Ụlọomeiwu Sịnetị Naịjirịa dị ka "otu nzuzo" - Natasha Akpoti-Uduaghan
Ụlọomeiwu Sịnetị Naịjirịa dị ka "otu nzuzo" - Natasha Akpoti-Uduaghan
Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan eboola ebubo na Onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa chọrọ ịwakpo ya n'ụzọ mmetọ mana Onyeisi ụlọmeiwu agọnarịla ebubo a.
Na mkparịtụka Ya na BBC nwere, Sịnetọ Akpoti-Uduaghan bụ otu n'ime ụmụnwaanyị anọ nọ n'ụlọomeiwu Sịnetị nwere mmadụ 109 kọwara ụlọomeiwu a dịka "otu nzuzo" ma kwuo na ndị mmadụ anaghị ekwupụtacha uche n'ihi ụjọ ka a ghara imemina ha.
Sịnetọ Akpoti-Uduaghan sị na ọ bụ dịka o kwupụtachara mwakpo ọ sị na Onyeisi ụlọomeiwu chọrọ ime ya kpatara ha jiri kwụsịtụ ya ọrụ ruo ọnwa isii ma na-apụ ya ụgwọọnwa na ụfọdụ oke ndị ruuru ya dịka Sịnetọ.






