Nwataakwụkwọ a sị 'landlord' gbara egbe n'ihi bọọlụ emechaala nwụọ n'Imo steeti

Nwataakwụkwọ a sị 'landlord' gbara egbe n'ihi bọọlụ emechaala nwụọ n'Imo steeti

Ebe foto si, BBC, Getty

Nkọwa foto, Okporoụzọ dị n'Owerri/Ụmụakwụkwọ ndị na-egwu egwu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Nwataakwụkwọ Urban Development Secondary School, World Bank dị n'Owere, Imo state a sị otu nwoke gbara egbe anwụọla.

Victor Paul gbara afọ iri na atọ (13) ka a sị otu 'landlord' gbara egbe oge ọ banyere na mbaraezi ya ịtụtụ bọọlụ ya danyere ebe ahụ n'ụbọchị Mọnde 17 Maachị 2025.

Ozi anyị nwetara na-ekwu na nwata ahụ nwụrụ n'ehihie Tọzde 20 Maachị 2025 n'ụlọọgwụ Imo State Specialists Hospital dị n'Umuguma.

E kwuru na ọ bụ Maazị Donald Mbamah dị afọ iri isii na anọ (64) gbara nwataakwụkwọ ahụ egbe oge ọ banyere na mbaraezi ya iwere bọọlụ ya na ndị enyi ya na-agba danyere ebe ahụ.

N'otu ozi ọ wepụtara, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kọwara akụkọ ahụ dịka eziokwu.

Okoye sịrị "anyị enyefeela Barr Donald Mbamah n'aka ngalaba ndị uweojii na-ahụ maka ndị omekome bụ Criminal Investigations Department (CID) maka ịgba ya ajụjụ."

O sịrị na ndị ọrụ ha na-eme nnyocha miri emi gbasara okwu ahụ ma kwuo na ndị uweojii na-agbalị inweta egbe nwoke ahụ gbara ya bụ nwata.

Ọ gara n'ihu kasie ezinaụlọ nwataakwụkwọ ahụ nwụrụ anwụ obi n'aha ndị uweojii Imo state ma kwe nkwa na ha ga-eme ihe niile ha nwere ike ya iji hụ nwata ahụ natara ikpe nkwụmọọtụ.

Etu a sị 'landlord' siri gbaa nwataakwụkwọ egbe n'ihi bọọlụ n'Imo steeti

Etu a sị 'landlord' siri gbaa nwataakwụkwọ egbe n'ihi bọọlụ n'Imo steeti
Nkọwa foto, Nwataakwụkwọ a gbara egbe ebe o dina n'elu akwa n'ụlọọgwụ nakwa okporoụzọ Wetheral dị n'Owere

E nwere ọnọdụ ọgbaaghara na mpaghara World Bank dị n'Owere, isi obodo Imo steeti oge e boro otu nwoke a matara dịka Donald Mbamah ebubo ịgba nwataakwụkwọ egbe.

A sị na nwoke ahụ gbara nwataakwụkwọ dị afọ iri na atọ (13) aha ya bụ Paul Victor egbe maka ịbanye n'ụlọ ya ịgaa buru bọọlụ ya.

Akụkọ anyị nwetara kwuru na njinji ahụ jiri n'ụbọchị Mọnde 17 Maachị 2025.

Dịka ya bụ akụkọ siri kọọ, e mere ngwangwa bugaa nwataakwụkwọ ahụ n'ụlọọgwụ Imo State Specialist Hospital dị n'Umuguma mana ọnọdụ ya dị njọ.

Ihe ndị hụrụ ka o si mee kwuru

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị agbataobi hụrụ ka o si mee kwuru na Mbamah gbara nwata ahụ ya na ụmụakwụkwọ ibe ya so na-agba bọọlụ egbe oge ọ banyere na mbaraezi ya ịgaa buru bọọlụ ha danyere ebe ahụ.

"Aha ụlọakwụkwọ ha bụ Development Secondary School dị na mpaghara World Bank n'Owere. Nwoke ahụ a na-ebo ebubo ịgba nwata ahụ egbe bụ Maazị Donald Mbamah. O nwere ụlọakwụkwọ aha ya bụ Per Excellence Nursery and Primary School," ka onye agbataobi aha ya bụ Justin Madu kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na "nwoke ahụ gbara nwata nwoke ahụ egbe oge ọ banyere na mbaraezi ya ịga buputa bọọlụ ya na ndị enyi ya na-agba".

"E mere ngwangwa bugaa nwata ahụ ụlọọgwụ Imo State Specialists Hospital dị n'Umuguma. Ekpere anyị bụ ka ọ ghara ịnwụ," ka nwoke ahụ kwuru.

Ọ gbakwunyere na ndị uweojii New Owerri Police Division anwụchiela nwoke ahụ.

Onye agbataobi ọzọ sịrị na nwata ahụ abanyeghị n'ụlọ nwoke ahụ a na-enyo enyo kama ọ bụ n'elu mgbidi ka o rigooro na-arịọ nwoke ahụ ka o bunye ya bọọlụ ya.

N'okwu ya, "nwata ahụ abanyeghị na mbaraezi nwoke ahụ kama ọ bụ n'elu mgbidi o jiri gbaa ụlọ ya ogige ka nwata ahụ rigooro na-arịọ ya ka o bunye ya bọọlụ ya".

"Kama ọ ga-ebunye nwata ahụ bọọlụ ya, ọ banyere n'ime ụlọ buputa egbe ma gbaa ya nwataakwụkwọ ahụ."

Onye ndu ndị ntorobịa mpaghara ahụ bụ Kenneth Ozioma kwuru na ya onwe ya nakwa ụfọdụ ndị ntorobịa ọzọ agaala leta nwata ahụ n'ụlọọgwụ ma gaakwa n'ụlọọrụ ndị uweojii New Owerri Police Division.

Ọ sịrị na ya na-agba mbọ iji hụ na e nweghị mbibi iwu na mpaghara ahụ dịka ọ na-anụ ụfọdụ ndị ntorobịa ọkụ n'obi ịkpali ọgbaaghara.

Anyị ga-enyefe okwu ya n'aka ngalaba CID - Ndị uweojii

Oge a kpọtụụrụ ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwuru na ndị uweojii New Owerri anwụchiela nwoke ahụ dị afọ iri isii na anọ (64) aha ya bụ Donald Mbamah.

Okoye kwuru na a ga-enyefe nwoke ahụ n'aka ngalaba ndị uweojii na-ahụ maka ndị omekome bụ Criminal Investigation Department (CID) dị n'Owere maka ime ezigbo nnyocha.

Ọ gbakwunyere na ndị ọrụ ha na-agba mbọ inweta egbe ahụ ya bụ nwoke jiri kpaa arụ ma kwuo na a ga-akpụpụ ya n'ụlọikpe ọ bụrụ ma ha chọpụta na ebubo e boro ya bụ eziokwu.