Ihe anọ mere Boris Johnson ji rituo n'ọkwa Praịm Mịnịsta

"Obi na-agbawam ịhapụ ọrụ m dịka Praịm Mịnịsta" - Boris Johnson
Johnson gwara ndị ntaakụkọ okwu n'ihu ụlọọrụ ya bụ 10 Downing Street, n'ehihie taa bụ tọzde, abalị asaa nke Julaị 2022.
O kwuru na ọ na-ewute ya n'obi "ịhapụ ọrụ a kacha ibe ya mma n'ụwa niile".
"Ịbụ Praim Mịnịsta bụ nnukwu ihe mmụta n'onwe ya - agaala m na mpaghara niile na UK ma hụkwanụ ọtụtụ ndị mmadụ ndị ji obi ha niile agba mbọ iweta mgbanwe," Johnson kwuru.
"Ọ bụ eziokwu na ọ dịka ọchịchịrị ọ gbara ugbua, ọdịnihu anyị mara ga-achake ka ọlaedo."
Ihe anọ mere Boris Johnson ji rituo n'ọkwa

Ebe foto si, Reuters
Mmeri Boris Johnson n'afọ 2019 bụ mmeri kachasị nke pati 'Conservatives' na-enweta kamgbe afọ 1987.
Mana gịnị meziri ndị nkwado ya si gbakụta ya azụ ugbua?
1) Okwu gbasara Chris Pincher

Ebe foto si, PA Media
Chris Pincher bụ onye ji ọkwa osote 'chief whip' na pati ndị 'Conservatives', bụ ọkwa nke Boris Johnson nyere ya n'ọnwa Febrụwarị afọ a.
Mana ọtụtụ na-ekwu na Pincher ekwesịghị ka e nye ya ọkwa ahụ n'ihi na e nweela ọtụtụ mkpesa megide ya.
N'ụbọchị 29 nke ọnwa June, akụkọ pụtara na Pincher gara otu ọgbakọ mkpori ndụ ebe ọ nọ kpaa agwa n'ezighi ezi n'ihi na ọ ṅụfere mmanya oke.
Pincher mechara rịọ mgbaghara ma gbaa arụkwaghị m n'ọrụ ya.
Mana ọtụtụ ndị pati 'Conservatives' kwuru na Johnson nwekwara ntaramahụhụ n'ihi na o nyochaghị mkpesa ndị mbụ e wetaburu gbasara Pincher.
2) Ebubo 'Partygate'

Ebe foto si, SUE GRAY REPORT / GOV.UK
N'ọnwa Eprel afọ a, nnyocha gosiri na ndị na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ Boris Johnson nwere ọtụtụ ọgbakọ mkpori ndụ oge e tinyere iwu nke machiri inwe ọgbakọ ọbụla n'afọ 2020 n'ihi mfesa ọrịa covid19.
Akụkọ pụtara na oge mmadụ niile nọ n'ụlọ iji rube isi n'iwu 'lockdown', Johnson na ndị ọrụ ya nọ na-ekpori ndụ.
Oge akụkọ a pụtara, Boris Johnson kwuru na ha debere iwu covid niile n'ọgbakọ ndị ahụ e nwere n'ụlọọrụ ya, mana onyonyo na foto pụtaranụ gosiri na nke ahụ abụghị eziokwu.
Johnson mechara rịọ mgbaghara.
3) Mgbali elu ụtụ isi na ihe e ji ebi ndụ

Ebe foto si, EPA
Ọnụahịa ngwa nri na ihe ndị ọzọ e ji ebi ndụ ejirila ihe karịrị pasentị itoolu rịa elu n'afọ a bụ 2022.
Otu ihe kpatara nke a bụ agha Ukraine na Russia, nke metụtara ọtụtụ mba n'ụwa.
Mana n'ọnwa Eprel, ọchịchị Boris Johnson buliri ụtụisi.
Ọtụtụ ndị mmadụ hụtara nke a dịka na gọọmentị achọghị ịma na ihe siri ike.
4) Okwu gbasara Owen Paterson

Ebe foto si, House of Commons
N'ọnwa Ọkụtoba 2021, otu kọmiti ndị omeiwu kpebiri na a ga-enye otu onye omeiwu aha ya bụ Owen Paterson ntaramahụhụ maka na ọ dara iwu.
Ha kwuru na Paterson chọrọ iji ụzọ aghụghọ menyere otu ụlọọrụ nke na-akwụ ya ụgwọ.
Mana ndị otu 'Conservative' nke Boris Johnson bụ onyeisi ya, ekweteghị na mkpebi ahụ, kama ha hibere kọmiti ọzọ iji nyochaa etu nnyocha nke mbụ si dị.
Nke a wutere ọtụtụ mmadụ, mana Paterson n'onwe ya mechara tinye akwụkwọ arụkwaghịm.
Ihe atọ Afrịka ga-eji cheta Boris Johnson

Ebe foto si, Rwanda Presidency
Maka ọtụtụ mmadụ n'Afrịka, nritu Boris Johnson dịka Prime Mịnịsta ga-abịara ha dịkaozi ọma, ebe ụfọdụ ga-eji obi abụọ nabata ya.
Lee ihe atọ gbara ọkpụrụkpụ a ga-eji cheta Johnson n'Afrịka.
1) Atumatu ịkpọga ndị na-achọ 'asylum' na mba Rwanda - Boris Johnson kwuru na gọọmentị UK ga-akpọrọ ndị tinyere akwụkwọ 'asylum' na mba ahụ gaa Rwanda.
Ọtụtụ ndị a ma ama nakwa otu dị icheiche katọrọ ya bụ atụmatụ mana Johnson kwechiiri.
2) Mbawanye otu 'Commonwealth - N'ọdị nso a, mba Gabon na Togo sonyeere otu 'Commonwealth', n'agbanyeghị na mba abụọ a na mba UK enwechabughi mmekọrịta.
Ọtụtụ na-ekwu na nke a so n'ihe ọma si n'ọchịchị Boris Johnson pụta.
3) Inye aka iwulite ọnọdụ ọkụ latrik n'Afrịka - N'ọgbakọ 'Commonwealth' e mere n'ọnwa June na mba Rwanda, Boris Johnson kwere nkwa na UK ga-enye afrịka nde £160 maka atụmatụ 'hydropower'.
'Hydropower' bụ ụzọ e si esite n'ike dị na mmiri emepụta ọkụ latrik
Ndị na-akwadobu Boris Johnson sị ya kwakọrọ pụwa, mana ọ agbaala isi akwara

Ebe foto si, Reuters
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Paim Minista mba Briten bụ Boris Johnson na-alụsi ọgụ ike, ma kwechiri ịnọ n'ọkwa na-agbanyeghhị na ọtụtụ ndị ime obi ya etinyela akwụkwọ arụkwaghịm.
Ụbọchị Wenezde, ndị kachasị akwado ya gụnyere Priti Patel (Odeakwụkwọ na-ime ụlọ-home secretary) na Grant Shapps (odeakwụkwọ na-ahụ maka njem) kpọrọ ya oku ka o tinye akwụkwọ arụkwaghịm.
Odeakwụkwọ na-ahụ maka ndị mba Wales bụ Simon Hart bụ onye mịnịsta ikpeazụ tinyere akwụkwọ arụkwaghịm.
Iwe ndị a bụ na Johnson elebanyeghị anya n'ebubo mmetọ a na-ebo onye bubu osote 'chief whip' bụ Chris Pincher anya dịka a tụrụ anya.
N'ụbọchị Tuzde, ọ pụtara ihe na a gwara Johnson maka mkpesa banyere Pincher n'afọ 2019 oge Tamworth b,ụ mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ.
Nke a dị iche na agụgọ nile si na obi gọọmentị dị na No 10 Downing Street na Praim Minista amaghị banyere mkpesa ndị ahụ.
Nke a mere ka ndị imeobi ya mmadụ abụọ: Rishi Sunak na Sajid Javid(odeakwụkwọ ahụike) tinye akwụkwọ arụkwaghịm.
Mana Boris Johnson gbara isi akwara sị, na ọ bụ "nnukwu nkwado ọha mmadụ tunyere" ya vootu ka ya gbadoro ụkwụ na-aga.
Ọ gara n'ihu chụọ otu n'ime ndị na-akatọ ya bụ Michael Gove n'ọrụ nke tụrụ ndị mmadụ n'anya.
Gove, nyeburu ya nkwado n'okwu Brexit maka ọ kwadoghị mbọ mbụ Johnson gbara ịbụụ onye ndu pati Tory kpọburu oku ka Joshnso rituo n'ọkwa Minista ụbọchị ahụ.
O rue na mgbede ya a chụọ ya n'ọrụ .
Nke a na-abịa dịka ihe ruola ndị mịnista 40 na ndị nyemaka ha gbara akwụkwaghị n'otu ụbọchị.
Johnson na-agabiga nnukwu nsogbu kachasị dịka onye ndu dịka o nwere mkpa ịhọ ndị ọzọhụrụ n'ọkwa minista 20 nke enwebeghị ụdị arụkwaghịm a bụ.









