Lee Sarah Mullally, nwaanyị mbụ a họpụtara dịka Achbishọpụ Canterbury nke Anglịkan

Ebe foto si, Getty Images
E kwupụtala Dame Sarah Mullally dịka Achbishọpụ Kantaburi, dịka ọ ga-abụ nwaanyị mbụ a na-ahọpụta n'ọkwa ahụ.
Nwaanyị ahụ dị afọ iri isii na atọ bụbu nnukwu nọọsụ n'ụlọọrụ ahụike NHS tupu o chie ụkọchukwu n'afọ 2006. E mechara họpụta ya dịka Bishọpụ nwaanyị mbụ nke Lọndọn n'afọ 2018 - nke bụ ọkwa nke atọ kachasị na 'Church of England'.
O ji okwu mbụ o kwuru n'ụbọchị Fraịde katọọ "mwakpo ọjọọ" e mere n'ụbọchị Tọzde n'ụlọokpukperechi dị na Manchester, ma kwuo na "mkpọrọmasị na ịkpa oke agbụrụ agaghị ekewa anyị".
O ruola otu afọ ụlọụka ahụ na-enwebeghị onye ndu, kemgbe Justin Welby gbara arụkwaghịm maka ebubo ikpuchi njọ.
Ọ rịturu n'ọkwa oge e wepụtachara ozi gbasara onye na-emetọ ụmụaka, ya na ụlọụka ahụ na-emekọrịta ihe. Ozi ahụ chọpụtara na "o nwereike ma kwesị" inye ndị uweojii mkpesa gbasara mmetọ John Smyth na-emetọ ụmụaka ndị nwoke na ụmụokoroọbịa n'afọ 2013.
Achbishọpụ nke York bụ Stephen Cottrell weere ọtụtụ ọrụ Welby na nchereoge, dịka ọ bụkwa otu n'ime ndị nwere ikike ịhọpụta onye ga-anọchi anya ya. A kpọkwaala oku ka ya onwe ya rịtuo n'ihi ụzọ o siri leba anya n'okwu metụtara mmetọ.
Ọ bụ n'afọ 1994 ka e buuru ụzọ chie ụmụnwaanyị ndị ụkọchukwu, ebe a malitere họpụtawa ha n'ọkwa bishọpụ ka afọ iri abụọ gasịrị, n'afọ 2014.
Dịka ọdịnaala siri dị, usoro ịhọpụta achbishọpụ ọhụrụ gụnyere inye Keir Starmer bụ Praịm Minister aha onye a họpụtara, dịka ọ ga-ewere ya nye Eze.

Ebe foto si, Reuters
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Keir anabatala nhọpụta Dame Sarah ma sị: "Ana m agọrọ ya ọfọ ọma niile ma na-atụkwa anya mụ na ya ịrụkọ ọrụ."
Dịka Eze bụ onyeisi ụka Church of England, onye ji ọkwa Achbishọpụ Kantaburi bụ bishọpụ ọkwa ya kachasị ma bụrụkwa nnukwu onyeisi nchụaja nke ụlọụka ahụ nakwa ụka Anglịkan n'ụwa niile.
Eze Charles nke atọ ekeleela Dame Sarah maka ọkwa ọhụrụ ya, "nke bara nnukwu uru na mba UK nakwa n'ebe niile e nwere ụka Anglịkan n'ụwa", ka obieze Buckingham Palace kwuru.
Otu Global Fellowship of Confessing Anglicans bụ nke nọchitere anya ndị na-echekwa njirimara ụka ahụ akatọọla nhọpụta Sarah ma kwuo na ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ga-anabata ya, "ọtụtụ ndị ụka Anglịkan ka kwenyere na Akwụkwọ Nsọ chọrọ naanị ndị ụkọchukwu nwoke".
Ọ gaghị eburu oche maka ọkwa ọhụrụ ya ruo mgbe e mere ntuliaka nnyocha n'ọnwa Jenụwarị, tupu ahazie ofufe idu ya n'iyi ọrụ oge ha gachara kelee Eze.
Oge ọ na-ekwu okwu n'ụlọụka Canterbury Cathedral n'ụbọchị Fraịde, Sarah kwere nkwa izute nsogbu ndị ahụ "na-ebute ihe mgbu na enweghị ntụkwasịobi", ma kwuo na "anyị niile ga-adịrị njikere ikwe ka ihe nwuo n'omume anyị n'agbanyeghị ọrụ anyị na-arụ n'ụlọụka".
Dịka ọ na-ekwu okwu gbasara "ọgbaaghara ọjọọ" a hụrụ site na mwakpo e mere n'ụbọchị Tọzde n'ụlọokpukperechi dị na Manchester, ọ sịrị na "anyị na-ahụta mkpọrọmasị nke ga-ebilite site na nsogbu dị n'ime obodo dị iche iche".
Dịka ọ lụrụ di ma mụta ụmụ abụọ, ọ rụrụ ọrụ ihe karịrị afọ iri atọ na ise n'ụlọọrụ ahụike NHS, ma bụrụkwa nnukwu nọọsụ kachasị nta n'Ịngland n'afọ 1999.
Ọ bụ eziokwu na o wepụtara onwe ya maka ọrụ enyemaka n'ụlọụka n'oge ahụ, ọ bụ naanị afọ ole na ole gara aga ka o kpebiri ichi ụkọchukwu, dịka e mekwara ngwangwa nye ya ọrụ ka o nye aka webata mmegharị n'ụzọ ụlọụka ahụ si eleba anya na mmetọ.
N'afọ 2012, ọ bụụrụ ojide ego ndị kanọn na Salisbury Cathedral tupu ọ bụrụ Bishọp nke Credition na dayọsis Exeter n'afọ 2015.
Dịka Bishọp nke Lọndọn, a hụtara ya dịka onye ji amamihe ya dịka onye nchịkọta na NHS nye aka hazigharịa dayọsis ahụ n'ụzọ ọgbaraọhụrụ.
Oge BBC jụrụ ya gbasara ihe ọ ga-ewebata n'ọkwa ọhụrụ a e nyere ya, ọ sịrị: "Arụọla m ọrụ dịka nọọsụ lekọtara ọtụtụ ụlọọrụ, dịka nnukwu nọọsụ gọọmenti, nakwa dayọsis dị obosara na Lọndọn. N'ihi ya, adịla m njikere maka ụfọdụ ihe ndị a, mana aghọtara m na apụghị m ime ya n'onwe m. Ọ bụ mụ na ndị otu m kwesịrị ime ya."
Dame Sarah kwuru na ya ghọtara na "ịbụ nwaanyị mbụ bụ ihe akụkọ, ma ana m aga n'ụlọakwụkwọ oge ụfọdụ, hụ ka ụmụnwaanyị na-anọ ọdụ nke ọma ma na-ege ntị, ma ha achọghị ịbụ Bishọpụ nke Lọndọn maọbụ Achbishọpụ Kantaburi, mana ọ na-eme ka ha chee na o kwere omume ka ha mezuo ọhụ ha".
Ikekwe ihe dị oke mkpa ọ ga-elebara anya bụ ịchọpụta ụzọ a ga-esi gaa n'ihu buo agha megide mmetọ ma lebara ndị o metụrtara anya nke ọma.
Ọnụọgụ ndị na-aga ụka agbatuola ala, ọ bụ eziokwu na Lọndọn ebelatala ya bụ ọnọdụ.
Ihe ndị ọ kachasị kwuo okwu maka ha bụ i nyere mmadụ aka gbuo ya - ọ na-agba ụkwụ megide nke a dịka onye bunyere ya oche.
Oge a nabatara iwu ahụ n'ụlọomeiwu Commons, ọ kọwara ya dịka "nke e kweghị omume na nke a dịghị mma ma bụrụkwa nke na-eyi egwu megide ndị ụwa na-atụ n'ọnụ n'obodo anyị".
Otu n'ime ọrụ ndị ọ rụrụ dịka bishọpụ bụ ịnọ n'isi otu na-agba mbọ ịchịkọta mkpebi ụlọụka ahụ banyere ma ha ga-agọzi alụmalụ ndị bụ otu ụdị ekere.
Ọ kọwara mkpebi imecha nye ndị ụkọchukwu ka ha gọzie alụmalụ ndị bụ otu ụdị ekere dịka "oge olileanya maka ụka".
Rowan Williams bụbu achbishọpụ chịkọtara ọkwa ọhụrụ a e nyere Sarah dịka nke chọrọ "akwụkwọ akụkọ n'otu aka nakwa Akwụkwọ Nsọ n'aka nke ọzọ".
Dk Williams gwara BBC na "ịtu anya ka o kwuo okwu gbasara ihe niile di ezigbo arụ."










