Etu e si gbuo otu nwaokoroọbịa n'ihi ebubo na o zuru ohi 'power bank' n'Imo Steeti

Ndị ntoroọbịa e jirila ụtalị pịagbuo otu nwaokoroọbịa n'Owaelu Uratta dị n'okpuruọchịchị Owerri North n'Imo steeti.
Nwokoroọbịa ahụ dị afọ iri abụọ, aha ya bụ Chinonso Amadi ka e ji ụtalị pịagbuo n'ụbọchị Wenezde 21 Mee 2025 oge e bochara ya ebubo izu ohi igwe 'power bank'.
Oge onye ntaakụkọ BBC Igbo garuru n'obodo ahụ, a kọọrọ ya na ndị ntoroọbịa kpọọrọ nwaokoroọbịa ahụ gaa ebe ha kpọrọ 'ogige ntaramaahụhụ' (torture centre) bụ ebe ha nọọrọ tagbuo ya n'ahụhụ.
A sị na Chinonso gwara ha bụ ndị ntoroọbịa na ya eribeghị nri oge ha na-ata ya ahụhụ mana ha egeghị ya ntị.
Ọ bụzi oge ọnwụ na-achọ igbu ya ka ha buuru ya gaa tọgbọ na mbaraezi nna ya ma rie mbọmbọ.
Ka e mesịrị, a chọtara igwe 'power bank' ahụ a sị Chinonso zuuru mana oge ahụ ya bụ nwaokoroọbịa alaala mmụọ.
Ọnọdụ ahụ butere ọgbaaghara n'obodo nke mere e ji mụnye ụfọdụ ụlọ na ụlọahịa ndị mmadụ ọkụ.
Ozi onye ntaakụkọ anyị nwetara bụ na nwaokoroọbịa ahụ bụ nwaafọ Umundula Orji mana ọ bụ n'ibe nne ya bụ Owaelu Uratta ka e gburu ya.
Ka o sinadị ezinaụlọ nwaokorọbịa ahụ enyela mkpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii dị na Toronto ebe anwụchirila ụfọdụ mmadụ a na-enyo enyo na aka ha dị n'ọnwụ ya.
'Ha gburu nwa m n'ihi mkpọrọmaasị' – Nna Chinonso

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nna nwaokoroọbịa e gburu kọọrọ BBC News Igbo etu ọnwụ nwa ya ahụ siri metụta ha n'ebe ọ dị ukwuu.
Maazị Collins Amadi bụ nna Chinonso Amadi kwuru na nwa ya nwoke abụghị onye ohi kama na ndị ntoroọbịa gburu ya n'ihi mkpọrọmaasị.
O boro ebubo na ọ bụ ndị nche Owaelu gburu nwa ya nwoke n'ihi na ya na otu n'ime ha nwere obere nghọtahie ebe ọ na-arụ ọrụ dịka onye enyemaka ndị na-ewu ụlọ.
"Onye nche ahụ gara ịnara 'konja' ebe nwa m na-arụ ọrụ, ya na nwa m enwee esemokwu, onye nche ahụ e buru ya n'obi," ka Maazị Amadi gwara anyị.
Ọ sịrị na ihe gbasara igwe 'power bank' bụ nsogbu dị n'etiti nwa ya nwoke na enyi ya mana onye nche ahụ ji maka nsogbu ya na nwa ya nwere kpụgaa ya n'ọgbakọ obodo.
"Ọ bụrụ ma gi kirie ihe onyonyoo e sere oge ha na-ata nwa m ahụhụ, ị ga-anụ mgbe onye nche ahụ kwuru na o teela o jiri na-ele nwa m anya ọjọọ, na ọ bụ oge ahụ bụ ohere o nwere," ka nna Chinonso kwuru.
O boro ebubo na onye nche ahụ gburu nwa ya aha ya bụ Chiazo bụ onye a ma ama na-egbu mmadụ n'ihi na nwa ya abụghị onye mbụ o gburula.
Maazị Amadi kwuru na ya ga-aga ebe niile kwesịrị ekwesị tinyere ndị na-ahụ maka oke ruuru mmadụ iji hụ na o nwetara ikpe nkwụmọtọ maka ọnwụ nwa ya.
O jikwa ohere ahụ kpọkuo gọọmenti n'ogogo dị iche iche ka ha zọbata ụkwụ n'okwu ahụ ma kpee ikpe ziri ezi.
Ka ọ dị, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye azaghị oku ekwentị ya oge BBC Igbo kpọrọ ya maka okwu a.
Onye Eze obodo ahụ ekweghịkwa agwa onye ntaakụkọ anyị okwu oge ọ gara n'obieze ya gbasara okwu a dịka nwunye Eze sịrị na di ya agaghị enwe ohere gwa mmadụ okwu ruo oge amaghị.









