Etu 'unknown gunmen' siri gbuo nwoke lọtara ịgba nkwụ nwaanyị n'Arondizuogu

Ifechukwu Ekemezie na Ifeoma bụ nwaanyị ọ na-akwado ịlụ

Ebe foto si, Ifechukwu Ekemezie/Facebook

Nkọwa foto, Ekemezie na ọdịnobi ya na-akwado ịgba nkwụ n'abalị 18 nke ọnwa Jenụwarị

Ndị omekome egbuola ụmụnwoke abụọ nke otu n'ime ha bịara ime ịgba nkwụ ya n'obodo Arondizuogu dị n'okpuru ọchịchị Ideato Nọt nke Imo Steeti n'abalị Tuzde.

Nwoke a na nwunye hiwere agbamakwụkwọ ha n'ụbọchị 18 nke ọnwa Jenụwarị a .

ụgbọala agbara ọkụ

Ebe foto si, Screengrab

Akụkọ na-ekwu na ha jiri keke eme njem dịka ha achọghị ka ahụta ha kama ha mechara zute ndị ojiegbe a.

Ihe onye Arondizuogu gwara BBC Igbo maka ihe mere

Otu onye na-achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC Igbo na mkpamkpa bidoro ihe dịka otu afọ gara aga.

O kwuru sị, "A na-atọrọ ndị mmadụ n'Arondizuogu ọkachasị n'ebe a na-akpọ Nkwọachi, Ekpeọra, Obinetiti na ụzọ Okigwe".

Onye a kwuru na ihe dịka afọ gara aga na ndi ntoroọbịa gara sụọ ọhịa ebe a sị na ndị a sị apụta ma were gwongworo butuo aja nọ ebe ahụ.

Kama onye a kwuru na ndị a mechara wepụta ụzọ ọzọ ha ji awakpo ndị mmadụ.

O kwuru sị, " Ha chọpụtara ụzọ ọzọ ha ji awakpo ndị mmadụ ya mere ha hụ ụgbọala ọbụla mara mma dịka Hilux maọbụ Range Rover, ha ga-ejide onye ahụ tọrọ ya, onye ahụ gbaa ọsọ ha ga-agba onye ahụ egbe. ụfọdụ mgbe ha nwereike kpọrọ onye ahụ ma gbaakwaa ụgbọala ya ọkụ".

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

O kwuru na tupu ọ dị njọ etua, na ndị ojiegbe a ụfọdụ mgbe na-apụta n'ehihe agwa ndị mmadụ sị ha agbala ọsọ na ọ bụ ndị nwere ego ka ha na-achọ.

O kwuru sị, " mgbe ihe a na-eme, enweghị ndị uweojii maọbụ ndị agha na-abịa oge a".

Kedụ maka nwa ntoroọbịa a na nwunye ya?

Onye a gwara anyị na nwa okorọọbịa na nwa agbọghọ ọ chọrọ ịlụ lọtara maka gbamakwụkwọ ha nke ha hiwere n'ụbochị 18 nke ọnwa Jenụwarị a.

Onye a kwuru sị, " Dịka ha lọtara n'abalị, ọ kpọrọ nwanna ya na-anya keke ka ọ bịa buru ha. Dịka o buru ha ka ndị ojiegbe a wakporo na gbagbuo nwoke a bịara ịgba nkwụ ozugbo ozugbo. Ebe ebu nwanna ya gaa ụlọọgwụ ebe ọ nọrọ nwụọ. ụfọdụ na-ekwu na agbatara nke nwaanyị egbe n'aka kama ezopụrụ ya maka nchekwa ndụ ya".

N'aka nke ọzọ ka onye a gwara BBC Igbo na ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo ma gbaa ụgbọala abụọ ọkụ.

O kwuru sị, " Akụkọ na-ekwu na a na-achụ onye nke bụ Lexus ọsọ tupu ha agbaa ụkwụ ụgbọala ya egbe. Mgbe ụgbọala ya danyere n'ime akwa mmiri ka ndị a tọọrọ ya ma gbaa ụgbọala ya ọkụ".

Ụgbọala ndị a bụ Lexus 350 na ụgbọala Range Rover.

Kedụ ọnọdụ Arondizuogu ugbua?

Ndị Arondizuogu na-akọrọ ndị omekome ọfọ

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Ndị Arondizuogu na-akọrọ ndị omekome ọfọ

Onye a na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọtụtụ ndị mmadụ agbapụla n'obodo Arondizuogu.

Onye a kwuru sị, " mụ onwe m na ọtụtụ ndị mmadụ agbapụla n'Arondizuogu maka mkpamkpa ndị a na-eme. N'oge ekeresimesi, ọtụtụ ndị mmadụ ndị lọtara anaghị eji ụgbọala ha agagharị. ọtụtụ na-ahapụ ụgbọlala ha ma jiri keke na-aga".

BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Imo Steeti maka nke a kama enweteghị ya.

Akụkọ ka na-abịa