Ụlọikpe enweghị ikike ịṅụ ikpe Sịnetọ Natasha - Ọkaiwu Idahosa

Ọkaiwu na-anochịtaanya Sịnetọ Natasha Akpoti-Udaughan bụ Ehiogie West Idahosa ekwuola na ụlọikpe dị elu n'Abuja enweghị ikike ịnabata ma kpee ikpe Sịnetọ Natasha etu ọ dị ugbua.
Ehiogie West Idahosa sị na okpe ikpe Naịjirịa a na-akpọ "Attorney General" n'olu bekee mere ihe megidere usoro ọrụ ya ma metọọ ikike ọkwa ya nwere.
Nke a bụ ihe Idahosa gwara ụlọikpe mgbe a na-ekpe ikpe Sịnetọ Natasha taa n'ụlọikpe Ọkaikpe Chizoba Orji dị n'Abuja.
Mana ka e mechere, ụlọikpe nyigharịrị ikpe Natasha ka ọ bụrụ n'abalị iri abụọ na asaa n'ọnwa ọktoba 2025.

Ọ bụ n'oge ụlọikpe nyigharịchara ụbọchị ikpe Natasha ka ndị nkwado ya sonyere ya n'igwe gaa ụlọọrụ ya dị na obi Sịneti dịka a gbapere ya.
Cheta na ikpe a na-ekpe Sịnetọ Natasha gbadoro ụkwụ n'ebubo iwu atọ a sị na ọ dara nke gunyere mmetọ aha mmadụ n'ajụjụ ọnụ a gbara ya n'onyonyo.
Ọ bụ n'onyonyo ahụ ka Natasha nọ kwuo sị na onye bụbu Gọvanọ Kogi steeti nakwa Onyeisi ndị Sịnetị na-akpa nkata etu a ga-esi gbuo ya.
A gbapeela ụlọọrụ Sịnetọ Natasha dị n'ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa

Ebe foto si, Senator Natasha/Facebook
Ụlọomeiwu agbapeela ụlọọrụ Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan bụ nke a gbachiri kamgbe akwụsịtụrụ ya ọrụ n'ọnwa isii gara aga.
Onye ji ọkwa osote Sergeant-at-Arms nke ụlọomeiwu bụ Alabi Adedeji mepere ụlọọrụ ahụ n'ụbọchị Tuzde 23 Sepụtemba 2025.
Nke a pụtara na Sịnetọ Natasha na-anọchiteanya mpaghara Kogi Central ga-eso ibe ya bidokwa ọrụ n'ụbọchị 7 Ọktoba, 2025.
Cheta na a kwụsịtrụrụ Sịnetọ Natasha ọrụ ruo ọnwa isii maka ebubo imebi iwu na-achị ụlọomeiwu.
Ụlọikpe eyigharịala ikpe ebubo e boro Sịnetọ Natasha maka ịmetọ aha Godswill Akpabio

Dịka a malitere ikpe Sinetọ Natasha n'ebubo imetọ aha Sịnetọ Godswill Akpabio na Yahaya Bello n'ihu Ọkaikpe Mohammed Umar nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.
Ọkaịwu Natasha bụ Ehiogie West Idahosa (SAN) welitere mkpesa ụfọdụ n'ụlọikpe nke gụnyere ikike ụlọikpe a nwere n'ilebanya n'okwu ahụ.
Idahosa kwuru na ụlọọrụ ọkaiwu ukwu nke Naịjiria (Attorney General of the federation) enweghị ikike imalite ikpe Natasha nke mere na ụlọikpe ekwesighị ịnụ ikpe ahụ.
O kwuru na onye okaịwụ gọọmentị enyebeghị ha nkwupụta niile nke ndị ga-agba akaebe n'ikpe a ga-eme.
Mana onye ọkaiwu gọọmentị bụ David Kaswe si na ha enwetebeghị usoro e ji eme ikpe a site n'ụlọọrụ okaiwu ukwu gọọmentị Naịjiria.
Nke a mere ka Ọkaikpe Mohammed Umar jiri yigharịa ikpe ahụ ga n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Ọktoba, 2025.
E boro Sịnetọ Natasha ebubo imetọ aha Godswill Akpabio na Yahaya Bello

Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja ga-amalite ikpe Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan ikpe maka ebubo ịmetọ aha Gọọmentị Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde 22 Sepụtemba, 2025.
Sịnetọ Natasha ga-azara ọnụ ya n'ihu Ọkaikpe Mohammed Umar n'ọnụ ebubu isii gbakwasịrị ụkwụ na mmetọ aha na iji ịntanetị emegbu mmadụ (cyberbullying) nke Gọọmentị Etiti Naịjirịa gbara ya.

Ha kwuru na o kwuru ụfọdụ okwu ndị dị aṅaa iji metọọ aha Sịnetọ Godswill Akpabio bụ onyeisi ụlọomeiwu nke Naịjirịa na onye bụbu gọvanọ Kogi Steeti bụ Yahaya Bello.
N'akwụkwọ ebubo ahụ, a sị na Natasha kwuru "Akpobio gwara Yahaya Bello...ka ọ hụụ na ogbugbu m agaghị eme n'Abuja, ka ọ bụrụ na Kogi Steeti, ka ọ dị ka ọ bụ ndị obodo gburu m."
Ụlọikpe gwara Natasha na Akpabio ka ha kwụsị ịgwa ndị ntaakụkọ okwu

Ebe foto si, Godswill Obot Akpabio/Facebook, Natasha Akpoti-Uduaghan/Instagram
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọkaikpe Binta Nyako nke Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja egbochiela mmadụ niile a kpọrọ aha n'akwụkwọ mkpesa ahụ Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan tinyere n'ụlọikpe megide onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bụ Sịnetọ Godswill Akpabio nakwa mmadụ atọ ndị ọzọ ịgwa ndị ntaakụkọ okwu gbasara ọrụ a kwụsịtụrụ ya.
Nyako nyere iwu ahụ n'ụbọchị Fraịde 4 Eprel 2025 n'isochi mkpesa sitere n'aka Ọkaiwu na-anọchiteanya Akpabio bụ Kehinde Ogunwumiju.
Kehinde Ogunwumiju nyere mkpesa n'ụlọikpe kwuo na Natasha Akpoti-Uduaghan na-agagharị n'ụlọmgbasaozi tivii dị iche iche na-agwa ndị ntaakụkọ okwu gbasara okwu ya nke nọ n'ihu ụlọikpe.
Ọ sịrị na Natasha Akpoti-Uduaghan agaala n'ụlọmgbasaozi BBC, CNN nakwa ndị ọzọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu gbasara ikpe ahụ.
N'oge ọ na-achabi ikpe, Ọkaikpe Nyako nyere iwu ka ndị niile so n'okwu ahụ na ndị ọkaiwu ha kwụsị ịgwa ndị ntaakụkọ okwu maọbụ zaa ajụjụ ọbụla metụtara okwu ahụ.
Nyako gakwara n'ihu gbochie mmadụ niile so n'okwu ahụ na ndị ọkaiwu ha isite n'ọbaozi soshal midịa na-egosi ka okwu ahụ si aga n'ụlọikpe.
INEC ekwuola na akwụkwọ e tinyere iji chụlaa Sịnetọ Natasha ezughị oke

Ebe foto si, Natasha Akpoti Uduaghan/Instagram
Ụlọorụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuola na akwụkwọ e tinyere iji chụlaa onye omeiwu na-anọchite anya Kogi Central bụ Natasha Akpoti-Uduaghan ezughị oke.
Obere ozi INEC wepụtara n'ọbaozi X ha n'ụbọchị Tọzde 3 Eprel 2025 kwuru na akwụkwọ ahụ enweghị ihe niile a chọrọ dịka ọ dị n'iwu.
Ozi ahụ sịrị "akwụkwọ mkpesa e tinyere iji chụlaa onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara Kogi Central enweghị ihe niile a chọrọ dịka ọ dị na mpaghara 69(a) nke iwu Naịjirịa e mere n'afọ 1999."
Ha kọwara na mpaghara 69(a) nke iwu Naịjirịa kwuru na akwụkwọ ọbụla e tinyere iji chụlaa onye sịnetọ ga-enwe akara ihe karịrị ọkara ndị debanyere aha ha maka ịtụ vootu na mpaghara onye omeiwu ahụ.
Ọnọdụ a na-abịa n'ime izuụka ole na ole INEC jụrụ ịnabata akwụkwọ ahụ a chọrọ iji chụlaa Uduaghan ma rụtụ aka na ndị dere ya akọwaghị ebe ha bi nakwa ihe ndị ọzọ. Ka o sinadị, ndị ahụ gbara akwụkwọ mechara tinye ha dịka INEC nabatara ya.
Etu Sinetọ Natasha siri lọta ụlọ agbanyeghị mmachi gọọmentị Kogị steeti

Ebe foto si, Natasha Akpoti/Facebook
Ọtụtụ igwe mmadụ gbakọrọ ịnabata Nwada Natasha Akpoti-Uduaghan onye na-anọchiteanya mpaghara etiti na Kogị steeti 'Kogi Central District' n'ụlọ omeiwu Sinet, mgbe o mere emume nlọta ụlọ na steeti ahụ na Tuzde ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprel 2025.
Sinetọ Natasha bụ onye ndị omeiwu Sinet kwụsịrị ọrụ ọnwa isii n'ihi ebubo "mmebi iwu nke Sinetị" yana "mmebi usoro iwu nke 'Senate Standing Rules 2023' dịka emezigharịrị ya".
Nlọta ụlọ ya na-eme agbanyeghị na ndị uweojii steeti ahụ gwara ndị haziri ya ka ha kagbua ya n'ihi ọnọdụ nchekwa dị steeti ahụ.
N'aka nke ọzọ, gọọmentị steeti ahụ machikwara inwe ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị awa ole na ole tupu mgbe Sinetọ Natasha ga-eme emume nlọta ụlọ ya.
Mana machi a, e gbochighị ndị na-akwado Sinetọ Natasha iji egwu na anụrị pụta n'igwe were nabata ya na steeti ya.
Cheta na ụlọọrụ na nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC kwuru na ụfọdụ ndị mpaghara Kogi central wetere ha akwụkwọ mpesa na Maachị 24 2005, ma kwuo ka a napụ Natasha Akpoti-Uduaghan akwụkwọ asambodo o ji anọchịtaanya ha n'ụlọ omeiwu ukwu.
Sinetọ Natasha gwara ndị na-akwado ya na nrụrụaka dị n'etu ndị ahụ o kwuru na ha bụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progress Congress (APC), siri akpọ oku ka a napụ ya asambodo.
O bokwara ụlọọrụ INEC ebubo ịkwado ndị ahụ dịka o kwuru na nnyocha ya mere gosiri na ndị ahụ dere adreesị ebe amaghị n'akwụkwọ mpesa ha.
Ọ gara n'ihu gwa ndị ọ na-anọchiteanya ya ka ha ghara mmebi iwu obodo agbanyeghị ihe ọbụla.
O kwuru na nkwụsị ọrụ ndị omeiwu kwụsịrị ya esonyeghị ụzọ iwu na-akwado.
Usoro e ji ewepụ Sinetọ maọbụ onye omeiwu ọbụla n'ọkwa - INEC

Ebe foto si, Inec/Natasha/x
Ụlọ ọrụ na-ahazị ntuliaka aka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) emeela ka a mara usoro e si ewepụ onye Omeiwu n'oche maọbụ etu ndị ọ na-anochitaanya ya were ike kpọlata ya.
INEC mere ka a mata nke a n'ihe ha dere n'akara X soshal Midia ha.
N'ime ihe niile INEC depụtara, lee ndị ị kwesiri ịmara:
- Ndị onye omeiwu na-anọchịtaanya ha ga-ede akwụkwọ mkpesa degara ụlọọrụ INEC.
- Ulọọrụ INEC ga-eme ka onye omeiwu ahụ mara na e dere akwụkwọ mkpesa maka ya.
- INEC ga-eme akwụkwọ mkpesa ahụ nyocha ma mara ndị niile binyere aka ya. Ha ga-achọpụta na ndị ahụ binyere aka n'akwụkwọ mkpesa ahụ e si na mpaghara onye omeiwu ahụ na-anọchịta anya ya.
- INEC ga-eguzobe ndị ga-eme nyocha ma nyekwa onye omeiwu ahu ohere ịhọpụta ndị ga-anọchịta anya ya n'ebe niile bụ ebe a na-ebinye aka na mpaghara ahụ.
- N'oge nyocha ndị binyere aka n'akwụkwọ mkpesa ahụ INEC ga-eme ka a mara na aha ndị ahụ dere akwụkwọ ahụ ọ dị n'akwụrụngwa BVAS.
- A ga-eme ntuliaka ka ndị mmadụ binye aka saa ajuju na ha achọrọ ka e wepụ onye omeiwu ahụ n'ọkwa maọbụ na ha achọghị.
- A ga-akpokota vootu a tụrụ n'ebe niile e mwere ma gụpụta ya.
Anyị ga-amalite inyocha akara njirimaara dị na mkpesa e dere maka iwepụ Sịnetọ Natasha - INEC

Ebe foto si, Inec/Natasha/Facebook
Ulọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent Electoral commission (INEC) ekwuola na ha ga-amalite ugbua inyocha akara njirimaara ndị mmadụ binyere aka n'akwụkwọ ka e wepụ Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan n'ọkwa dịka onye na-anọchiteanya Kogi central.
N'akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ụbọchị Wenezde 26 Maachị, 2025, ụlọọrụ a kwuru na ndị debatara akwụkwọ mkpesa ahụ emecheela zite akara ụlọ ebe ha bi nakwa nke 'e-mail' ha.
Ha gara n'ihu kwuo na ha ezigaarala Sịnetọ Natasha akwụkwọ ka ọ maara na o nwere ndị wetere mkpesa ka achụpụ ya, ma zigakwara ndịisi ụlọomeiwu akwụkwọ banyere nke a.
Ozi a kwuru na ihe ọzọ a ga-eme ugbua bụ inyocha akara njirimaara ndị ndị binyereaka n'akwụkwọ mkpesa iji mara ma ha zuru ọnụọgụgụ a chọrọ maka iji ewepụ Sịnetọ Natasha n'ọkwa.
Ọ bụrụ na ha mechaa nyocha a ga-eme n'ụbọchị ole ma ole na-abịa abịa na ha ga-eme ka ọhanaeze maara ihe ọzọ ga-eso ya.

Ebe foto si, INEC
Nke a na-abịa n'ime otu ụbọchị odeakwụkwọ n'ụlọọrụ INEC na ngalaba VEP bụ Rose Anthony gwara BBC Igbo na ha ga-ebido inyocha akwụkwọ mkpesa ahụ e debataara ha.
N'okwu Anthony "ọ bụ eziokwu na anyị natara akwụkwọ mkpesa banyere ị napụ Sịnetọ Natasha asambodo".
"Ihe ọzọ anyị ga-eme ugbua bụ ịme nyocha banyere akwụkwọ mkpesa ahụ mara na emere ya n'usoro iwu"
"Ihe ọzọ anyị ga-eme bụ ịkpọtụrụ Sịnetọ Natasha ma nye ya ohere ịzara ọnụ ya".
Mana na mkparịta ụka ahụ, Anthony agwaghị onye ntaakụkọ BBC na mgbe maọbụ abalị ole ọ ga-ewe ha ịme nyocha ahụ.

Ebe foto si, Natasha Akpoti-Uduaghan/Facebook
Cheta na Maachị 24 2005 ka ndị mpaghara Kogi central wegara akwụkwọ mpesa n'ụlọọru INEC sị ka a napụ Natasha Akpoti-Uduaghan akwụkwọ asambodo o ji anọchịtaanya mpaghara ahụ.
Akwụkwọ mkpesa ahụ nke Charity Ijese nyefere n'aka onye ọrụ INEC bụ Rose Anthony ka ha kwuru na ha enweghịzị mmasị na ntụkwasị obi n'ebe Natasha Akpoti-Uduaghan nọ.
Charity sị na ihe ha mere dị n'iwu ma nwee nkwado na ngaraba 69 nke akwụkwọ iwu Naịjirịa 1999 nakwa usoro e si akpọghachịta onye omeiwu nakwa usoro ọrụ ndị INEC.
Sịnetọ Natasha wegala ikpe ya n'ọgbakọ ndị omeiwu mba ụwa 'United Nations'

Ebe foto si, NASSTV
Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan ewegala ikpe ya na Sịnetọ Godswill Akpabio n'ọgbakọ ndị omeiwu nke mba ụwa a na-akpọ 'Inter-Parliamentary Union' United Nations, e mere n'obodo New York dị na mba Amerịka.
Sịnetọ Natasha bụ onye ụlọ omeiwu Sịnetị Naịjirịa nkwụsịrị ọrụ ọnwa isii, gwara ọgbakọ UN ahụ ka ha nyere ya aka mee ka ụlọ omeiwu Naịjirịa mee ihe ziriezi.
N'oge ọ na-ekwu okwu n'ọgbakọ ahụ, ọ sịrị na "a na-akpagbu ya, na-enye ya mkparị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma na-eyi ya egwu" maka ịchọ nnyocha doro anya banyere ebubo mmekọahụ ya kwupụtara megide onyeisi ndị omeiwu sinetị na Naịjirịa bụ Godswill Akpabio.
Ọ kpọrọ mba ụwa oku ka ha nyere ya aka ịhụ na akpagbughị ọchịchị onye kwuo uche ya na ikike dịrị ụmụnwaanyị na mba Naịjirịa.
Cheta na a kwụsịrị ya ọrụ n'ụbọchị Tọzde abalị isii nke ọnwa Maachị 2025 n'ihi ebubo "mmebi iwu nke Sinetị" yana "mmebi usoro iwu nke 'Senate Standing Rules 2023' dịka emezigharịrị ya".
Tupuu ebubo gbasara mmekọahụ amalite, Sinetọ Natasha na onyeisi ndị Sinetị bu ụzọ wee esemokwu banyere nhazigharị oche n'ụlọ nzukọ sinetị ma weega ya n'azụ oche.
Dịka akwụsịrị ya ọrụ, ndị omeiwu gakwara n'ihu kpọchie ụlọọrụ ya, ma kwụsịkwa ụgwọ ọnwa ya, nchekwa nille o nwere ma machi ya ịkpọ onwe ya Sinatọ n'ebe ndị ntaakụkọ nọ.
Ndị omeiwu kwuru na Sinatọ Natasha ga-etinye akwụkwọ ịrọ mgbaghara tupuu anabata ya ọzọ dịka onye omeiwu.
Ụlọomeiwu akwụsịla Sịnetọ Natasha ọrụ n'ihi esemokwu ya na Sịnetọ Akpabio

Ebe foto si, Natasha H Akpoti/Facebook
Kọmitii na-ahụ maka akparamagwa n'ụlọomeiwu Naịjirịa nọọrọ n'ụbọchị Tọzde kwụsị Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan na-anọchite anya Kogi Central ọrụ ruo ọnwa isii.
Mkpebi a bụ maka ebubo mmetọ Sịnetọ a boro Onyeisi ụlọomeiwu bụ Sịnetọ Godswill Akpabio.
Na nzukọ ha na-enwe, onyeisi kọmitii ahụ bụ Sịnetọ Neda Imasuen tụrụ arọ ka a kwụsị Sịnetọ Natasha ọrụ maka ịda iwu na-achị ndị Sịnetị nke afọ 2023, ma sị na o wetere ihere n'ebe Onyeisi ụlọomeiwu nakwa ndị omeiwu.
O kwuru na tupu ha wepụ ntaramahụhụ ahụ maọbụ belata aka, na Sịnetọ Natasha ga-edetara ndị Sịnetọ akwụkwọ mgbaghara, bụ nke ha ga-eleba anya.
Arọ ndị a gụnyere ịgbachi ụlọọrụ ya ruo oge ahụ, kwụsị ịkwụ ya ụgwọ ọnwa nakwa ụgwọ ndị ọzọ gụnyere nke ndị enyemaka ya.
Kọmitii ahụ chọkwara iwezuga ndị ọrụ nchekwa ya ma gbochie ya ịma ụkwụ n'ụlọomeiwu maọbụ n'ebe ndị nso n'ụlọomeiwu
Ntaramahụhụ ndị e nyere Sịnetọ Natasha
- Kọmitii ahụ kwuru ga-akwụsị ya ọrụ ruo ọnwa isii
- A ga-agbachi ụlọọrụ ya ruo ọnwa isii ahụ.
- A ga-akwụsị ịkwụ ya ụgwọọnwa, ụgwọ mgbakwụnye gụnyere nke ndị enyemaka ya.
- A ga-ewezuga ndị ọrụ nchekwa ya.
- Ọ gaghị ama ụkwụ n'ebe dị nso n'ụlọomeiwu ahụ.
Kọmitti ụlọomeiwu akagbuola mkpesa Sịnetọ Natasha nyere megide Sịnetọ Akpabio

Ebe foto si, Natasha/Akpabio/Senate/Facebook
Kọmitii ụlọomeiwu na-ahụ maka akparamagwa akachapụla mkpesa ahụ Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan nyere megide Onyeisi ndịomeiwu bụ Godswill Akpabio nke sị na ọ chọrọ idina ya nakwa imetọ ọkwa ọchịchị ya.
Kọmitii a nọọrọ n'ụbọchị Wenezde kwuo na mkpesa ahụ achịtaghị aja ọbụla maka na o soghi Usoro iwu, tinyekwara na okwu ahụ nọ n'ụlọikpe.
Onyeisi kọmitii ahụ bụ Sịnetọ Neda Imasuen rụtụrụ aka n'iwu akara 40 nke iwu na-achịkwa ụlọomeiwu ma kọwaa na Akpoti-Uduaghan ji aka ya binyeaka n'akwụkwọ mkpesa ahụ kama inye ya onye ọzọ ka o mee nke mere o jiri bụrụ adịgboroja.
Ọ gbakwụnyere na okwu banyere mkpesa ahụ dị mbụ nọrọ n'ụlọikpe nke mere na okwu ahụ akarịala ikike ndị omeiwu ileba ya anya.
Etu Sịnetọ Natasha si nye mkpesa ahụ
Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan emeela mkpesa n'ụlọomeiwu na-ebo onyeisi ndị omeiwu bụ Sịnetọ Godswill Akpabio ebubo na ọ chọrọ idina ya.
O kwuru nke a na nzukọ ndị omeiwu nwere n'ụbọchị Wenezde ma sị na Akpabio metọrọ ikikere ụlọọrụ ya dịka onyeisi ụlọomeiwu.
Ọ rịọrọ ka e nye ya ohere ka ọ pụta n'ihu ndị Sịnetị bịa mee kpesa ahụ.
Ndị Sịnetị wegara mkpesa n'aka kọmitii na-ahụ maka akparamagwa n'ụlọomeiwu ma sị ha nyochaa ebubo ahụ ngwa ngwa.
N'aka nke ọzọ, Akpabio bụ onye e boro ebubo a agọọla na aka na ụkwụ ya dị ọcha n'ebubo ahụ.
Mgbe ọ na-ekwu okwu na mmalite ọgbakọ ha, Akpabio kwuru "Onweghi oge ọbụla mmajara nwaanyị n'ụzọ ọbụla. Nne m nwụrụ anwụ zụrụ m ọfụma, ana m akwanyere nwaanyị ukwu. Etunyere m ugo dịka gọvanọ kachasị bụrụ enyi ọha."
Ihe ụlọomeiwu kwuru tupu Sịnetọ Natasha emee mkpesa ahụ

Ebe foto si, Natasha Akpoti/Instagram
Ndị Omeiwu ekwuola na ha agaghị amalite ime nnyocha banyere okwu dị n'etiti Onyeisi ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa bụ Sinetọ Godswill Akpabio na Sinetọ Natasha Akpoti-Uduaghan na-anọchiteanya Kogi Central n'ụlọomeiwu ahụ n'ihi na ha anatabeghị akwụkwọ mkpesa megidere Sinetọ Akpabio.
Ọnụ na-ekwuru ndị omeiwu bụ Yemi Adaramodu kwuru nke a mgbe ya ndị ntaakụkọ Arise tv nwere mkparịtaụka.
O kwuru na ndị omeiwu agaghị amalite inyocha Sinetọ Akpabio n'ihi ihe onye omeiwu ọzọ kwuru n'ihe onyonyoo maọbụ maka ihe e kwuru n'ụlọmgbasaozi ndị ọzọ.
Adaramodu kwuru na ndị omeiwu anaghị arụ ọrụ ha site n'akụkọ na-efegharị na sọshịa midịa, nke mere o jiri kwuo na Sinetọ Natasha kwesịrị ime mkpesa maọbụ wepụta okwu ahụ n'ọgbakọ ndị omeiwu tupu ndị omeiwu amalite ime nnyocha.
O kwuru na okwu e wetere n'ihu ndị omeiwu bụ na Sinetọ Natasha anaghị erubeisi n'iwu e guzoro n'ụlọ omeiwu.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na e nwere mkpesa maka ebubo inye mmadụ nsogbu mmekọahụ nke ndị omeiwu chọpụtara naAkpabio mere n'eziokwu, a ga-buga ikpe ahụ n'aka ndị Kọmiti na-ahụ maka omume ziri ezi, ugwu nke mmadụ na mkpasa ka ha mee nnyocha.
Adaramodu kwuru na e mechaa chọpụta na ọ bụ eziokwu na ebubo e boro Sịnetọ ahụ bụ eziokwu, na ọ ga-enweta ntaramaahụhụ n'agbanyeghị onye ọ bụ.
Onye Ọkaiwu aha ya bụ Liborous Oshoma tinyere ọnụ n'okwu ahụ gwara ndị ntaakụkọ Arise tv na ịnye mmadụ nsogbu mmekọahụ bụ mpụ.
O kwuru na ndị omeiwu enweghị ikike ileba anya n'okwu banyere inye mmadụ nsogbu mmekọahụ n'ihi na Sinetọ Natasha enyeghị mkpesa n'ụlọ omeiwu dịka usoro iwu ndi omeiwu siri kwuo.
Oshoma kwuru na ọ bụ mgbe Sinetọ Natasha mere mkpesa n'usoro kwesịrị ekwesị ka ndị omeiwu ga-enye Kọmitii na-ahụ maka omume ziri ezi, ugwu nke mmadụ na mkpasa ikike ka ha malite nnyocha.
A tụkwasịrị m nwunye m obi n'ihe o kwuru banyere Sịnetọ Godswill Akpabio - Di Sịnetọ Natasha

Ebe foto si, NATASHA AKPOTI-UDUAGHAN
Di Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan na-anọchiteanya Kogi Central n'ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa bụ Emmanuel Uduaghan etinyela ọnụ n'ebubo nwunye boro onyeisi ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa bụ Sịnetọ Godswill Akpabio nke bụzi ọkwụ a kpọ n'ọnụ na Naịjirịa nke mere ka ọtụtụ mmadụ malite ịkpọ oku ka e nnyochaa Sịnetọ Akpabio.
Cheta na Sịnetọ Natasha boro Sịnetọ Akpabio ebubo ịnye ya nsogbu mmekọahụ oge ọ na-aza ajụjụ ndị ntaakụkọ jụrụ ya n'ụlọmgbasaozi Arise News ụbọchị Fraịde 28 Febụwarị, 2025.
Sịnetọ Natasha kwukwara na Sịnetọ Akpabio na-akpagbu ya ma na-emegide ya maka na o kweghị ka ya na ya dinaa.
Akwụkwọozi Emmanuel Uduaghan bụ Chief obodo Warri dị na Delta Steeti, kwuru na ihe mere o ji tinye ọnụ n'ọkwụ ahụ bụ maka na enweela ọtụtụ ihe na-apụta kemgbe okwu ahụ dị n'etiti nwunye ya na Sịnetọ Akpabio malitere.
O kwuru na ọ bụ eziokwu na nwunye ya gwara maka nsogbu mmekọ ahụ ahụ Sịnetọ Akpabio na-enye ya.
'Mụ na Sịnetọ Akpabio nwere mkparịta uka banyere okwu ahụ iji hụ na e kpeziri ya maka na ezinaụlọ m na ezinaụlọ Sịnetọ Akpabio na-adị na mma' ka Emmanuel Uduaghan kwuru.
'Sịnetọ Akpabio kwenyere na ha ga-ekpezi okwu ahụ n'udo' ka ọ gbakwụnyere.
Emmanuel Uduaghan kọwara na 'N'agbanyeghị nkwenye ya, nwunye m gwara m na Sịnetọ Akpabio gara n'ihu na-enye ya nsogbu mmekọahụ ma na-akpagbu ya n'ụlọomeiwu Sineti'.
Emmanuel Uduaghan gara n'ihu kpọkuo ụlọomeiwu Sineti nakwa onyeisi ha bụ Sịnetọ Akpabio ka ha kwanyere nwunye ugwu ruoro ya dịka onyeomeiwu Naịjirịa ma kwuo ka ụlọọrụ ọ dị n'aka mee nnyocha n'okwu dị n'etiti nwunye ya na Sịnetọ Akpabio.
Nwunye Sịnetọ Godswill Akpabio agbaala Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan akwụkwọ n'ụlọikpe

Ebe foto si, Godswill Akpabio/Instagram/Natasha Akpoti-Uduaghan/Facebook
Unoma Akpabio bụ nwunye onyeisi ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa bụ Godswill Akpabio akpụpụla Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan na-anọchiteanya Kogi Central n'ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa ụlọikpe maka ebubo imetọ ikike na aha ya oge ọ gara mmemme mkparịtaụka n'ụlọmgasaozi Arise News.
Unoma Akpabio gwara ụlọikpe ka ọ gwa Sịnetọ Natasha ka ọ kwụọ ya ego dị ijeri naịra narị abụọ na iri ise (N250billion) nakwa otu ijeri naịra ọzọ (N1billion).
Nwụnye Sịnetọ Akpabio gbara akwụkwọ a n'ụlọikpe Federal High Court dị n'Abụja dịka Sịnetọ Natasha boro di ya ebubo ịnye ya nsogbu mmekọahụ oge ọ na-aza ajụjụ ndị ntaakụkọ jụrụ ya n'ụlọmgbasaozi ahụ.
Sịnetọ Natasha kwuru na onyeisi ụlọomeiwu Sineti na-akpagbu ya ma na-emegide maka o kweghị ka ya na ya dinaa.
Na nzaghachi ya, nwụnye Sịnetọ Akpabio kwuru na ebubo ahụ Sịnetọ Natasha boro di ya abụghị eziokwu.
Kedụ ihe kpatara okwu a?

Ebe foto si, Natasha Akpoti-Uduagan/Facebook/Godswill Akpabio/Instagram
Nsogbu dị n'etiti onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa bụ Sịnetọ Godswill Akpabio na Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduagan bidoro oge Sịnetọ Natasha chọpụtara na a gbanwere oche ya n'ụlọomeiwu. O kwuru na enweghị onye gwara ya tupu a gbanwee oche ya ahụ.
Ọ bụ nke mere ka ọ jụọ onyeisi ụlọomeiwu ajụjụ banyere oche ya ahụ a gbanwere, mana nke a butere nsogbu n'ọgbakọ ụlọomeiwu ụbọchị nke mere ka Sịnetọ Akpabio nye iwu ka a chụpụ Sịnetọ Natasha n'ọgbakọ ụbọchị ahụ.
Sinetọ Akpabio mechara gwa kọmịtii ụlọomeiwu Sineti na-ahụ maka omume nke Sịnetọ Neda Imaseun bụ onyeisi ha ka ha mee nnyocha n'agwa ahụ Sịnetọ Natasha kpara.
Sịnetọ gara n'ihu gbaa Sinetọ Akpabio na onye ndụmọdụ ya pụrụiche bụ Mfon Patrick akwụkwọ n'ụlọikpe maka imetọ aha ya.
Ọkaiwu ya bụ Victor Giwa kwuru na Mfon Patrick wepụtara ozi n'akara soshal midia Facebook nke isiokwu ya bụ 'Is Local Content Committee of the Senate Natasha's Birthright'?
Akwụkwọ ozi ahụ boro Sịnetọ Natasha ebubo na o chere na ị bụ Sịnetọ abụghị naanị ite ihe e ji achọ mma n'ihu na inyi akwa na-egosi ahụ.
Okwu ahụ bịara kawanye njọ oge ndị ọrụ ụlọmgbasaozi Arise News gbara Sịnetọ Natasha ajụjụ ọnụ n'ihe mmemme 'Morning Show' ụbọchị Fraịde 28 Febụwarị, 2025 ebe o kwuru na Sịnetọ Godswill Akpabio na-enye ya nsogbu mmekọahụ.
O kwuru na ụfọdụ ndị omeiwu ibe ya gwara ka ọ nabata oche ọhụrụ ahụ e nyere n'ụlọomeiwu Sineti.









