ onye ọtụtụ ndị nkwado ya na-atụ anya na ọ ga-eji aha LP zọọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti mana 'mmadụ na-eche, Chukwu na-eme'.

N'ọnwa Febụwarị 2025, Valentine Ozigbo wepụtara ozi na ọ banyela pati All Progressives Congress (APC) ma kwuo na ọ gbaala arụkwaghịm na LP.

Ozi a tiwara obi ọtụtụ ndị nkwado LP.

Ọ bụ Valentine Chineto Ozigbo ga-eturu na ntuliaka ime ụlọ APC?

Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu

Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu

Ebe foto si, Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu/Instagram

A mụrụ Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu n'okpuru ọchịchị Nnewi Saụt, Anambara steeti. Nicholas Ukachukwu gbara afọr 65.

Ọ gara ụlọakwụkwọ praịmarị na sekondri n'Anambara steeti tupu ọ gaa mahadum na Legọs steeti ebe ọ nwetara nzere Business Administration.

Ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị nọchitereanya Orumba Not/Saụt n'ụlọomeiwu nta Naịjirịa n'afọ 1999,

N'afọ 2003, Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu zọrọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti. Ọ zọrọ ọkwa Sịnetọ Anambra Saụt n'afọ 2011 na 2019.

Johnbosco Obinna Onunkwo

Johnbosco zoro ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti n'afọ 2017 na 2021.

Ebe foto si, Johnbosco Obinna Onunkwo/Facebook

Nkọwa foto, Johnbosco zoro ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti n'afọ 2017 na 2021.

A mụrụ Johnbosco Obinna Onunkwo n'afọ 1975 n'obodo Umuchu dị n'okpuru ọchịchị Aguata

Ọ gara ụlọakwụkwọ praịmarị n'Adazi-Nnukwu na sekondri n ụlọakwụkwọ Saint Theresa's College Nsukka.

Ọ gara mahadum Nnamdi Azikiwe University.

Ọ bụ onye maara ihe ekwe na-aku n'ihe gbasara mmadụ agbidi ma bụrụkwa onye ji ego achụ ego.

Johnbosco zoro ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti n'afọ 2017 na 2021.

Ọ zọkwara ọkwa ịnọchiteanya Aguata n'ụlọomeiwu nta Naijiria n'afọ 2019 na 2023.Johnbosco Obinna Onunkwo

Obiora Okonkwo

Obiora Okonkwo

Ebe foto si, United Nigeria Website

Nkọwa foto, Obiora Okonkwo

Obiora Okonkwo bụ onye Ogidi dị n'okpuru ọchịchị Idemili-Nọt. Ọ gbara afọ 60.

Ọ malitere agụmakwụkwọ ya praịmarị na sekondri ya n'Onitsha.

Ọ gara mahadum Russian Academy of Science, Institute of World Economy and International Relations dị na Moscow.

Ọ gakwara mahadum Russian Peoples Friendship University, Moscow.

O bụ onye ji ego achụ ego.

Obiora Okonkwo bụ onyeisi ụlọọrụ dị iche iche nke Solicom Engineering Limited na Rokada Security Company Limited, ụlọọrụ ụgbọelu United Nigeria nakwa ọtụtụ ụlọọrụ ndị ọzọ.

Labour Party (LP)

Ogige Labour Pati na-eme ntuliaka ime ụlọ ha
Nkọwa foto, Ogige Labour Pati na-eme ntuliaka ime ụlọ ha

Labour Pati na-eme ntuliaka ime ha ụbọchị Satọde 5 Eprel, 2025 n'ogige ụlọ oriri na ọṅụṅụ Finote Hotel dị n'Awka isi obodo Anambra steeti.

Ntuliaka ime ụlọ a bụ iji hopụta onye ga-eji aha Labour Pati zọọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti.

BBC Igbo chọpụtara na ọ bụ naanị mmadụ abụọ na-azọ ntuliaka ahụ. Ha bụ George Muoghalu na Chuma John Nwosu.

George Muoghalu

George Muoghalu
Nkọwa foto, George Muoghalu

BBC chọpụtara na Chuma John Nwosu abịaghị ntuliaka ime ụlọ ahụ. Ọ bụ naanị George Muoghalu bụ onye na-azọ ntuliaka ahụ bịara.

Oge ọ gwara ndị otu pati ya okwu, George Muoghalu kwuru na ọ dị mkpa ka ha họpụta onye ọnụ kara aka ga-enwetara pati ha mmeri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti a ga-eme n'ọnwa Nọvemba 8, 2025.

Ọ kwuru na ọ bụ naanị nke ga-eme ka Anambra Steeti nwee ezi mmepe na agamnihu.