Ndịiche dị n'okpukperechi ọdịnala na ịgwọ ọgwụ 'okeite'

Ebe foto si, Akwa Okuko/Facebook
N'ụbọchị 18 ọnwa Jenụwarị afọ 2025, Gọọmentị Anambra Steeti mere iwu a kpọro 'Homeland and Security law', nke machiri ịgwọ ọgwụ 'okeite' na ịchụ aja ndị dibia na Eze nwaanyị na steeti ahụ.
Iwu ọhụrụ a ga-enyere gọọmentị aka ibuagha megide mpụ, ohi, ịtọrọ mmadụ n'Anambra Steeti.
Kamgbe iwu ahụ pụtara, a nwuchiela ọtụtụ ndị ekperima na-eme mpụ dị iche iche, tinyekwuoro ndị dibịa a ma ama abụọ bụ Akwa Ọkụkọ na Eke Hit, na onye amụma bụ Onye eze Jesus,
E boro ndị a ebubo na ha na-agwọ ọgwụ 'okeite' ma na-achụ aja dị iche iche n'aha ime ka ndị mmadụ ọkachasị ndị ntoroọbịa nwete ego mbute ngwa ngwa.
Nke a ebutela ọtụtụ okwu n'etiti ndị ntoroọbịa na soshal media, ọkachasị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, nke mere e ji na-ajụ ma ọ bụ eziokwu na 'okeite' nwereike ime ka mmadụ bute ego ọsịsọ? Ọzọkwa bụ ihe dị iche n'okpukperechi omenala na ịgwọ ọgwụ 'okeite'.
Kirie ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mmachi gọọmenti Anambra steeti machiri oke ite
Gịnị bụ 'Okeite'?

Ebe foto si, Akwa Okuko/Facebook
Otu dibia n'Eziagu Enugwu, BBC Igbo gbara ajụjụọnụ n'afọ 2022 bụ ọzọ Desmond Meniru kọwaara 'okeite' dịka oke ọgwụ nke e ji ọbara anụmamụ maọbụ nke mmadụ agwọ.
Ọ sị na e ji 'okeite' enweta ihe n'aka chi mana okeite e ji mmadụ agwọ dị oke njọ nke bụ na ndị mmadụ ekwesighị itinye aka n'ụdịrị ya.
Onye ọzọ omenala Igbo doro anya ma bụrụkwa onyeisi otu 'Omenala bụ ụzọ eziokwu na ndụ' bụ Mathias Ezeaku kwuru na kamgbe ndị Igbo malitere ibi ndụ na ha kwenyere na ọ bụ 'aka ajaja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ' nke bụ na ha kwenyere n'ịgba mbọ tupu mmadụ erie nri – na o nweghi arụsị ọbụla na-enye mmadụ ego mbute.
O kwuru na ọ bụ n'oge gbara ọhụrụ a ka ndị 'Nollywood' malitere igosi ejije ebe a na-agwọ ọgwụ ego, nke mere ndị ntoroọbịa ugbua jizi na-etinye aka n'ọgwụ 'okeite' na ha ka ma bute ego ngwa ngwa.
"Ọ bụrụ na okeite na-enye ego, ndị dibia na-agwọ ya kwesịrị ịbụ ide ji ego ugbua ma na-ebinye ndị mmadụ ego".
"Ihe onye ọbụla sị na na ọ na-agwọ 'ọkeite' na-eme bụ ịnakọrọ ndị mmadụ ego n'ụzọ aghụghọ ma bunye ha itiaka e ji uwe uhie kechie."
Ezeaku kwuru na o teela aka ọ malitere ịkpọ oku banyere igwọ ọgwụ okeite ma kwuo na "okeite enweghi ike dị na ya."
O kwuru na ihe e ji maara ndị dibia n'ala Igbo kamgbe gboo bụ ịgwọ ọrịa dị iche iche gụnyere ịgbazi ọkpụkpụ, dibia afọ ọsịsa, dibia na-ahụ maka ịwa ahụ, dịbia afọ ime.
Etu 'okeite' si dị iche n'okpukperechi omenala

Ebe foto si, Akwa Okuko/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Iji ọnatarachi akpọku chineke
Mathias Ezeaku kwuru na okpukperechi omenala Igbo bụ iji ọnatarachi di iche iche ekpere chukwu site n'iji aha ndị nna nna ochie a kpọku ha.
O kwuru na o nweghi onye ọbụla chọpụtara chukwu a, kama na ọ bụ n'aka ndị nna nna ochie ka e si mata chukwu a.
Ọ gara n'ihu kwuo na ụfọdụ ihe ndị ọnatarachi ahụ ndị Igbo ji akpọku chineke gụnyere nzu, ọjị, edo maọbụ oso oji – na ihe ndị a niile na-arụ otu ọrụ na mpaghara Igbo niile.
"Onye ọbụla ji akụrụ ngwa ndị a na-akpọku chukwu ga-abụ onye dosara onwe ya ọcha – na-anaghị eme ihe ọjọọ."
Ikpere arụnsị
Mathias kwuru na ihe ọzọ dị mkpa n'okpukperechi omenala bụ na ndị Igbo na-ekpere arụnsị nkd ndị nna nna ochie dosara n'obodo.
O kwuru na arụnsị ndị a pụtara 'arụ kwụsị' – na ha dịka ndị nchekwa obodo megide mpụ, igbu ọchụ na ihe ọjọọ dị iche iche.
"Ọ bụrụ na ihe mee n'obodo, ọ bụ arụnsị ka a ga-akpọku ka o nweeike chọpụta onye mere arụ ahụ ka e nwee ike taa ya ahụ ahụhụ ruuru ya.
"Arụnsị anaghị ekechi akaraka ndị mmadụ ọkachasị ndị ntoroọbịa n'obodo."
Ịchụ aja
Mathias kwuru na ịchụ aja so n'okpukperechi omenala kama na aja ahụ bụ nke onye ọbụla na-ahụ anya 'maka na ihe agba n'aka a naghị eji enyo ele ya'.
O kwuru na aja a na-achụ n'okpukperechi omenala bụ nke a na-akpọku ikwu na ibe, gbuo anụmanụ, gọọ ọfọ so ya ma kesaa anụmanụ ahụ n'usoro.
Mana aja na-achụ n'okeite' bụ aja nzuzo a na-amaghị ụdịrị anụmanụ e jiri chụọ ya- nke bụ ịghọgbuo mmadụ n'aha inweta ego mbute.










