Ọtụtụ mmadụ anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ mere na "4-Corner" Enugwu Steeti

Ụgbọala Trailer na Camry ahụ gbara ọkụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ihe mberede okporoụzọ ataala isi mmadụ iri na mpaghara Ozalla/4-Corner dị n'okporoụzọ si Enugwu gawa Pọtakọt dị n'Enugwu steeti ma merụọ mmadụ iri ndị ọzọ ahụ.

Njinji ahụ dị ụzọ abụọ, jiri n'ụbọchị Tọzde 3 Septemba, 2025.

Ndị hụrụ oge ihe mere kwuru na ọ bụ oge o ji ọkara gafee elekere itoolu nke ụtụtụ ka ihe mberede nke mbụ mere.

Maazị Moses bụ onye nwere ogige azụmahịa n'akụkụ ebe ihe mberede ahụ mere, gwara anyị na ọ bụ nnukwu ụgbọala trailer na ụgbọala Toyota Camry kụriri onwe ha ma gbaa ọkụ.

Dịka o siri kwuo, ụgbọala Trailer bu ntụ 'cement' gburu mmadụ ise nọ na Camry ahụ ma gbaa ozu ha ọkụ.

Ụgbọala Trailer ahụ na ọgbaatumtum keke kpọriri

Onye ọrụ Road Safety anyị hụrụ ebe ahụ kwuru na ọ bụ enweghị ndidị na ịgba oke ọsọ kpatara ọdachi ahụ.

O kwuru na ihe ọzọ so kpata ọdachi a bụ maka na ọ bụ naanị otu mpaghara ụzọ awara awara ahụ ka ụgbọala na-esi eme njem ugbua.

Akụkọ kwuru na ihe mberede nke abụọ mere n'okporoụzọ ahụ n'ebe erughị otu kilomita ebe nke mbụ mere.

Nke a mere n'etiti ụgbọala Trailer, ọgbaatumtum keke na ụgbọala mini bọọsụ ma gbuo mmadụ atọ.

E kwuru na ndị merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ ugbua.

Otu nwoke na-azụ ahịa n'akụkụ ebe ihe mberede ndị a mere, kwuru na ọtụtụ ihe mberede na-eme n'okporoụzọ ahụ kemgbe ọ bụ naanị otu mpaghara ụzọ ka ụgbọala si eme njem.

O kwuru na ihe mberede mere n'ụbọchị Tuzde izuụka gara aga gburu mmadụ anọ ma gbaa ha ọkụ.

Ka ọ dị ugbua, a na-arịọ gọọmenti ka ha rụọ mpaghara ụzọ awara awara ahụ iji gbochie ụdịrị ọdachi dị etu a.

Ọgbaatumtum keke na ụgbọala ndị ọzọ ihe mberede okporoụzọ ahụ metụtara.

N'aka nke ọzọ, Kọmịshọna ndị uweojii Enugwu steeti bụ Mamman Bitrus Giwa, tiri ezinaụlọ ndị ihe mberede ahụ metụtara aka n'obi ma nye iwu ka ụlọọrụ State Motor Traffic Department mee nnyocha zuruoke iji chọpụta ihe kpatara ihe mberede ndị ahụ.

Bitrus Giwa kwuru na ọ dị mkpa ka ndị ọkwọụgbọala na ndị na-eme njem rube isi n'iwu okporoụzọ, ọkachasị ugbua ọnwa ekeresimesi na-akpụdobe nso, bụ oge ọtụtụ mmadụ ji eme njem.

Akwụkwọ ozi ndị uweojii wepụtara kwuru na ụgbọala Trailer abụọ ahụ bụ ụlọọrụ Visco Investment Global na ụlọọrụ Global Investment nwe ha.