Esemokwu mụ na nwamadị ahụ na-akwọ ụgbọala mere ka m mụrụ akọ - Alex Mascot Ikwechegh
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu & Kelechi Anozia
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist
Onye omeiwu na-anọchiteanya Aba North na South n'ụlọomeiwu Naịjirịa bụ Alex Mascot Ikwechegh akọwaala ihe butere esemokwu ya na nwamadị ahụ na-akwọ ụgbọala.
Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Ikwechegh kwuru na ọ bụ eziokwu na ụmụnne abụọ nwereike ịlụ ọgụ mana ha lụchaa ọgụ, ha ekpezie.
O kwuru na ọ bụ etu a ka ọ dị n'esemokwu ya na nwamadị ahụ na-akwọ ụgbọala nke furu ewu na soshal midia n'ọnwa Ọktoba afọ 2024.
N'okwu ya "ọ bụ eziokwu na nwamadị ahụ bịara n'ụlọ m, kparịa m n'ihu ụmụ m, nke mere m jiri kpaa agwa etu ahụ mana ugbua mụ na ya abụrụla enyi.
"Ọ ghọtara na ihe o mere adịghị mma, mụ onwe m ghọtakwa na ihe m mere adịghị mma.
"Emechara m chọpụta na mụ na nna nwaokoroọbịa ahụ bụ ezi mmadụ, ya na nwanne ukwuu bụ Eze Okpotemba bụ enyi."
Ọ gara n'ihu kwuo na o nwere ụfọdụ ndị chọrọ iji esemokwu ha akpara ego nke mere ha jiri na-akwanye nwamadị ahụ ọkụ.
Ikwechegh gara n'ihu kwuo na esemokwu ahụ mere ka ọ mụta ihe - na ọ bụrụ na mmadụ kparịa gị, ka i leghara onye ahụ anya.
O kwuru na kamgbe ọ nọ n'ọrụ inyere ndị mmadụ aka n'ihe dịka afọ iri na ise na o nweghi onye ọbụla toro ya na ọ na-agba mbọ kama ngwa ngwa ha nụrụ na o nwere nsogbu a, ha na-akpọ oku ka e gbuo ya.
Na mkparịtaụka ahụ, Ikwechegh tinyekwara ọnụ n'etu o siri banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, etu ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu si dị nakwa ihe ha na-eme iji hụụ na a tọhapụrụ Nnamdi Kanu.
Kirie ihe o kwuru n'uju;



