Ọ bụ mkparị nye ọkwa Gọvanọ na ị ga-abụcha Gọvanọ gaa zọwa ọkwa Sịnetọ - Sullivan Chime
Sullivan Chime bụbu Gọvanọ Enugwu Steeti ekwuola na akụkọ kwuru na ọ chọrọ ịzọ ọkwa Sịnetọ bụ asị ọcha na mkparị nye ya.
Ọkaiwu Chime gbara ama na na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere ma kwuo ọ bụghị eziokwu na o nwere echiche ịzọ ọkwa Sịnetọ.
N'okwu ya 'Ọ bụ mkparị na mmadụ bụchara Gọvanọ steeti ga bụrụ Sịnetọ'.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọ kọwara na izọ ọkwa Sịnetọ adịghị ya mkpa ma kwuo na ebe uche ya dị bu ihe a ga-eme iji nweta ịdị n'otu na Naịjirịa.

Ebe foto si, Sullivan Chime/Fcaebook
Ọ gara n'ihu katọọ ajọ omume ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ma kọwaa na ọ dị mkpa ka onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla na Naịjirịa rụru ọrụ iji nweta udo na mpaghara Naịjirịa gbaa gburu gburu.
N'aka nke ọzọ, Sullivan Chime mere kpọrọ oku ka ndị ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa mepụta iwu nke ga-enye ntaramahụhụ nye onye ọbụla na-akpọ maka nkewa Naịjirịa.



