Ọ bụ ahịa ọkịrịka ka m na-azụ, abụghị m onye ọgwụ ego - Ozo Ezeani

Foto Onyeka Nwaobu oge ndị ọrụ Nigeria Immigration Service nwụchiri ya n'okeala Seme Bọda

Ebe foto si, Nigeria Immigration Service

Nkọwa foto, Foto Onyeka Nwaobu oge ndị ọrụ Nigeria Immigration Service nwụchiri ya n'okeala Seme Bọda
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 9

Nwoke ahụ akụkọ kwuru na o gburu ma lie ọtụtụ mmadụ n'ụlọ ya dị n'obodo ya bụ Umuojo, Isiagu Ụmụ ba nke okpuru ọchịchị Ezeagu, Enugwu steeti ekwuola aka ya di ọcha.

Oge ọ na-aza ajụjụ ndị ọrụ Nigeria Immigration Service jụrụ ya oge ha nwuchiri ya n'okeala Seme Bọda, Onyeka Nwaobu e ji Ọzọ Ezeani mara, kwuru na ọ bụ ndị na-agba ya mgba okpuru tinyere ozu ndị ahụ n'ụlọ ya iji gbochie ya ịbụ Igwe obodo ha.

N'okwu ya 'Abụ m onye ji ego achụ ego na-azụ ahịa akwa ọkịrịka na mba Bene Repọblik, abụghị m dibịa, amaghị ihe ọbụla banyere ozu ndị ahụ'.

O kwuru na ndị iro na-agba ya mgba maka na ọ bụ ya kwesịrị ịbụ Eze obodo ha mana ụfọdụ mmadụ achọghị ya. 'Ọ bụ ya mere ha ji eme ihe niile ka ha metọọ aha m', ka ọ kwuru.

Orji Ugochukwu bụ onye ọrụ NIS nwuchiri Onyeka Nwaobu n'okeala Seme Bọda

Ebe foto si, Okeosisi Ugo/Facebook

Nkọwa foto, Orji Ugochukwu bụ onye ọrụ NIS nwuchiri Onyeka Nwaobu n'okeala Seme Bọda

N'aka nke ọzọ, onye ọrụ NIS bụ Orji Ugochukwu ka e kwuru na ọ bụ ya hụrụ nwaamadị ahụ dịka ọ nọ n'ọgbaatumtum n'okeala Seme Bọda na-achọ ịbanye mba Bene Repọblik, ekwuola na Onyeka Nwaobu chọrọ inye ya aka azụ oge ọ nwuchiri.

O kwuru na 'Oge m nwuchiri ya, o kwuru na ọ ga-enye m nde naịra iri (N10m) ka ọ hapụ ya ka ọ gawara onwe ya, ọ gara n'ihu kwuo na ọ ga-enyekwa m ekwentị Iphone ya, mana a gwara m mba ma gaa n'ihu nwuchie ya.

Ka ọ dị ugbua ndị ọrụ Nigeriai Immigration Service (NIS) enyefeela Onyeka Nwaobu n'aka ndị uweojii.

Cheta n'akụkọ a bụ nke fesara na soshal midịa ma mee ka ọtụtụ mmadụ malite ịjụ ajụjụ banyere ajọ agwa nwoke ahụ.

Oge ndị ọrụ NIS nyefere nwaamdị ahụ n'aka ndị uweojii

Ebe foto si, Promise Uzoma Okoro

Nkọwa foto, Oge ndị ọrụ NIS nyefere nwaamdị ahụ n'aka ndị uweojii

Ndị ọrụ Nigeria Immigration Service anwụchiela Dibia Ọzọ Ezeani n'okeala Seme bọda

Foto Onyeka Nwaobu oge ndị ọrụ Nigeria Immigration Service nwụchiri ya n'okeala Seme Bọda

Ebe foto si, Nigeria Immigration Service

Nkọwa foto, Foto Onyeka Nwaobu oge ndị ọrụ Nigeria Immigration Service nwụchiri ya n'okeala Seme Bọda

E jidela Onyeka Nwaobu, dibia ọjọọ ahụ na-egbu mmadụ n'obodo Umumba Ndiagu dịka ọ na-achọ isi okeala Seme bọda gbaga mba Bene Repụblik.

Onyeisi ụlọọrụ National Immigration Service (NIS) bụ KN Nandap wepụtara ozi maka nwụchi nwaamadị ụbọchị Tọzde 29 Mee, 2025.

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ NIS bụ ACI AS Akinlabi kọwara na aka ndị ọrụ ha kpaara nwoke ahụ n'ogige nnyocha "Gbaji checkpoint" nke dị n'okporoụzọ Seme-Badagry bụ ebe ọ chọrọ isi banye mba Bene.

O kwuru na nwụchi a bụ nke mịtara mkpụrụ site n'ọrụ ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwaa ndị ọzọ rụrụ.

Akinlabi kwuru ha hụrụ nwoke ahụ ka ọ nọ n'ọgbaatumtum, 'Ọ bụ foto ya anyị ji ka anyị ji mara na ọ bụ ya, tinyere akara NIN ya', ka Akinlabi gwara ndị ntaakụkọ.

Akinlabi kwuru na ha ga-enyefe ya n'aka ndị uweojii ozigbo ozigbo.

Ụlọọrụ National Immugration Service ji ohere ahụ kwuo na ha kwụrụ chim n'ọrụ ya iji nweta nchekwa okeala Naijiria niile.

Ọzọ Ezeani liri ụmụaka ya abụọ n'ime ụlọ ya - Ndị obodo Ụmụmba Ndiagu

Onyeka Nwaobu e ji Ọzọ Ezeani mara gbapụrụ ọsọ oge nwatakịrị ndị otu ya tọọrọ gbara ama nke mere ka ndị obodo na ndị ọrụ nchekwa neighborhood chọpụta mkpa mkpa ọ na-akpa

Ebe foto si, BBC/Screenshot

Nkọwa foto, Onyeka Nwaobu e ji Ọzọ Ezeani mara gbapụrụ ọsọ oge nwatakịrị ndị otu ya tọọrọ gbara ama nke mere ka ndị obodo na ndị ọrụ nchekwa neighborhood chọpụta mkpa mkpa ọ na-akpa

Ọtụtụ ihe apụtala ihe n'akụkọ dịbịa Onyeka Nwaobu e ji Ozor Ezeani mara akụkọ kwuru na a chọpụtara ozo ọtụtụ mmadụ n'ụlọ ya dị n'obodo ya dị'Umuojo, Isiagu Umumba nke okpuru ọchịchị Ezeagu, Enugwu steeti.

Oge BBC Igbo gara n'obodo ahụ iji chọpụta nke bụ eziokwu banyere akụkọ a fesasịrị na soshal midia, anyị chọpụtara na nwaamadị ahụ bụ Onyeka Nwaobu, gbara ọsọ ngwa ngwa ndị ọrụ nchekwa chọpụtara ajọ mkpa ọ na-akpa n'obodo.

Ụfọdụ ndị anyị gbara ajụjụ ọnụ kwuru ihe dị iche iche banyere nwoke ahụ.

Onyebuchi Nwonye kwuru na ọ bụ ajọ ọgwụ ka Onyeka Nwaobu na-agwọ.
Nkọwa foto, Onyebuchi Nwonye kwuru na ọ bụ ajọ ọgwụ ka Onyeka Nwaobu na-agwọ.

Onye obodo ahụ aha ya bụ Onyebuchi Nwonye kwuru na ọ bụ ajọ ọgwụ ka Onyeka Nwaobu na-agwọ.

O gburu ụmụaka ya abụọ ma lie ha n'ime ụlọ ya.

O kwuru na nwaamadị ahụ chụpụrụ ụmụnne ya n'ala ha ma napụ nwaanyị di ya nwụrụ ala ya. Ọ bụ ebe ahụ ka ọ rụrụ ụlọ ahụ a kụturu.

N'okwu ya 'Ọ bụ ndị ọrụ nchekwa neighborhood watch obodo nụrụ akwa nwatakịrị nwaanyị ahụ ndị ọrụ Onyeka Nwaobu tọọrọ ka o jiri mee ọgwụ.

Oge nke a mere, Onyeka gbapụrụ ọsọ mana ndị ọrụ nchekwa ahụ nwuchiri mmadụ abụọ na-arụrụ ya ọrụ.

Ifeanyi Obu bụ onye ezinaụlọ Onyeka Nwaobu. O kwuru na Onyeka Nwaobu napụrụ ya ala ya n'ike ma rụọ ụlọ na ya.
Nkọwa foto, Ifeanyi Obu bụ onye ezinaụlọ Onyeka Nwaobu. O kwuru na Onyeka Nwaobu napụrụ ya ala ya n'ike ma rụọ ụlọ na ya.

Otu onye ezinaụlọ ya bụ Ifeanyi Obu, kwuru na ọ dị ha ịtụ n'anya mgbe nwanne ha nwoke ahụ si mba Togo bata malite ịrụ ụlọ.

N'okwu ya 'Anyị chere na ọ kpatala ego, nke bụ eziokwu bụ na anyị amaghị na arụsị o bu bata na-eri isi mmadụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ha amaghị na nwanne ha na-egbu mmadụ kama na ihe doro ha anya bụ na ọ na-agba mkpọ n'ala n'ime abalị.

'Ọ bụ ọrụ dibịa ka anyị maara dịka ihe ọ na-eme, anyị amaghị na ọ na-egbu ndị mmadụ', ka Ifeanyi Obu gbakwụnyere.

Ọ gara n'ihu kwuo na nwanne ya nwoke ahụ na-emegbu ndị ezinaụlọ ha. Ọ kọwaara anyị na Onyeka Nwaobu napụrụ ya ala ya n'ike ma malite ịrụ ụlọ na ya.

N'aka nke ọzọ, Ụkọchukwu ụka Anglican n'Umuojo bụ Ikechukwu Chime gwara BBC na nwoke ahụ so na ndị ụmụ ntorobia laghachiri malite ime omenala Igbo ma hapụ ụka mana ugbua, o doola anya na nwaamadị ahụ bụ ọṅụ ọbara mmadụ.

Ụlọ ebe ahụ a hụrụ ozo ndị ahụ Onyeka Nwaobu gburu ma tunye ha n'ime olulo
Nkọwa foto, Ụlọ ebe ahụ a hụrụ ozo ndị ahụ Onyeka Nwaobu gburu ma tunye ha n'ime olulo

Ihe ndị uweojii kwuru

Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na mbọ ha na ndị ọrụ nchekwa neighborhood watch gbara mịtara mkpụrụ dịka ha nwuchiri mmadụ atọ aka ha dị na mkpa mkpa ahụ.

Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe kwupụtara aha mmadụ atọ dịka Uche Kingsley Agumba, gbara afọ 33, Ilo Nweze Onyedikachi gbara afọ 36 na Ejike Odinwankpa gbara afọ 38 ebe dibịa aha ya bụ Onyeka Obu e ji Ezeani maọbụ e dey play e dey show mara, gbara ọsọ.

Ndị uweojii kwuru na ha chọpụtara ozu otu nwoke na nwaanyị na-ere ere n'ime olulu ụlọ ebe dibịa ahụ ji mere ebe ọrụ ya.

Onyeisi ndị uweojii Enugwu steeti bụ Mamman Bitrus Giwa, toro mbọ ndị ọrụ ya na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ gbara iji hụ na a nwuchiri mmadụ atọ ahụ.

Ọ gara n'ihu nye iwu ka a malite ọrụ iji nwuchie onye ahụ gbara ọsọ na ndị ọzọ aka ha dị na ajọ mkpa mkpa ahụ.

"Mụ na nna m gara ịkpata nkụ n'ọhịa mgbe Ichie Million na ndị otu ya tọọrọ m"

Nwata ahụ ichie million na ndị otu ya tọọrọ

Ebe foto si, Screenshot

Obere nwata nwaanyị ahụ dị afọ iri na atọ mere e jiri chọpụta ma nwuchie Ozor Ezeani e ji Ichie Million maara akọwala o siri dabanye n'aka ha.

O kwuru nke a n'ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia dịka ndị obodo ha na-ajụ ya ihe ọ ga-abigara n'aka ndị ntọ ahụ.

O kwuru "Anyị gara n'ọrụ ugbo ịkpata nkụ ha ji eghe garrị, ndị a bịakwutere nna m ma rịọ ya ka o nye ha mma ha ga-eji dozie ọgbatumtum ha.

"Nna ya nyere ha mma ahụ mana ha mechara buru ọgbatumtum ha dosa n'akụkọ ma bịazie tọọrọ ya.

"Kechie m ọnụ na ukwụ ma m duru m gbaa ọsọ.

"Ha gwuru ala tinye n'ime ya ma were ihe mechie ya, ọ bụzi mgbe malitere iti mkpu ka ndị ọrụ nchekwa bịara zọpụta ma nwuchie."

Etu e si nwuchie Ichie Million maka ebubo iji ndị mmadụ agwọ ọgwụego?

Ebe Ozor Ezeani e ji 'Ichie million' maara yi uwe ọcha nọrọ ọdụ n'oche

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Akụkọ kwuru na ọ bụ nwata dị afọ iri na atọ ọ tọọrọ gbara ama mere ka a nwuchie ya 'ichie million'
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị Obodo Umunna Ndiagụ dị n'opkuruọchịchị Ezeagụ Enugwu Steeti kamgbe ụbọchị Mọnde 26 Mee, 2025 jidere otu onye dibia a sị na-egbu ma mmadụ ma were ha gwọọ ọgwụ ego.

A na-akpọ onye dibia a Ozor Ezeani e ji 'ichie million' maara bụ onye na-aghakaarị ego ego aghara aghara mgbe ọbụla a kpọrọ ya mmemme.

Akụkọ kwuru na a nwuchiri nwoke a n'ụbọchị mọnde 26 Meen oge ọ chọrọ igbu nwatakịrị dị afọ afọ iri na atọ ọ tọọrọ.

Ambore Obieze bụ onye Umụmba gwara BBC Igbo na e nwere ọtụtụ olulu o gwuru n'ụlọ ya ebe ọ na-etinye ndị o gburu egbu.

N'ụbọchị Mọnde ka otu nwoke na-agafe n'ime ọhịa o wee nụụ ka nwata na-eti mkpu, o soro olu ya wee hụụ ya n'ime olulu dị n'ụlọ Ezeani na-arụ ụlọ ọhụrụ.

Ha mere ngwa ngwa chọpụta na ụfọdụ ndị nọ n'ime olulu ahụ anwụọla ebe ụfọdụ ka-adị ndụ.

Nke a mere ndị obodo jiri gbakọta aka ọnụ wee nwuchie nwoke a, tie ya ihe, gbaa ya ọtọ ma kpụgharịa ya n'obodo.

N'ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, a hụrụ olulu ahụ na ụfọdụ ndị o liri na ya, nakwa akụnụba nwoke nwee.

Ndị Umumba ji iwe gbaa ụlọ ya niile na ọtụtụ ụgbọala ya ọkụ ma jidekwa ndị nwunye ya anọ, n'ihi na dịka ndị obodo siri kwuo, ha ga-amarịrị ihe ọjọọ a na-eme n'ụlọ ha bi n'ime ya.

Arụ a mere kpọmkwem n'obodo Unojo Umumba Ndi-Agu.

Ndị mmadụ na-akpọ oku ka e nye nwoke ahụ ohere ịkpọpụta aha ndị niile o gburu, gosi ebe o liri ha ma kwuo ndị a ma ama niile o na-agwọrọ ọgwụ.

Gọọmentị Enugwu akụtuola ụlọ 'Ichie million'

Ụlọ ichie million a gbara ọkụ

Gọọmentị Enugwu Steeti akụtuola ụlọ Ozor Ezeani dị n'obodo Umumba Ndiagu bụ ebe a hụrụ ọtụtụ ihe ndị o ji agwọ ọgwụ.

Nke a na-abịa Gọvanọ Peter Mba nyere iwu a dịka akụkọ arụ nwamadị na-akpa rutere gọọmentị ntị.

Ihe onyonyo soshal midia gosiri ka ụgbọala katapila tinyere isi ma na-akutu ụlọ ahụ n'abalị ụbọchị Tuzde 27 Mee, 2025.