"Ọ bụ mmadụ atọ bu ọgbatumtum gbagbusiri ndị mmadụ n'Umualaoma, Ndi-Ejezie na Ndiakuwata, Imo Steeti"

Ebe foto si, Screenshot
Mkpamkpa kpara n'obodo atọ dị n'Arondizuogu nke okpuruọchịchị Ideato North dị n'Imo Steeti n'abalị Tọzde 24 Julaị, 2025 mgbe ndị ojiegbe wakporo obodo ndị a, gbuo ihe karịrị mmadụ asaa ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.
Obodo ndị mwakpo a mere gụnyere Ndi-Ejezie, Umualaoma na Ndiakuwata dịcha n'Ideato.
Otu onye obodo ahụ bụ Ogbu Chidozie kọọrọ BBC Igbo etu ihe a siri mee. O kwuru na ọ nọghị n'obodo mgbe ihe a mere kama na o si Asaba bata n'isi ụtụtụ a.
O kwuru na ndị kpara arụ a ji ọgbatumtum, yiri uwe dị ka nke ndịagha wụchie n'obodo ha n'ihe dịka mgbe o ji ọkara gafee elekere asatọ nke abalị Tọzde 24 Julaị, 2025, malite ịgba ndị mmadụ egbe, gbachaa egbe ma gbaa ọsọ.
O kwuru na ha rukwara n'obodo ndị ọzọ dị ha n'akụkụ ma malite ịgba ndị mmadụ egbe.
"Ndị a gụnyere otu onye ọgbatumtum bu mmadụ abụọ yi uwe ndịagha, ha si n'obodo Ndi-Ejezie gbara ruo Ndiakuwata ma malite ịgba ndị mmadụ egbe, ha gbara egbe ahụ si ebe ahụ lọghachịte n'obodo Ndi-Ejezie.
"N'obodo m bụ Umualaoma, ha gburu ihe ruru mmadụ itoolu gụnyere nwanne m nwaanyị na di ya.
"Ihe a mere n'ihe dịka mgbe o ji ọkara gafee elekere asatọ nke abalị Tọzde."
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị a abụghị ndị ohi maka na o nweghi ihe ọbụla ha zuru, kama na ọ bụrụ ha hụụ ụlọahịa ọbụla mepere emepe n'oge ahụ, ha akwụsị ọgbatumtum ha ma gbagbuo ndị nọ n'ebe ahụ.
N'ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, a hụrụ ka ozu mmadụ anọ tọgbọ n'ala n'otu ebe n'obodo Ndi-Ejezie.
N'ihe onyonyo ahụ, otu nwoke kwuru na ya na mmadụ anọ ndị a nọ na-azụ epele (draft) mgbe ndị ojiegbe a bịara malite ịgba ha egbe.
Ọ sị na ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ jisiri ike gbanahụ ọnwụ, ebe a gbagburu mmadụ anọ ahụ.
Aka otu IPOB/ESN dị n'ogbugbu ndị a - Ndị uweojii

Ebe foto si, Nigerian Police
Ndị uweojii Imo Steeti site n'ọnụ na-ekwuru ha bụ Henry Okoye wepụtara ozi banyere mwakpo a ma kwuo na ndị ha na-arụ aka mere ya bụ ndị otu Ipob/ESN.
Okoye kwuru na ọ bụ mmadụ asaa nwụrụ na mwakpo ahụ ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ. Ndị uweojii katọrọ mwakpo ahụ ma kwuo na ha amalite ime nnyocha iji chọpụta ma jide ndị kpara arụ a.
Ha rịọrọ ohanaeze ka ha kwadoo ndị uweojii site n'ịgba ama ga-enyere ha aka iji jide ndị kpara arụ a.
Dịka ọ dị ugbua, ndị ọrụ nchekwa ewerela ọnọdụ n'obodo ndị a, iji hụụ na udo weere ọnọdụ.
Ọnọdụ nchekwa na mpaghara Arondizuogu dị n'Ideato Imo Steeti malitere ịkawanye njọ kamgbe ihe dịka afọ 2021.
E nweela ọtụtụ akụkọ ntọrị, ogbugbu ndị mmadụ na mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii na mpaghara dị iche iche n'okpuruọchịchị Ideato.
Ogbugbu ndị mmadụ n'obodo Umualaoma, Ndi-Ejezie na Ndiakuwata bụ nke kachasị mee na nso nso a.









