Ihe mbụ m ga-eme dịka Praịm Mịnịsta UK - Liz Truss

Liz Truss, onye ga-ewere ọchịchị dịka Praịm Mịnịsta ọhụrụ nke mba United Kingdom, ekwela nkwa iwetu ọnụ ego ọkụ latrik nakwa nke mmanụ ụgbọala iji belata ihe isi ike ndị mmadụ na-agabiga na mba ahụ ugbua.
Truss kwekwara nkwa iwetulata ụtụ isi ndị mmadụ na-akwụ iji gbochie mba Briten ịbanye n'ọnọdụ ọtanisi.
N'ụbọchị Tọzde, abalị asatọ nke ọnwa Sepụtemba, ka Lisa Truss ga-ekwupụta atụmatụ ọ ga-agbaso n'ọchịchị ya.
A na-atụ anya na Praịm Mịnịsta nke na-apụ apụ bụ Boris Johnson ga-ekwu okwu ikpeazụ ya dịka onyeisi ọchịchị nke UK taa bụ Tuzde.
Nke a mechaa, Ezenwaanyị Elizabeth nke mba England ga-akpọpụtazi Liz Truss dịka Praịm Mịnịsta ọhụrụ.
Ndị ọkachamara na-ekwu na nnukwu ọrụ chere Liz Truss n'ihu dịka Praịm Mịnịsta.
Ọnọdụ akụnụba mba UK na-ama jijiji ugbua dịka ha ka na-achọ inweta onwe ha kamgbe Brexit mechara.
Ọzọkwa bụ na ọnụego ọkụ latrik na-agbali elu nke ukwu n'ọtụtụ mba na mpaghara Yurop ugbua.
Otu ihe kpatara nke a bụ agha dị n'etiti Rọshịa na Yukren. Cheta na ọ bụ Rọshịa na-eresi ọtụtụ mba na Yurop ikuku gaasị nke e ji emepụta ọkụ latrik.
Liz Truss abụrụla onyeisiala mba UK

Ebe foto si, PA Media
Ndị ọchịchị mba Uk akpọpụtala Liz Truss dịka onyeisiala ha.
Truss kelere ndị igwu na ibe ya nakwa ezinaụlọ nandị enyị maka nkwado ha nyere ya.
Ọ sị na ya ga-etinye anya maka ịme ka ọkụ bụrụ anyụanyụ na mba ahụ ma meekwa ka ọnụahịa nkụrụngwa daa pịapịa site na-ịwetu ụtụisi.
Truss ji ọkolọtọ Conservative zọọ ọchịchị ji vootu 57.4% merie Rishi bụ onye nwere bvootu dị 43% .
Ọ jakwara Boris Johnson bụ onye nyefere ya ọchịchị ike maka ịbuse covid-19 agha, ịkwụsị ike n'ọgụ Ukraine nakwa ihe ndị ọzọ.
Truss bụ nwaanyị ike atọ chigoro UK.
Ndị nke ọzọ bụ Magret Tatcher na Theresa May.
Truss ga-agazị dọrọ ike n'aka Ezenwaanyị Elizabeth echi tupu ọmalite ọrụ
Ihe ị kwesịrị ịma maka Liz Truss

Ebe foto si, Reuters
- Ọ bụ ya bụ Odeakwụkwọ mba ofesi ndị Uk na-esoghị gbaa arụkwaghị mgbe ọgbaghara dara n'isi Boris Johnson.
- Ọ bụ ya ka afa ndị ọbaozi ndị Bookies sị na ọ ga-emeri na ntuliaka mba UK taa.
- Ihe o ji amakarị atụ bụ na ya gara ụlọakwụkwọ gọọmentị steeti.
- O sobụ n'otu Lib Dems bụ ndị na-akpọ oku ka emechie ọkwa Ezenwaanyị.
- O so na ndị sị ka Britain ghara ịpụ na UK, mana ugbua ọ sị na ọdị mma ka ha siri pụọ.
Gịnị mere Briten ji gbanwee Praịm Minista taa?

Ebe foto si, PA Media
Mgbe o ji ọkara gaa elekere iri na abụọ BST ka a ga-akpọpụtara onye ga-anọchị anya Boris Johnson n'ogige Queen Elizabeth nke abụọ, akụkọ ụlọomeiwu dị n'akụkụ ogige Graham Brady bụbu onyeisioche kọmitii ndị omeiwu nke Conservative na 1922.
Onyeisi ahụ ga-agwa ọha okwu mgbe a kpọpụtachara ya, mana agaghị ajụ ya ajụjụ.
A gaghị anụ olu onye nke e meriri.
Onye meriri ga-abanye ọrụ ịchọta ndị ga-abụ minista ya, nakwado maka okwu mbụ ọ ga-akwa ọha bụ nke ga-abụ ụbọchị Tuzde.

Ebe foto si, Reuters
Kemgbe izu ole maọle gara ugbua, Liz Truss nọ n'isi atụịmvootu onyeisiala mba UK.
N'ọnwa Ọgustu, YouGov kwuru na Liz Truss ji vootu dị 66% aga Rishi Sunak bụ onye nwere 34%.
Mana a na-eche na ọ bụ ụlọọrụ ndị kalụkalụ bụ ndị nwe ọbaozi ahụ. N'ụtụtụ a ọbaozi Oddschecker agbala afa na Truss nwere ohere ịzọta ọkwa onyeisiala ahụ otu ikpo n'ime ikpo narị (1/100) ebe ohere Sunak dị ikpo iri atọ na atọ n'ime otu (33/1).

Ebe foto si, PA Media
Ndị nkwado sunak na-ekwu na ọ bụ nwajaa ka mmadụ abụọ a ga-eji gaa onwe ha

Ebe foto si, Reuters
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị nkwado Rishi Sunak ekwetala na Sunak agaghị emerị ntuliaka a, mana ha na-ekwu na ihe Liz ga-eji merie "agaghị ebu ibu".
Mana gị ka "ebughị ibu" pụtara?
Boris Jonson ji pasent iri isii na isii na ụma asaa (66.4%) nwete mmerị ya n'afọ 2019. David Cameron ji votu dị pasentị iri isii na asaa na ụma isii ( 67.6%) merie nke ya, ebe Duncan Smith ji vootu pasentị iri isii na ụma asaa merie oge nke ya na 2001.
Nke a pụtara na ọnụọgụ obula ji ntakiri gbadaa 60% bụ ihe ana ekwu maka ya.
Liz Truss kwesiri igosi na ya nwere nkwado ndị otu nakwa dị ọha site n'ọnụọgụ vootu ha.
Ndị ga-eso mee ya bụ ntuliaka bụ ihe ọzọ a ga-etinye anya n'okwu a.
Na 2019, ndị otu Tory pụtara ntuliaka ruru 87.4%.
Umu ntorobia ndị Conservative na-akọwa na onyeghị onye masiri ha n'ime mmadụ abụọ a.
Ihe o jiri dị oke mkpa ịmata mmadụ ole onye meiri ga-eji gaa bụ na otu ọrụ ọzọ chere onye meriri n'ihu bụ ịme udo n'etiti ndị ọchịchị dịka ha gbagoro mgba n'ime onwe ha n'ọnwa olemaọbụ ole gara aga.
Kedụ onye bụ Rishi Sunak?
Rishi Sunak
- Rishi bụ bụ Chancellor na gọọmentị Boris Johnson ruo mgbe ọ gbara arụkwaghị m maka amaghị eme Boris.
- Ọ bụ ya bụ onye kacha eti mkpu maka ịgbatikwu oge ịnọpụiche mgbe Covid 19 ma na-akwụ ndị ọrụ ụgwọ mgbe ha nọ n'ụlọ.
- Ndị uweojii dara ya nha maka ịda iwu nnọpụiche na Downing Street n'afọ 2020.
- Ọji ego achụ ego so ebu agha gbasara aṅụghị mmanya na-aba n'anya bụ nke aha nwunye ya dara ụda nsonso a gbasara akwụghị ụtụisi ya.
- O si na ndị chọrọ ịhazigharị akụnaụba mba Uk.
Ihe ndị chere onyeisiala mba UK ọhụrụ n'ihu

Ebe foto si, Reuters
Otụtụ mmadụ na Westminster na-eche na Liz Truss ga-achịta aja na ntuliaka onyeisiala mba UK a taa.
Oburuladị ndị enyị Rishi Sunka na-ekwu na ọ bụ nwajaa ka ọ ga-eji daa ya bụ ntuliaka.
Ọ bụrụ na akpọpụta aha Truss dịka onyeisiala n'ehihie a, ihe mbụ ga-akpọ ya ihe bụ nsogbu ngwaahịa na-arị elụ ebe niile.
Ọ na-akwado itinye nnukwu ego n'aka ndị ndị mmadụ iji mee ka nsogbu belata.
Nke a gụnyere ịchabi ụtụisi nakwa inyere ezinaụlọ nakwa ụlọahịa ndị mmadụ aka.
Atụkwara anya ka o kwuo maka ihe ọ ga-eme iji mee ka ọkụ bụrụ anyụghị anyụ na UK n'ọdị n'ihu.
Ọ bụrụ na ya na ndị ọmeiwu kpachaa, ọ ga-amalite ịgwa ndị mmadụ okwu ozugbo.
Ihe a na-atụ anya n'aka ya bara ụba dịka ọke ọnụahịa ngwaahịa na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ.
Ndị otu pati Conservative na-echekwa maka ọdị n'ihu ha.
Otu onye otu Tory gwara onye ntaakụkwọ BBC na "ọ bụrụ na anyị mee ka ọkụ bụrụ anyụanyụ, mara na anyị ga-anọ n'ọchịchị, mana ọ bụrụ na ha nweteghị ya, mara na nsogbu dị".
Kedụ ihe meburu anyị jiri rute ebe a?
N'ụbọchị asaa nke ọnwa Julaị ka Boris Johnson sị na ya ga-arịda n'ọkwa dịka onyeisiala mba ahụ.
Nke a bịara dịka ọtụtụ ndị ọrụ ya tinyere akwụkwọ arụkwaghị na gọọmentị maka amaghị eme ya.
Ndị pati ya bụ Tory egbughị oge n'ịkpọ oku ka ndị mmadụ malite ịpụta maka ịzọ ya bụ ọkwa onyeisiala, ozugbo Boris Johnson tinyere akwụkwọ.
Na mbụ, mmadụ assatọ pụtara maka ya bụ ntụlịaka nke mbụ ebe a nọ kụchapụ Chancellor Nadhim Zahawi na onye bụbụ ọdeakwụkwọ ọrụ ahụ ike bụ Jeremy Hunt dịka ha nwetere obere vootu na-erughị iri atọ na patị Tory.
E meela ọtụtụ ntuliaka ndị ọzọ rụọ mere ka ọnụọgụ ndị na-azọ ya bụ ndọrọndọrọ jiri si asatọ gbadata abụọ - Rishi Sunak (nwoke) na Liz Truss (nwaanyị).
Liz meriri penny Mordaunt iji pụta ebe Sunak meriri ọtụtụ ndị pati ha bụ Tory iji pụta.
Ọtụtụ ihe agbanweela kemgbe ọnwa gara aga dịka ọ bụ ndị otu Tory mmadụ 160,000 ka ọ dị n'aka ịtụ vootu ga-ewepụta otu onye n'ime mmadụ abụọ a.
Ọ teela aka ọbaozi bookies gbara afa na ọ bụ Liz truss ga-emeri.









