Ụmụnwaanyị St. Pauls Katọlik Amokwe emeela ngagharịiwe megide ogbo ha nke St. Marys maka esemokwu ha na Fada

Ebe foto si, Ikechukwu Kelvin Okorie Ikukufied/Facebook
Ụmụnwaanyị ụlọụka St. Pauls Katọlik dị n'Ibuzor Amokwe Enugwu steeti emeela ngagharịiwe megide ụmụnwaanyị nke St. Marys dị n'Idedu Amokwe maka agwa ha kpasịrị ụkọchukwu bụ Fada Geofrey Oleri.
Nke a na-abịa dịka ndị ụmụnwaanyị St.Marys na ụkọchukwu ha nwere esemokwu n'ụbọchị Fraịde oge ha na-eme nzukọ August meeting.

Ebe foto si, Ikechukwu Kelvin Okorie Ikukufied/Facebook
Ụmụnwaanyị St. Pauls a mere ngagharịiwe n'ụbọchị ụka megide ndị ogbo ha nke St. Marys ma boro akwụkwọ e dere ihe dị iche iche iji gosi nkwado nye ụkọchukwu ha.
Ụfọdụ ihe ndị e dere n'akwụkwọ ha ji gụnyere; " CWO St. Pauls Amokwe kwụ n'azụ ụkọchukwu anyị na mbọ ya iweta udo n'etiti ụmụnwaanyị parish anyị"
Ọzọ kwuru " Enugu Dayọsis biko gwaa ụmụnwaanyị St. Marys ka ha kwee ka udo chịa parish St. Pauls."
Ụmụnwaanyị ndị a kpọrọ oku ka ụka Katọlik Enugwu Dayọsis leba anya ma mee nnyocha banyere nke a.
Dịka ọ dị ugbua, ndịisi ụka Katọlik nke Enugwu ekwubeghi ihe ọbụla banyere nke a, BBC Igbo zigaara ọnụ na-ekwuru ha ozi mana ọ zabeghi.

Ebe foto si, Ikechukwu Kelvin Okorie Ikukufied/Facebook
Lee ihe na-esere Fada na ụmụnwaanyị 'August meeting' n'ụlọụka Katọlik dị n'Enugwu Steeti.

Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia n'ụbọchị Satọde 9 Ọgọst 2025, nke gosiri otu Ụkọchukwu Katọliki a kpọrọ Fada Godfrey Oleri ji iwe na-akụwasị mmanya ụmụnwaanyị ndị ụka ahụ ji na-eme nzukọ 'August meeting' ma chụsasịa ha n'ime ụlọụka.
Akụkọ kwuru na ihe a mere n'ụlọụka Katọlik dị n'obodo Amokwe nke Udi Enugwu Steeti.
Ihe onyonyo ahụ gosikwara ebe Fada ahụ na ụfọdụ ụmụnwoke parish ahụ chọrọ ịlụ ọgụ.
O nweghi onye maara kpọmkwem ihe butere esemokwu nke mere Fada Oleri jiri chụsasịa ụmụnwaanyị ndị a.

Kedụ ihe na-ese okwu?

Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ụlọụka ahụ bụ St. Marys Katọlik dị n'Idedu Amokwe, n'ụbọchị ụka 10 Ọgọst, 2025 ma chọpụ na e ji igodo gbachie ọnụụzọ ya.
Ụlọụka St. Marys ahụ bụ otu alaka a kpọrọ "out station" nke ụlọụka St. Pauls Katọlik dị n'Ibuzor Amokwe.
Ọ chọpụtakwara na ọ bụ Fada Godfrey Oleri na-elekọta ụlọụka abụọ ahụ anya dịka onyeisi nchụaja (Parish Priest).
Dịka nzukọ 'August meeting' ụmụnwaanyị nke afọ 2025 ruru, Fada Oleri gwara ụmụnwaanyị St. Marys Idedu ka ha ghara ime nzụkọ nke ha iche dịka ha si emebu kwa afọ, kama ka ha buru nzụkọ ahụ bịa n'ụlọụka St. Pauls Ibuzor, ka ha na ụmụnwaanyị ndị ọzọ mekọta ya ọnụ.
Mana ụmụnwaanyị ahụ ekweghị ma kwuo na ọ bụ nzụkọ ahụ ka ha ga-eji tụkọọ ego ha ga-eji rụchapụ ụlọ obibi Fada nke ha.
Na ngwa ngwa ha rụchara ya, uka Katọlik Enugwu Dayọsis ga-ezitere ha ụkọchukwu nke ha.
"Fada kpọọrọ anyị ndị uweojii"

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Otu onye nne n'ụlọụka St. Marys bụ Agnes Aneke gwara BBC Igbo na ha nọzị na nzụkọ n'ụbọchị Fraịde 8 Ọgọst mgbe Fada Oleri ji iwe wakpoo ha.
"Anyị na-eme nzụkọ mgbe Fada Oleri ji iwe bata buru okpokoro mmanya anyị kụwasịa, were aṅara anyị wufuo ma jiri ololo meruo ụfọdụ n'ime anyị ahụ.
"Anyị niile malitere ibe akwa ma na-eti mkpu, mana anyị etighi Fada anyị ihe ọbụla. Ọ chụpụrụ anyị n'ezi ma kpọọrọ anyị ndị uweojii.
"Ọ tụrụ anyị n'anya ma gbaa anyị gharịị na Fada anyị nwereike ịkpa ụdịrị agwa a."
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii mechara hapụ ndịisi ụmụnwaanyị ha kpụụrụ dịka ha kirichara ihe onyonyo wee hụụ na ọ bụ Fada ahụ chọrọ ha okwu.
Onyeisi ndị ntoroọbịa n'Idedu bụ Maazị Anthony Aneke kwuru na ọ dịla anya Fada ahụ jiri akpa agwa adịghị mma n'ebe ndị St. Marys Idedu nọọ.
Dika o si kwuo, "ọ na-aka ụka n'ụlọụka ahụ otu mgbe n'ime izuụka atọ. Nke mere na ụfọdụ ndị agadi na ndị ahụ na-adighị anaghị aga ụka etu ha si chọọ."
Ọtụtụ ndị obodo boro ebubo na ọ bụ Fada tiri mmadụ ihe na o nweghi onye metụrụ ya aka.
Ha rịọrọ Bishọp ụka Katọlik nke Enugwu Dayọsiri bụ Callistus Onaga ka o zitere ha ụkọchukwu ga-abụ nke ha ka ụdịrị nsogbu a ghara ịdapụta ọzọ.
BBC Igbo gakwara n'ụlọụka St. Pauls bụ parish Fada Oleri ebe ọ na-aka ụka, mana o kweghị agwa anyị ihe ọbụla. Ọ sịrị na ọ ga-agwa anyi okwu mgbe ya na Bishọp ya mechara nzukọ.








