Achịbishọp Canterbury agbaala arụkwaghịm

Achịbishọp nke Canterbury

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Achịbishọp nke Canterbury
    • Onye dere ya, Aleem Maqbool
    • Ndị mere akụkọ a, Religion editor
    • Onye dere ya, Maia Davies
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Achịbishọp nke Canterbury ụka Anglịkan bụ Justin Welby agbaala arụkwaghịm dịka ọtụtụ mmadụ kpọrọ oku ka ọ rituo maka ihe o mere dịka mpụtara nnyocha ebubo ahụ metutara mmegbu na mmetọ ụmụaka ndị nwoke ọnụọgụgụ ha karịrị otu narị gbara n’anwụ.

N’akwụkwọozi arụkwaghịm Welby wepụtara, o kwuru na akwụkwọ nnyocha ahụ gosiri mmegbu na mkpagbu John Smyth mere, nke e zochiri ruo ọtụtụ oge.

Welby gara n’ihu kwuo na oge a gwara ya na a agwala ndị uweojii n’afọ 2013, nkwenye ya na a ga-eji usoro dị mma kpezie okwu ahụ, abụghị ihe kwesiri ka o kwenye na ya.

Ihe mere e ji kpọọ oku ka ọ rituo n’oche

Justin Welby, nyi ugogbeanya ma nwee isi awụ na-ere anya n'onyonyo.

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Justin Welby kwuru na ya ga-etinye anya nke ọma na ndeko mmeto John Smyth n'afọ 2013.

Ndị Bishọp n'ụka Anglịkan akpọọla oku ka Achịbishọp nke Canterbury rituo n’oche ma kọwaa na o kwesighị ịnọ n'oche na-agbanyeghị nyocha e mere maka ya gbasara imeto nwatakiri.

Ọtụtụ ndị mmadụ kpụụ Justin Welby n'ọnụ kemgbe izuụka gara aga maka na o meghi ihe o kwesịrị ime maka ndekọ na mpụtara gbasara ebubo ahụ metutara mmegbu na mmetọ ụmụaka ndị nwoke ọnụọgụgụ ha karịrị otu narị

Mgbe e tinyere anya etu ụlọụka si nyocha ebubo ahụ gbasara mmeto ụmụaka nwoke, a hụrụ na Achịbishọp kwesịrị iwegara ndị gọọmenti maọbụ ndị uweojii okwu ahụ kemgbe o nwetera mpụtara si na nyocha e mere n'afọ 2013.

Bishop Helen-Ann Hartley nke Newcastle bụ onye mbụ gwara Welby rituo n'oche ka o bochara ya ebubo inye ohere ka mmetọ na-aga n'ihu site n'afo 2013. Mana Smyth nwụrụ n'afọ 2018.

Ọ gwara BBC sị "e chere m na ndị mmadụ nwereike na-aju ugbua sị "ụlọụka Anglịkan nke Ịngland a ga-enyenwu anyị ezi nchekwa?' Mana ọsịsa ya bụ na ọ bụghị ugbua."

Bishop Hartley kwuru na Welby iritu n'oche abụghị na nsogbu agwụla mana nke ahụ ga-enyere aka.

Welby kwetere na ya emeghị nke ọma gbasara ime nyocha maka ebubo ahụ ma kwuo na o were oge ọ chọrọ iritu n'oche tupuu ọ gbanwe obi ya.

Ka e mere nyocha n'okwu Smyth, a hụrụ na e kwesiri ikpe ya ikpe tupuu ọnwụọ n'afọ 2018 mana e wegara okwu ya n'ụlọ ndị uweoji n'afọ 2013.

Bishop nke Newcastle, Helen-Ann Hartley

Ebe foto si, Diocese of Newcastle

Nkọwa foto, Bishop nke Newcastle, Helen-Ann Hartley
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị isi ụka na-ebo Archbishop ebubo sị na 'ọ hapụrụ mmetọ a na-aga n'ihu n'afọ ise ahụ'. Ha ebidola ide akwụkwọ ha ji akpọ oku ka ọ rituo n'oche bụ nke mmadụ 7000 binyere aka n'ime ya.

Smyth bụ onye ọkaiwu nwere ihe jikoro ya na ụka England sọ na ndị ama nke ọma metọrọ ọtụ ndị mmadụ rụrụ 130 na mba ụwa ruru atọ kemgbe afọ iri isi.

Na Winchester College ka ọ na-akpụrụ ụmụaka ga n'ụlọ ya ebe ọ na-anọ tie ha ihe.

Ọ megidekwara mmadụ 26 ruo 30 n'UK n'afọ 1970 nakwa n'afọ 1980. Mgbe ọ gara Afrika ka ọ megburu mmadụ ruru 85 ma ọ bụ 100. ndị ahụ niile o megburu dị afọ 13 ma ọ bụ 17".

Ndeko na-ego na n'afọ 2013, ndị isi ụka n'England mara ihe Smith na-eme, ohe ha kwesiri iji nyefee aha ya n'aka ndị uweoji na UK ma ọ bụ na'Uk.

Maka na ụka emeghị ihe kwesiri ime mere na etinyeghị ya n'aka gọọmenti.

Ndi uweojii na Hamspire bidoro ime nyocha gbasara Smith ka Channel 4 mechere onyonyo gosiri ebubo gbasaya n'afọ 2017.

Ka Channel 4 gosichara onyonyo ahụ ka Welby kwuru na "Amaghịm na udiri ajọ ihe dị etua na-eme".

"Ọ bụlụ na m maara, a ka m akwụsị ya, a ka m eme ihe m kwesiri ime, mana enweghị ihe gosiri m na udiri ihe a na-eme ma ncha".

Mana akụkọ na-ekwe na "emeela ihe ekwesiri ime ka ihe ndị ahụ niile ruo ya ntị n'afọ 2013".

Smyth nwụrụ mgbe ọ dị afọ 75 ka ndị uweojii Hampshire na-eme ya nyocha.

Mark Stibbe nwata akwụkwọ Winchester College gwara BBC na Smyth ji awụwọ duru ya gaa n'ụlọ ya nwere tipu ya aju n'anya.

"O du m gaa n'ụlọ ya ebe o na-anọ eti mmadụ ihe. Ị na eti mkpu ebe ahụ mmadụ ama nnụ akwa gị. O bidoro tie m ihe ruo oge m chere na m ga-anwụ".

Ọ kwuru na ya ekweteghi na Archbishop a ma nkwụsịwu Smyth.

Onye ọzọ bụ Andy Morse bụ onye Smyth megburu gwara Telegraph na ya "ekweteghị na Archbishop na-ekwu eziokwu"

"O doro m anya na ọ ga amara ihe niile na-eme".

Ụkọchukwu Richard Coles kwuru na X sị: "onye obula nọ n'ọchịchị mara na mmadụ na-emegbu mmadụ ibe ya ma hara ime ihe obula kwesiri ịpụ n'oche".

Ụkọchukwu ndị Anglican bụ Giles Fraser kwuru na "ndị ụkọchukwu enweghịzị ntukwasi obi ebe Welby nọ".

Fraser bụ Vicar Saint Anne gwara BBC na "Welby kwesiri ịpụ n'oche".

Fraser bụ onye chetere ihe mere ya onwe ya oge ọ dị afọ asaa ma ọ bụ afọ asatọ kwuru na ihe ahụ bụ ihe mgbawa obi.

Mana Praịm Mịnịsta UK bụ Keir Starmer achọghị itinye ọnụ n'okwu ahụ ma sị : "okwu ahụ bụ ihe dịaala ndị ụka, ọ bụghị nke m".

John Smyth bụ ọkaiwu, nọ n'ụlọikpe.
Nkọwa foto, John Smyth, bụ ọkaiwu amaara ka onye kacha emegbu mmadụ nwere ihe jikora ya na Ụka England.

Otu onye Smyth megburu ma burukwa Bishop Guildford bụ Andrew Watson kọwara na "mmegbu ahụ bụ ihe na-afụ oke ụfụ ma na-etiwa obi".

Arụ niile Smyth mere ka e wegara ndị isi ụka n'afọ 1982 mana ha enweghaghị n'ụlọ ndị uweojii.

Mana ndị ụka mere ka ọ gaa na Zimbabwe machaa gaa South Afrịka.

E boro Smyth ebubo igbu nwatakiri dị afọ iri abụọ na isii mana ụlọikpe mechere hara ima ya ikpe.

Mana n'akwụkwọ ozi, Welby yọrọ arịrịọ sị "ka a gbaghara ya maka na mmegbu mmadụ ahụ mere". Ma kwuo na ọ bụ ihe mgbawa obi na ọtụtụ maara maka ya ma hara ime ka ya mara nke pụtara na John Smyth nwere ohere ịga mba ofesi ma ga megbuo ndị mmadụ ma nwụọ tupu akpụpụ ya ụlọikpe".

O kwuru "amaghị na udiri ihe na-eme tupuu oruo afọ 2013".

Matthew Ineson
Nkọwa foto, Matthew Ineson

Ụkọchukwu Matthew Ineson bụ onye ụkọchukwu ọzọ megburu gwara BBC na ya kwetere ka Welby rituo n'oche ma ya ma ndị ahụ niile daramba ichekwa ndị mmadụ bụ ndị e megburu.

"Ọ bụlụ na-erutughị n'oche, imara na ndị isi ụka na-egosi na ha aghọtaghị ihe obula gbasara ahụhụ ndị e megburu tara".

Ọnụ na-ekwuru ndị Archbishop Welby kwuru na ọ ga-amasị Welby na ọ bụrụ na ndị ụkọchukwu ahụ na-eme nyocha ga-akwado mgbanwe ime ka ezi nchekwa dị n'ụlọụka ma kwuo ka ha nabata arịrịọ ọ rọrọ n'ihu igwe mmadụ".