Aga m eji ọkwa m dịka Imam na National Mosque wetere ndị Igbo ihe ọma - Iliyasu Usman Ogbonnaya Onah

Aha onyonyo, Aga m eji ọkwa m dịka Imam na National Mosque wetere ndị Igbo ihe ọma - Iliyasu Usman Ogbonnaya Onah
Aga m eji ọkwa m dịka Imam na National Mosque wetere ndị Igbo ihe ọma - Iliyasu Usman Ogbonnaya Onah
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu, Kelechi Anozia na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist, Video Journalist na Video Journalist

Ọkammụta Iliyasu Usman Ogbonnaya Onah, nwafọ Igbo ji ọkwa Imam n'ụlọ okpukperechi Alakụba 'National Mosque dị n'Abuja akọwaala etu njem ya n'okpukperechi ahụ si gaa ruo n'ogogo ọ nọ ugbua.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Ọkammụta Usman kwuru na a mụrụ ya n'ime okpukperechi Alakụba maka na nne na nna ya bụ ndị okpukperechi ahụ.

Ọ sị na a mụrụ ya n'obodo Ibeagwa-Aka dị n'okpuruọchịchị Igbo Eze South dị n'Enugwu Steetị bụ ebe ọ nọ malite ịgụ akwụkwọ banyere okpukperechi Alakụba.

Usman kwuru na ọ gụrụ akwụkwọ nwete ihe nzere Phd na Mahadum n'afọ 2011 na 2012, e mechaa chie ya ọkwa 'Ọkammụta' n'afọ 2021 na mahadum Nasarawa Steeti. O kwuru na mgbe ahụ na ọ malitere ide akwụkwọ ma na-agbasa ozi n'ọgbakọ dị iche iche ruo mgbe a hụrụ ya ma kwuo na o nwere ihe e ji etozuoke ịbụ onye ndu okpukperechi Alakụba.

Mgbe Ọkammụta Usman nyere mgbasaozi nke mbụ ya dịka Imam.

Ebe foto si, Prof. Iliyasu Usman

Ọkammụta Usman kwuru na obi dị ya ụtọ n'ọkwa ahụ maka na ihe ọbụla na-eme na Naịjirịa ugbua na o so na-ahụ ya.

O kwuru na ọ ga-eji ohere ọkwa ahụ wetere ndị Igbo ihe ọma ma kwuo okwu megide ihe ọbụla ga-emegbu ndị Igbo na Naịjirịa. "Obi dị m ụtọ maka na ihe ọbụla na-eme na Naịjirịa ugbua anyị na-ahụ ya.

Chineke maara na ihe ọbụla ga-ewetere ndị Igbo udo, aga m agba mbọ n'ebe a ịhụ na e mere ya.

"Ihe ọbụla doro anya ga-abụ mmegbu nye ndị Igbo, Chineke ga-enyere m aka ka m gwaa ndị mụ na ha nọ ebe a na nke ahụ adịghị."

Ọkammụta Usman gara n'ihu kọwaa etu ụfọdụ ndị Igbo si ahụta okpukperechi Alakụba ma kwuo na ọ dịghị mma maka na okpukperechi ahụ abụghị naanị maka ndị ugwu.

O kwukwara ihe a ga-eme iji hụụ na ndị okpukperechi Alakụba na nke Kraịst bi n'udo na Naịjirịa. Kirie ihe o kwuru n'uju;

Ọkammụta Usman bụ nwafọ Igbo mbụ a ga-enye ọkwa Imam na National Mosque, Abuja.

Ebe foto si, Prof. Iliyasu Usman