Anaghị m ahụta onwe dịka onye Naịjirịa ọzọ - Kemi Badenoch

Ebe foto si, Kemi Badenoch/Instagram
Onyendu pati Conservatives na mba UK bụ Kemi Badenoch ekwuola na ya anaghị ahụta onwe ya dịka onye Naịjirịa tinyere na ya agbaweghị akwụkwọ passpọt Naịjirịa ya kemgbe afọ 2000.
Ọ bụ eziokwu na a nne na nna Badenoch mụrụ ya na UK, mana o toro na Naịjirịa nakwa mba Amerịka tupu ọ laghachi mba UK oge ọ gbara afọ 16 maka nsogbu ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ajọ ọnọdụ akụnaụba iji nye ya ohere ịgụcha akwụkwọ ya.
Badenoch kwuru na ndị nna nna ya si Naịjirịa mana ya abụghị onye Naịjirịa.
Cheta na osote onyeisiala bụ Kashim Shettima katọrọ Badenoch ma kwuo na ọ na-emetọ aha Naịjirịa.
Oge ọ gara ihe omume mkparịtaụka a kpọrọ podcast na bekee, Badenoch kwuru na ihe mere ya ji ghara ịgbanwe passpọt ya bụ maka na ya anaghị ahụta onwe ya dịka onye Naịjirịa n'ihi na ọ nọọla na mba UK na ndụ ya niile.
Na ngwụcha afọ 2024, ọtụtụ mmadụ katọrọ Badenoch maka ihe o kwuru banyere ajọ ọnọdụ nchekwa oge ọ na-eto nakwa nsogbu nrụrụaka na-eme na Naịjirịa oge ahụ.

Kemi Badenoch: Onye bụ onyeisi ọhụrụ nke otu Conservatives mba Briten?

Ebe foto si, EPA
Otu pati Conservatives bụ otu n'ime pati ndọrọndọrọ ukwu abụọ e nwere na mba Briten enwetala onyeisi ọhụrụ dịka ha mechara ntuliaka imeụlọ.
Kemi Badenoch bụ onye akpọpụtyara aha ya dịka onye meriri ya bụ ntuliaka e mere dịka o meriri Robert Jenrick onye otu ahụ kwa.
Kemi aha ya n'uju bụ Olukemi Olufunto Adegoke Badeoch ga anara ọkwa ọchịchị n'aka Rishi Sunak bụbu onyeisi otu ahụ ma bụrụkwa Praịm Minista ochie mba ahụ.
Badenoch ga-abụ nwaanyị ojii mbụ ga-anọ na ya bụ ọkwa kemgbe ekewaputara otu pati ahụ.
Ọ ga-abụkwa onyeisi isii otu ndọrọndọrọ ahụ nwerela kemgbe afọ asatọ na ọkara dịka njikọ otu kewara ekewa chere ya aka mgba.
N'ozi nnabata ọkwa ya, o kwuru na oge eruola otu ya ga-eji rụọ ọrụ chere ha nakwa oge mgbanwe.
O kwuru na ọrụ mbụ ya bụ ijide gọọmentị otu Labour ka ha rụọ ọrụ dịka ha si kwesi.
Nke ọzọ bụkwa ịkwado ọchịchị n'afọ ole na ole dị n'ihu ka o kwuru.
O kwuru na ha ga-etinye anya n'ịkpọghachite ndị nkwado ha ma kwuo na iji me nke a "anyị ga-akwụwa aka ọtọ".
"Otu anyị ga-ekwu eziokwu na anyị emehiela ma daa mba n'afọ 14 gara aga anyị nọ n'ọchịchị" ka o kwuru.
Ihe i kwesiri ịma maka Kemi Badenoch

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
A mụrụ Kemi Badenoch n'ọnwa Jenụwarị afọ 1980 na Wimbledon mba Briten ebe nne na nna ya bụ ndị Naịjirịa na-arụ ọrụ dịka Dọkịnta nakwa Ọkankuzi.
Otu n'ime ụmụ atọ, o biri ụfọdụ oge na Legọs nakwa ụfọdụ oge na mba Amerịka ebe nne ya na-akuzi nkuzi.
Ezinaụlọ ha laghachitere mba Briten mgbe ọ dị afọ 16 dịka ihe na-akawanye njọ na Naịjirịa ebe ọ gụrụ akwụkwọ 'A level' ya.
Ọ gụrụ Computer Systems Engineering na Mahadum Sussex nakwa Iwu na Mahadum London.
Ọ banyere n'ụwa ndọrọndọrọ ọchịchị ka ọ dị afọ 25 n'afọ 2005 n'otu Conservative.
N'afọ 2012, ọ nọchitere anya Conservatives na ntuliaka London Assembly ebe o ritere ọkwa onye ise.
N'afọ ahụ kwa, ọ lụrụ Hamish Badenoch bụ onye ọrụ ụlọakụ ma nwee ụmụ abụọ.
N'afọ 2015, a kpọpụtara aha ya n'ime ụlọomeiwu dịka onye ga-anọchi anya ọkwa Victoria Borwick hapụrụ ebe ahụ.
Ọ zọtara oche ahụ n'aha nke ya n'afọ 2016 mgbe e mere ntuliaka nke mere ka ọ bụrụzie onye omeiwu ọfụma.
O so na ndị chọrọ ka mba Briten hapụ EU bụ atụmatụ a kpọrọ 'Brexit' nke pụtarala ihe ugbua.
O so na ndị zọrọ ọkwa Praịm Minista mba Briten n'afọ 2022 nke Rishi Sunak meriri mana ọ ritere ọkwa nke anọ.
Etu ndi otu Conservatives si tụ vootu
Nkwado ntuliaka nke onyeisi otu Conservatives malitere n'ụbọchị 5 nke ọnwa Julai mgbe Rishi Sunak kwuputara na ọ ga-arịtu n'ọkwa dịka emerichara ha na ntuliaka mba Briten.
N'ihi nke a, achụmnta vootu nakwa ọtụtụ vootu nwayọ nwayọ malitere n'ụbọchị 24 nke ọnwa Julaị rue ụbọchị 31 nke ọnwa Ọktoba.
Mkpọpụta e mere gosiri na Kemi Badenoch ji vootu 53,806 merie Robert Jenrick zọrọ ya bụ ọkwa nwetara 41,388.
Mmadụ isii pụtara ịzọ ya bụ ọkwa gụnyere James Cleverly, Kemi Badenoch, Robert Jenrick, Priti Patel, Mel Stride nakwa Tom Tugendhat.
Nke a pụtara na Kemi Badenoch ga-abụ nwaanyị anọ ga-abụ onyeisi otu ahụ dịka o soro nzọmụkwụ Margret Thatcher, Theresa May na Liz Truss nọrọ n'ọkwa naanị abalị iri ise.








