Liz Truss, Praịm Mịnịsta mba Briten agbaala arụkwaghị m

Liz Truss

Ebe foto si, Getty Images

Praịm Mịnịsta ọhụrụ mba United Kingdom bụ Liz Truss, arịtuola n'ọkwa ọchịchị.

Truss nọrọ naanị abalị iri anọ na ise n'ọkwa ọchịchị tupu ọ gbaa arụkwaghịm.

Nke a mere ya Praịm Mịnịsta ọchịchị ya kacha dị nta na UK.

"Achọpụtala m na n'ihi etu ihe si kwụrụ ugbua, agaghị m enwe ike imezu ihe ndị m kwere na nkwa oge a họpụtara m dịka onyeisi otu 'Conservative Pati'," Truss kwuru.

"N'ihi nke a, agwala m 'His Majesty' Eze na aga m aritu dịka onyeisi 'Conservative Pati."

A na-atụ anya na a ga-eme ntuliaka iji họpụta onye ndu ọhụrụ n'ime izuụka na-abịanụ, mana Truss ga-anọgid n'ọkwa ruo mgbe a ga-ahọpụta onye ga-anọchi ya.

Ihe Liz Truss kwuru oge ọ rituru n'ọkwa PM

Liz Truss
Nkọwa foto, "Aga m na-arụ ọrụ dịka Praịm Mịnịsta ruo mgbe a ga-ahọpụta onye ọhụrụ ga-anọchi m." - Liz Truss

Liz Truss mere mgbasaozi n'ụbọchị Tọzde n'ihu ụlọọrụ Praịm Mịnịsta bụ 10 Downing 'Street'.

O kwuru sị: "Abatara m n'ọchịchị n'oge ọnọdụ akụnụba na-ama jijiji na mba ụwa dị icheiche."

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

"Ezinụlọ na ụlọahịa dị icheiche nọ na nchekasị etu ha ga-esi kwụọ ụgwọ dị icheiche ha ji."

"Agha ọjọọ Putin na-aluso Ukraine amajaala ọnọdụ nchekwa nke mpaghara Europe niile."

"Ọnọdụ akụnụba na-anaghị eto eto dọghachiri mba anyị azụ nke ukwuu."

"Pati Conservative họpụtara m dịka onye ndu ka m gbanwee ihe ndị a, anyị gbalịkwara n'ihe gbasara 'Energy', nakwa iwetu 'National Insurance'."

"Anyị malitekwara atụmatụ ibutu ụtụisi ma mee ka ọnọdụ akụnụba gbalie, n'isoro nnwereonwe nke Brexit wetara."

"Mana achọpụtala m na n'ihi etu ihe si kwụrụ ugbua, agaghị m enwe ike imezu ihe ndị m kwere na nkwa oge a họpụtara m dịka onyeisi otu 'Conservative Pati'."

"N'ihi nke a, agwala m 'His Majesty' Eze na aga m aritu dịka onyeisi 'Conservative Pati."

"N'ụtụtụ taa, mụ na onyeisi '1922 committee' bụ Sir Graham Brady nwere mkparịtaụka, ebe anyị nọ kwekọrịta na a ga-enwe ntuliaka iji họpụta onye ndu ọhụrụ n'ime izuụka na-abịanụ."

"Nke a ga-eme ka anyị nọsie ike n'ụzọ iwulite ma kwadosie ọnọdụ akụnụba nakwa nchekwa obodo anyị ike."

"Aga m na-arụ ọrụ dịka Praịm Mịnịsta ruo mgbe a ga-ahọpụta onye ọhụrụ ga-anọchi m."

Etu nsogbu si malite

Liz Truss

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Truss na ndị omeiwu nwere nrụrịtaụka kporo ọkụ n'ụlọ omeiwu n'ụbọchị Wenezde

Nsogbu bidoro oge Truss chụturu Kwasi Kwarteng, bụ Chancellor UK, n'ọkwa ya n'ihi ụfọdụ atụmatụ o tinyere nke mere ka ọnọdụ akụnụba mba ahụ kawanye njọ.

Ka nke a mechara, ụfọdụ ndị omeiwu nọ na pati 'Conservative' gwara Truss ka ọ rituo n'ọkwa Praịm Mịnịsta n'ihi na ndị mmadụ enwekwaghị ntụkwasị obi n'atụmatụ ndị ọ na-ewepụta.

Omeiwu Jill Mortimer so na ndị wepụtara akwụkwọ nkatọ ma kwuo na ya enweghị ntụkwasị obi n'ọchịchị Truss.

N'ụbọchị Wenezde, enwere nrụrịtaụka kporo ọkụ n'ụlọ ọgbakọ ndị omeiwu dịka n'etiti Liz Truss na ndị pati Labour.

Mana Truss kwechiiri na ọ gaghị aritu n'ọkwa. "Abụ m dike ọgụ, abụghị m onye ụjọ ọgụ," Truss kwuru.

Anyị chọrọ ntuliaka ọhụrụ - Labour Pati

Keir Starmer

Sir Keir Starmer bụ onyeisi otu Labour nke ụlọ omeiwu Briten kwuru na ihe ha chọrọ bụ ntuliaka ọhụrụ.

"Ọnyụpa ha (ndị pati Conservative) na-agba kamgbe afọ 12 gara aga apụtala ihe," Starmer kwuru n'ụbọchị Wenezde.

"Ndị mmadụ na-anwụ n'ihi na ụgbọala 'ambulance' enweghị ike iru ebe ha nọ n'oge."

"Nde kwuru nde ndị mmadụ enweghịzi nri oriri maọbụ ekpomọkụ."

"Ọ bụ na ihe ndị a ezubeghị iji mee ka ndị Tory mata na ha ba-ebute mba anyị ụzọ?"

"Ụdị ihe a agaghị na-aga n'ihu. Britain agaghị aga n'ihu ịnabata ọdịda ndị pati Conservatives. Anyị chọrọ ntuliaka ọhụrụ ugbua."