Ndị uweojii na-aga n'ihu na-enyocha Andrew dịka a tọhapụrụ ya n'ụlọmkpọrọ

Ebe foto si, Kirsty Wigglesworth - WPA Pool/Getty Images
Ndị uweojii Thames Valley ga-amaliteghachi ịchọgharị ihe n'ụlọ mbụ nke Andrew Mountbatten-Windsor dị na Berkshire, n'ogige Royal Lodge.
Nke a na-abịa dịka a hụrụ Mountbatten-Windsor n'abalị Tọzde ka ọ na-alọghachi n'ụlọ obibi Sandringham Estate mgbe ejidechara ya maka ebubo ime ihe ọjọọ oge ọ nọ n'ụlọọrụ ọha.
Ndị uwe ojii Thames Valley kwuru na a tọhapụla Andrew dịka a na-aga n'ihu na-enyocha ya.
Eze Charles, onye a na-agwaghị maka njide ahụ tupu oge eruo, wepụtara nkwupụta na-ekwu na "iwu ga-ewere ọnọdụ ya".
A ghọtakwara na nwa eze bụ Prince William na nwunye ya bụ Catherine na-akwado okwu Eze Charles ahụ.
Cheta na njide a, nke BBC buru ụzọ kọọ, bịara mgbe ndị uweojii Thames Valley kwuru na ha na-enyocha mkpesa gbasara ebubo nke onye bụbu nwa eze na onye na-emetọ ụmụnwaanyị nwụrụ anwụ bụ Jeffrey Epstein kesara ihe nzuzo.
Chetakwa na Andrew agọnahụla na ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla metụtara Epstein; mana ọ zabeghị ajụjụ BBC maka okwu gbasara ebubo ndị metụtara mwepụta nke ọtụtụ nde faịlụ Epstein na Jenụwarị.
End of Akụkọ ndị ọzọ yiri nke a
A nwuchiela Andrew Mountbatten-Windsor maka ebubo ajọ agwa

Ebe foto si, Getty Images
A nwuchiela Andrew Mountbatten-Windsor maka ebubo ịkpa ajọ agwa n'ọkwa ọrụ ya.
Foto dị iche iche gosiri ka ụgbọala na-abanye n'ọgbara ụlọ obibi Sandringham Estate dị na Norfolk n'ụtụtụ Tọzde.
Ọnọdụ a na-abịa dịka ndị uweojii Thames Valley kwuru na ha na-enyocha mkpesa maka ebubo ikesa ihe nzuzo, nke a sị Jeffrey Epstein nwụrụ anwụ mere.
Andrew, onye gbara afọ iri isii na isii taa, agọọla ugboro ugboro na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla ya mere.




























