Okechukwu Akaneme: Ihe di m gwara m na ndị ọrụ ASWAMA na ndị uweojii mere ya - Ọkammụta Ifeoma Akaneme

Foto Mazị Okechukwu Akaneme na oge ọ nọ n'akwa ọrịa n'ụlọgwụ Memfys dịka a wara ya ahụ iji dozie olu ya gbajiri agbaji

Ebe foto si, Akaneme Family

    • Onye dere ya, Michael Ngene
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Ọnwụ Maazị Okechukwu Akaneme bụbu Onyeisi Onitsha Chamber of Commerce ma bụrụkwa onye ji ego achụ ego a ma ama n'Ọnịcha, Anambra steeti n'ụbọchị Fraịde 11 Julaị, 2025 akpalitela ọtụtụ ndị steeti ahụ dịka ha kwuru na aka gọọmenti Anambra steeti dị n'ọnwụ ya.

BBC Igbo gbara nwunye nwoke ahu bụ Ọkammụta Florence Ifeoma Akaneme ajụjụ ọnụ iji chọpụta nke bụ eziokwu banyere ọnwụ di ya bụ Okechukwu Akaneme.

N'okwu ya 'Di m gwara m na ọ bụ n'ụtụtụ 11 Ọktoba, 2024 ka ndị ọrụ Anambra State Waste Mangement Authority (ASWAMA) na ndị uweojii abụọ bịara n'ụlọ ha dị n'Ọnịcha iji gbaa ya ụgwọ maka ego mkpocha ụlọọrụ ASWAMA".

Ọ gara n'ihu kwuo na di ya gwara ndị ọrụ ASWAMA ahụ na ya akwụọla ụgwọ mkpocha ya ma gosi ha akwụkwọ 'receipt' o jiri kwụọ ụgwọ, mana ha gwara ya na ọ bụghị ụgwọ nke ahụ ka ha na-ekwu maka ya.

Ọkammụta Florence kọwara na ndị ọrụ ahụ gwara di ya na ọ ga-eso ha gaa n'ụlọọrụ ha mana di ya gwara ha na ọ bụghị etu ahụ ka e si eme ihe.

"Di m gwara ha na ha kwesịrị inye ya akwụkwọ iji gosi na ọ dara iwu tupu ya esoro ha gaa n'ụlọorụ ha", ka Ọkammụta Akaneme kwuru.

Maazị Akaneme gwara nwunye ya na otu onye uweojii so ndị ọrụ ASWAMA bịa, machiri ya aka ya abụọ n'azụ nke mere ka ọkpụkpụ olu nakwa ọkpụkpụ azụ ya gbajie.

Ngwa ngwa nke a mere, ndị ọrụ ASWAMA na ndị uweojii ahụ hapụrụ Maazị Akaneme n'ala ma gbapụ ọsọ, ọ bụ oge ahụ ka ndị agbataobi Maazị Akaneme hụrụ ya ka ọ tọgbọrọ n'ala n'ụlọ ya ma bugaa ya n'ụlọọgwụ Holy Rosary Specialist Hospital dị na Waterside Ọnịcha. Ụlọọgwụ ahụ mechara zigaa ya n'ụlọọgwụ Nnamdi Azikiwe University Teaching Hospital (NAUTH) Nnewi maka ezi nlekọta.

Pịa aka soro BBC igbo n WhatsApp
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọkammụta Akaneme kwuru na ọ bụ n'ụlọọgwụ NAUTH ka e mere nnyocha MRI nke chọpụtara na ọkpụkpụ azụ di ya gbajiri agbaji.

Ụlọọgwụ NAUTH zigara ya ụlọọgwụ University of Nigeria Teaching Hospital (UNTH) Enugwu tupu ha ezigaakwa ya n'ụlọọgwụ Memfys Neurosurgery Hospital, Enugwu.

Akụkọ kwuru na oge ihe ndị a niile na-eme, gọọmenti Anambra steeti ekwetaghị na Maazị Okechukwu Akaneme merụrụ ahụ site n'ajọ omume ndị ọrụ ASWAMA na ndị uweojii mesoro ya.

O kwuru na kọmịshọna na-ahụ maka gburugburu na kọmịshọna na-ahụ maka ahụike steeti ahụ mechara bịa leta di ya n'ụlọọgwụ oge akụkọ malitere ifegharị na soshal midia banyere ọnọdụ Okechukwu Akaneme.

Ọkammụta Akaneme kwuru na "Oge gọọmenti bịara hụ di m n'ụloọgwu, ha kwuru na ha ga-akwụ ụgwọ ụlọọgwụ ya niile ruo oge ọ pụtara n'ụlọọgwụ, ha nyere anyị nde naịra iri anọ (N40m)".

"Ọnọdụ di m malitere ịkawanye njọ nke mere ka ụlọọgwụ Memfys Neurosurgery Hospital, Enugwu gwa anyị lawa maka na anyị enweghịzi ike ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ ahụ. Oge nke a mere, edegaara m Gọvanọ Chukwuma Soludo akwụkwọ ma rịọ ya ka ọ gbatara anyị ọsọ enyemaka, mana ruo taa, Gọvanọ Soludo azaghachighị akwụkwọ ozi ahụ n'agbanyeghị na ụlọọrụ ya nwetara akwụkwọ ozi m", ka Ọkammụta Akaneme kwuru.

Gịnị ka ndị uweojii kwuru?

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga na njirimara ndị uweojii.

Ebe foto si, Nigeria Police Force

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na obi di ha mwute maka ọnwụ Maazị Okechukwu Akaneme bụ onye azụmahịa a ma ama n'Ọnịcha e kwuru na ọ nwụrụ site n'ahụ ọ merụrụ.

O kwuru na nnyocha mbụ ha mere chọpụtara na omume ndị ọrụ ha mesoro Maazị Akaneme bụ nke megidere iwu ma kwuo na ugbua Maazị Akaneme nwụrụ, ha amalitela ime nnyocha iji chọpụta nke bụ eziokwu banyere agwa ndị ọrụ ha kpara oge ha na ndị ọrụ ASWAMA gara ịgba nwoke ahụ ụgwọ mkpocha na nzacha o ji gọọmenti.

Tochukwu Ikenga kwuru na ha enyela ngalaba ndị uweojii na-ahụ maka inyocha ndị omekome bụ State Criminal Investigation Department (SCID) iwu ka ha mee ezi nnyocha zuru oke gbasara ihe mere n'ụbọchị ahụ ndị uweojii na ndị ọrụ ASWAMA gara n'ụlọ Maazị Akaneme nakwa ihe ndị ọzọ mere n'ụbọchị ndị na-esote ya.

Kọmishọna ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Ikioye Orutugu kwuru na e nweghị onye uweojii ọbụla karịrị iwu ma mee ka o doo anya na onye uweojii ọbụla a chọpụtara na aka ya dị n'ọnwụ Maazị Akaneme ga-enweta ntaramaahụhụ dịka iwu siri kwuo.

Kedụ ihe gọọmenti Anambra Steeti kwuru maka ọnwụ Maazị Akaneme

Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambra steeti bụ Law Mefor na akwụkwọ ozi gọọmenti wepụtara banyere ego ha nyere ezinaụlọ Maazị Akaneme

Ebe foto si, Anambra State Government/Law Mefor/Facebook

Ọnụ na-ekwuru gọọmenti Anambra steeti bụ Law Mefor gwara BBC na ọ bụ maka na Okechukwu Akaneme nupuru isi n'iwu ụlọikpe mere ndị ọrụ ASWAMA na ndị uweojii jiri gaa n'ụlọ ya ịnwụchị ya.

N'okwu ya "Okechukwu Akaneme ji ụgwọ mkpocha na nzacha, ọ bụ nke a mere ka ụlọọrụ ASWAMA zitere ya ozi gbasara ụgwọ ahụ o ji ma gwa ya kwụọ ya".

"Mana oge ọ na-akwụghị ụgwọ ya, ụlọikpe nyere akwụkwọ iwu ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ụlọikpe mana ọ bịaghị, ọ bụ nke a mere ka ụlọikpe nye iwu ka a nwụchie Okechukwu Akaneme maka inupuisi nye oku ụlọikpe kpọrọ ya", ka Law Mefor kwuru.

Ọ bụ oge ndị ọrụ ASWAMA na ndị uweojii gara ịnwụchi Maazị Okechukwu Akaneme ka e merụrụ ya ahụ mere ka ọkpụkpụ azụ ya gbajie.

Banyere akwụkwọ oku ụlọikpe kpọrọ di ya, Ọkammụta Ifeoma Akaneme kwuru na nke mbụ bụ na di ya bụ onye a ma ama na-anaghị eji ụgwọ ọbụla.

"Di m ejighị ụlọọrụ ASWAMA ụgwọ ọbụla, oge ndị uweojii na ndị ọrụ ASWAMA bịara, di m gwara m na ha egosighị ya akwụkwọ ọbụla ha detaara ya gbasara ụgwọ ha sị o ji maọbụ akwụkwọ ọbụla si n'ụlọikpe".

Akwụkwọ ozi ịgba ụgwọ gọọmenti sị ụlọọrụ ASWAMA degaara Okechukwu Akaneme nakwa akwụkwọ iwu ụlọikpe nyere ka a nwụchie ya maka inupuisi nye oku ụlọikpe kpọrọ ya.

Ebe foto si, Anambra State Government

Nkọwa foto, Akwụkwọ ozi ịgba ụgwọ gọọmenti sị ụlọọrụ ASWAMA degaara Okechukwu Akaneme nakwa akwụkwọ iwu ụlọikpe nyere ka a nwụchie ya maka inupuisi nye oku ụlọikpe kpọrọ ya.

Kedụ ndị bụ ASWAMA?

Ndị ọrụ ASWAMA na-ekpocha okpuruụzọ

Ebe foto si, Anambra State Waste Management Authority/Facebook

Ụlọọrụ Anambra State Waste Management Authority (ASWAMA) bụ ụlọọrụ gọọmenti Anambra Steeti hiwere maka mkpocha na nzacha na steeti ahụ.

  • E hiwere ụlọọrụ Anambra Waste Management Authority (ASWAMA) n'afọ 1991.
  • Ha na-eyi ụwe na-acha oroma oroma na steeti
  • Onye bụ onyeisi ụlọọrụ a ugbua bụ Mike Ozoemena.