Lee ọkaiwu nọchitereanya Ozo Ezeani n'ụlọikpe

Cheta na a nwụchiri Ozo Ezeani dịka ọ na-achọ isi okeala Seme bọda gbaga mba Bene Repụblik. Onyeisi ụlọọrụ National Immigration Service (NIS) bụ KN Nandap wepụtara ozi maka nwụchi nwaamadị ụbọchị Tọzde 29 Mee, 2025.
Nkọwa foto, Cheta na a nwụchiri Ozo Ezeani dịka ọ na-achọ isi okeala Seme bọda gbaga mba Bene Repụblik. Onyeisi ụlọọrụ National Immigration Service (NIS) bụ KN Nandap wepụtara ozi maka nwụchi nwaamadị ụbọchị Tọzde 29 Mee, 2025.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

E kwuru na enweghị ọkaiwu ọbụla bịara ịnọchiteanya Obi Levi Obieze e ji Ozo Ezeani mara n'ụlọikpe oge gọọmenti Enugu Steeti kpụpụrụ ya n'ụlọikpe Majie steeti n'ụbọchị Tuzde 6 Ọgọst, 2025.

Akụkọ kwuru na mmadụ abụọ nke ọzọ a kpụpụrụ ya na Ozo Ezeani n'ụlọikpe aha ha bụ Sebastine Emeka Offor na Odimwankpa Ejike nwere ndị ọkaiwu kwuchitere ha n'ụlọikpe mana enweghị ọkaiwu bịara ịnọchiteanya Ozo Ezeani.

Ihe nke a pụtara bụ na Ozo Ezeani enweghị onye ọkaiwu na-anọchite ya ugbua.

Ọ bụ ngalaba ndị uweojii a kpọrọ "Crack Squad" butere Obi Levi Obieze na mmadụ abụọ ndị otu ya gụnyere Sebastine Emeka Offor na Odinwankpa Ejike n'ụlọikpe.

Akụkọ kwuru na a nwụchiri nwaamadị ahụ n'ihi ebubo igbu ma lie ọtụtụ mmadụ n'ụlọ ya dị n'obodo Umuojo, Isiagu Umuba dị n'okpuru ọchịchị Ezeagu n'Enugwu steeti.

Ihe mere mgbe a kpụpụrụ Ozo Ezeani na ndị otu ya n'ụlọikpe dị n'Enugwu Steeti

Ozo Ezeani awụchiela n'ụlọikpe n'Enugwu steeti

Gọọmenti Enugwu steeti akpụpụla Obi Levi Obieze n'Ụlọikpe Majie maka ebubo igbu ọtụtụ mmadụ maka ịgwọ ọgwụ ego.

Nwoke ahụ a maara dịka Ozo Ezeani bụ onye a kpụpụrụ n'ụlọikpe Majie dị n'Enugu North n'ụbọchị Wenezde 6 Ọgọst 2025.

Na nnọkọ ụlọikpe ahụ nke Majie Chukwuani nọ n'isi ya, ọ gụpụtara ebubo asaa a na-ebo nwaamadị ahụ.

Ebubo e boro Ozo Ezeani na ndị otu ya gụnyere

  • Ịkpa nkata tọrọ mmadụ n'ụbọchi 25 April 2025
  • Ịtọrọ nwatakịrị dị afọ iri na atọ
  • Ịtọrọ nwata nwoke na-eto eto aha ya bụ Chimaobi Ezih
  • Ịtọrọ nne nwaanyị aha ya bụ Joy mirabel Udokamma
  • Igbu mmadụ n'ụbọchị 31 Mee n'Umuojo, Umumba Ndịagu dị n'okpuru ọchịchị Ezeagu
  • Igbu nwata nwoke aha ya bụ Chimaobi Ezih
  • Igbu nne nwaanyị aha ya bụ Joy Mirabel Udokamma
Oge Ozo Ezeani na ndị otu ya wụchiri n'ụlọikpe

Majie Chukwuani kọwara na ụdịrị ebubo ndị ahụ abụghị nke Ụlọikpe Majie nwereike ilebara anya, kama na o kwesịrị ịga nỤlọikpe Ukwu.

Ya bụ onye Majie nyeziri iwu ka e buru akwụkwọ ikpe ahụ bugara onye na-ahụ maka ikpe ọhanaeze bụ Director of Public Prosecution (DPP) ka o nyochaa ma bugaa ya n'Ụlọikpe Ukwu.

Ka ọ dị ugbua, a na-atụ anya na ikpe ahụ ga-agawazi n'Ụlọikpe Ukwu, dịka Majie nyere iwu ka a bịaghachi n'ụbọchị 15 maọbụ 20 Ọgọst iji mara ka e siri bugaa akwụkwọ ikpe ahụ.

Majie nyeziri iwu ka a kpụghachi Ozo Ezeani na ndị otu ya n'ụlọnga.