Rishi Sunak agbasaala ozi mbụ ya dịka Praịm Minista Briten

Praịm Minista ọhụrụ nke mba Briten bụ Rishi Sunak agbasaala ozi mbụ dịka o rigooro n’ọkwa ahụ na Tuzde 25 Ọktoba, 2022.
O mere nke a n’obi ọchịchị mba Briten bụ ‘Downing Street’ dị ka o zutechara Eze Charles nke mba Briten mgbe bụ ebe a nọ kwupụta ya dịka praịm minista ọhụrụ.
Otu n’ime ihe Sunak gbakwasịrị ụkwụ n’ọchịchị ya bụ na iweghachite akụnaụba mba Briten bụ nke ọ sị na-adakpọ kamgbe mkpamkpa ọrịa Covid-19.
Ihe ndị ọzọ o kwuru gụnyere;
Ọ sị na ọ gaghị ata Liz Truss ụta maka mbọ ịchọ imezi mba ha kama na e nwere ụfọdụ ụzụ ‘e jegherie’ mana na ọ ga-emezi ihe mebiri emebi.
“A họpụtara m dịka onyendu pati ‘Conservative' nakwa Praịm Minista ka nwee ike mezie obodo, aga m ebido nke a ozugbo.”
“Aga m achịkọta mba anyị ọnụ, ọ bụghị n’egbugbere ọnụ kama site n’ịrụ ọrụ”.
“A na-erite ntụkwasị obi erite, aga m erite ntụkwasị obi unu.”
“Aga m etinye ọganihu mba anyị n’ihu karịa ndọrọ ndọrọ ọchịchị.”
A họpụtala Rishi Sunak dị ka Praịm Minista ọhụrụ nke mba Briten

Ebe foto si, Reuters
Rishi Sunak abụrụla Praịm Minita ọhụrụ nke mba Briten.
Nke a pụtara ihe n'ehihie Tuzde dịka onye ya na ya so azọ ya bụ ọkwa bụ Penny Mordaunt kwuru na ya esoghizi azọ.
Ndị omeiwu nọ na pati 'Conservatives jupụtara n'ọṅụ, ọtụtụ n'ime ha na-akụ aka n'elu oche ha oge Rishi Sunak biliri ikwu okwu iji gosi obi ụtọ ha.
Cheta na Boris Johnson bụbu Praịm Minista Briten, onye a na-eche na o nwere ike ịzọ ya bụ ọkwa ọzọ, kwuru na ya esepụla aka ya.
Nke a ga-eme Sunak Praịm Mịnịsta nke atọ mba Briten na-enwe n'ime izu asaa.

Sunak so na ndị tụnyere vootu ka Briten si n'otu European Union pụọ.
O kwenyere na ọpụpụ a ga-eme Briten "akwụrụla onwe ya, ma mụbanwanye n'akụnaụba".
Sunak kwenyere na "atụmatụ mbịarambịara dị mma ga-enyere mba anyị aka. Mana anyị ga-ahụrịrị na anyị ji okeala anyị - ọpụpụ na mbata - aka."
Kedụ onye bụ Rishi Sunak?

Ebe foto si, HM Treasury
- A mụrụ Rishi Sunak na Southampton dị na mba Briten n'ụbọchị 12 nke ọnwa Mee afọ 1980
- Nne na nna ya si mpaghara East Afrịka ebe ha mere mbịara mbịara gafee mba Briten, mana ha bụ ndị mba India
- Ọ bụ onye okpukperechi Hindu
- Ọ gụrụ akwụkwọ na Winchester Kọleji, ma gaa mahadum Oxford nakwa Stanford
- Ọ lụrụ ojiegoachụego Akshata Murty, ha mụrụ ụmụ abụọ - ụmụnwaanyị
- Ọ bụbu 'Chancellor' (onyeisi ụlọakụ mba Briten) na gọọmentị Boris Johnson ruo mgbe ọ gbara arụkwaghịm na Julaị 2022, maka "amaghị eme Boris"
- Ọ bụ onye omeiwu na-anọchiteanya Richmond (Yorkshire)
- Ọ bụ ya bụ onye kacha eti mkpu maka ịgbatikwu oge ịnọpụ iche mgbe Covid-19 ma na-akwụ ndị ọrụ ụgwọ mgbe ha nọ n'ụlọ
- Ndị uweojii dara ya nha maka ịda iwu nnọpụiche na Downing Street n'afọ 2020
- O so na ndị chọrọ ịhazigharị akụnaụba mba UK
Chete na Liz Truss ka rituru dịka Praịm Minista n'izu gara aga ka ọ rụchara naanị ụbọchị 45.
Truss meriri Sunak izuụka isii gara aga, dịka o nwetara vootu 81,000 ebe Sunak nwetara 60,000.
Mana ugbua o kwuola na ya ga-eji obi ya niile kwadoo ọchịchị Sunak.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Pati ndị ọzọ chọrọ ka e mee ntuliaka nke ọha obodo
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị omeiwu nọ na pati ndị ọzọ na-abụghị 'Conservative' akwadoghi nhọpụta a họpụtara Rishi Sunak dịka Praịm Mịnịsta, kama ha chọrọ ka ahazie ntuliaka ọha obodo.
Onyeisi ndị 'Scottish National Parti' n'ụlọ omeiwu Westminster bụ Ian Blackford, kwuru na pati 'Conservative' enweghịzi nkwado ndị mmadụ na mba Briten iji nọgide n'ọchịchị.
"Anyị agaghị ahapụ ndị 'Tory" ka ha wepụta Praịm Mịnịsta atọ na-emeghị ntuliaka. Ndị mmadụ kwesịrị ikwu uche ha, anyị bụ ndị SNP ga-ahụ na nke a mere."
N'otu aka ahụ, osote onyeisi ndị Pati Labour bụ Angela Rayner kwuru na kedu ka Sunak ga-esi bụrụ Praịm Mịnịsta na-ekwughị ihe ọbụla gbasara ihe ọ ga-eme ma ọ banye n'ọchịchị?
"Ọha obodo kwesịrị ikwu uche ha gbasara ọdịnihu mba Briten, ọ bụ ntuliaka ka ha ga-eji mee nke a."
Ọzọkwa, Ed Davey bụ onyeisi ndị 'Liberal Democrat' kwuru na ndị 'Conservative' etinyela Praịm Mịnịsta ọzọ na-amaghị ihe ọ na-eme, na-enweghị atụmatụ ọbụla oiji mezie ihe mebiri na mba Briten.
"Naanị ụzọ a ga-esi kwụsị ọgbaaghara ndị a bụ ịhazi ntuliaka ọha obodo ugbua," ka Davey kwuru.









