'Etu ụmụ m ise siri nwụọ ka ha richara nri n'Anambra steeti'
Otu nwoke akọwaala etu ụmụ ya anọ na nwunye ya siri nwụọ na 7th Mile Nkwelle-Ogidi dị n'okpuru ọchịchị Idemili North n'Anambra steeti mgbe ha richara osikapa n'ụbọchị 3 Mee, 2025.
Nwoke ahụ aha ya bụ Arinze Robinson Ahalu mere ka BBC News Igbo mata nke a oge a gbara ya ajụjụ.
Maazị Ahalu kwuru na ụmụ ya richara osikapa nne ha siri n'oge abalị tupu ha ehie ụra mana oge na-adighị anya, otu n'ime ha malitere ịgbọ agbọ ma mechaa nwụọ tupu ha agaa ụlọọgwụ.
Oge ha na-aga ụlọọgwụ, anọ ndi nke ọzọ malitekwara ịgbọ agbọ mana oge nke a nọ na-eme ndị ụlọọgwụ gwara ha kpọrọ ụmụ ahụ gaa ụlọọgwụ ọzọ maka na ihe na-eme gbagwojuru ha anya mana tupu ha eruo, ndị nke ọzọ anwụọ.

N'okwu ya "ụmụaka m ise di afọ 17,15,13,11 na 9 nakwa nwunye m bụ ndị nwụrụ ka ha richara nri nwere nsị".
Ọ na-arịọ ka gọọmenti wuoro ya ụlọ ebe ọga ebi maka na o nweghị ụlọ obibi.
Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ nwanne ya aha ya bụ Kate Valentine Nwafo. Ọ sịrị na ọnwụ ụmụaka ahụ bụ ihe mwute, na ezinaulọ ha na-eru ụjụ.
Ọ gara n'ihu na-arịọ ka gọọmenti gbatara ha ọsọ enyemaka site n'inyere naanị nwa nke dị ndụ aka dịka ọ na-akwado ide ule WAEC.
Ihe ndị uweojii Anambra steeti kwuru

Ebe foto si, Anambra state police
N'izuụka gara aga ka ndị uweojii Anambra steeti kwuru na ha akpachiela ụlọ ahụ ụmụnne ise nọọrọ nwụọ n'oge erughị eru n'ụzọ ụtụtụ 6 Mee 2025 na mpaghara Ogidi dị n'okpuru ọchịchị Idemili North.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga mere ka a mata nke a n'ozi o mere ka o rute BBC News Igbo aka.
O kwuru na ndị ọrụ ha wuchiri ozugbo ha nwetara mkpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ogidi ma bugaa ozu ụmụaka ahụ n'ọbaozu.
N'ozi ahụ Ikenga wepụtara n'oge ahụ, ọ sịrị na nne ụmụaka ahụ nọ n'ọnọdụ gbatagbata n'ụlọọgwụ dịka a na-elebara ya anya.
Ikenga kwuru na dịka ha na-eme nnyocha mbụ, ndị uweojii nwetara ụfọdụ nri ahụ a na-enyo enyo ezinaụlọ ahụ riri ma zigaa ya ebe a ga-enyocha ya nke ọma iji chọpụta ihe butere ọnwụ ahụ.
Ọ gara n'ihu kwee ọhanaeze nkwa na ha ga-eme nnyocha miri emi iji chọpụta ebe mmiri siri banye n'opi ụgbọghọrọ.










