Ọ bụ gịnị na-afịọ na Ngor-Okpala dị n'Imo steeti?

Ọ bụ gịnị na-eme na Ngor Okpala dị n'Imo steeti?

Ebe foto si, BBC, Imo State Police Command

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Na nso nso a ka a nọ na-enweta akụkọ gbasara ebubo mwakpo ndị ọchiehi n'okpuruọchịchị Ngor-Okpala dị n'Imo steeti.

Otu ihe onyonyoo fesara n'ọbaozi soshal midịa gosiri ebe ndị mmadụ na-eti mkpu ma na-ebo ebubo na ndị ọchịehi ji imeọhịa mere ebe obibi ha tọọrọ ndị na-eme njem n'okporoụzọ si Owere gawa Aba na mpaghara Ngor-Okpala.

Ndị bi na Ngor-Okpala kwuru na ebe ọnọdụ ahụ kachasị njọ bụ n'Ihitte, Umuhu, Okpala, nakwa okporoụzọ awaraawara si Owere gawa Aba.

"Ndị ọrụ nchekwa awuchiela na Ngor Okpala"

Kọmịshọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Aboki Danjuma na onyendu ndị ntoroọbịa na Ngor-Okpala bụ Hon. Achor Samuel Obinna

Ebe foto si, Hon. Achor Samuel Obinna

Oge BBC Igbo kpọrọ onyendu ndị ntoroọbịa n'obodo Elelem n'okpuruọchịchị Ngor Okpala bụ Achor Samuel Obinna n'ekwentị, ọ kọwara na otu nsogbu gbara ọkpụrụkpu ha na-enwe kemgbe ihe karịrị otu izuụka bụ nsogbu enweghị nchekwa.

"Ndị omekome na-eyi anyị egwu na Ngor Okpala ọkachasị na mpaghara Ihitte, Okpala nakwa okporoụzọ si Owere gaa Aba," ka Obinna kwuru.

Ọ sịrị na ndị omekome a na-enyo enyo na ha bụ ndị ọchiehi zoro onwe ha n'ime ọhịa dị n'obodo ndị ahụ na-akpa arụ dị iche iche gụnyere ntọrị, igbu mmadụ, ịpụnarị ndị mmadụ ụgbọala ha nakwa ịgba ndị mmadụ egbe.

Ka o sinadị, o kwuru na kemgbe mkpụrụ ụbọchị ole na ole, na ha amalitela ịhụta ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa n'obodo ha, bụ nke gụnyere ndị uweojii na ndịagha.

Obinna kwuru sị "ụnyaahụ ka anyị na kọmịshọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Aboki Danjuma nwere nzukọ na Ngor Okpala. Ka ọ dị ugbua, ọnọdụ ahụ na-ebelata nke ukwuu".

Ọ gbakwunyere na ndị ntorobịa Umuhu dị na Ngor Okpala jidere ndị omekome ise a na-enyo enyo ma nyefee ha n'aka ndịagha.

Ihe gọọmenti na-eme banyere ọnọdụ a na Ngor-Okpala?

Onyeisioche okpuruọchịchị Ngor-Okpala bụ Chief Mrs. Chika Ibekwe

Ebe foto si, Ibekwe Chika/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onyeisioche okpuruọchịchị Ngor-Okpala bụ Chief Mrs. Chika Ibekwe kọwara ọnọdụ enweghị nchekwa a dịka nke tinyere ụjọ n'ime obi ndị bi n'obodo ahụ.

N'otu ozi o tinyere aka na ya, Ibekwe kọwara na ọnọdụ ahụ emeela ka ndị njem na-agba n'okporoụzọ si Owere gawa Aba chịrị obi n'aka, dịka ọ sịrị na ya bụ ọnọdụ na-emetụta ọdịmma ndị bi na mpaghara ahụ.

"N'agbanyeghị ndịagha nọ n'Umuowa dị n'okporoụzọ e si aga ọdọụgbọelu na ndị nke nọ n'okeala obodo Okpala na Owerrinta, anyị agaala n'ihu na-ahụta ọnọdụ enweghị nchekwa," ka Onyeisioche ahụ kwuru.

Ọ sị na ya kpọrọ nzukọ ọdụrụkụọ oge ọ natara ozi gbasara arụ dị iche iche ndị omekome na-akpa na Ngor Okpala, nke gụnyere iji egbe ezu ohi, ntọrị na ịtụ mgbere mmadụ, iji hụ na e lebaara ha anya.

"Na nzukọ ahụ ka m nọọrọ nye iwu ka ndị Eze ọdịnaala, ndị President General, ndị ndu otu jikọtara ndị ntorobịa n'obodo niile dị na Ngor Okpala hụ na ndị ntorobịa ha malitere ipiogharị n'ọhịa niile e nwere n'obodo ha iji chọpụta ndị ekperima zoro n'ime ha".

"Ejikwa m aka m degaara Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma akwụkwọ ka o bunye ndị uweojii Ngor Okpala ụgbọala Hilux iji kwalite nchekwa," ka Ibekwe kwuru.

Ọ sịrị na ndị ntorobịa Umuhu dị na Ngor Okpala na ndị ọrụ nchekwa nwụchiri ndị omekome ise oge ha jikọtara aka piogharịa n'okeọhịa dị n'Umuhu.

Ihe ndị uweojii kwuru

Ihe ndị uweojii kwuru gbasara ọnọdụ nchekwa na Ngor Okpala

Ebe foto si, Hon. Achor Samuel Obinna

Nkọwa foto, Kọmịshọna ndị uweojii n'Imo steeti, Eze ọdịnaala na Ngor Okpala, ụfọdụ ndị obodo na ndị uweojii oge ha nwechara nzukọ

Ụlọọrụ ndị uweojii n'Imo steeti ekwupụtala njikere ha dị ikpochapụ mpụ na omekome ma kwalite nchekwa na mpaghara Ngor Okpala dị na steeti ahụ.

Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye wepụtara n'ụbọchị Tọzde 13 Maachị 2024.

Dịka Okoye siri kwuo, kọmịshọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Aboki Danjuma duuru ndị uweojii na ndị nche obodo gaa piogharịa n'okeọhịa niile dị na Ngor Okpala iji kpochapụ ndị omekome niile zoro n'ime ha.

"Kọmịshọna ndị uweojii gakwara n'ụlọ ndị Eze ọdịnaala Umuhu na Ihitte-Okwe dị na Ngor Okpala dịka akụkụ mbọ ọ na-agba ime ka ndị obodo sonye na nchekwa obodo ha," ka Okoye kwuru.

Ọ sịrị na Danjuma kwere nkwa na ha ga-aga n'ihu na-epiogharị n'okeọhịa niile dị na Ngor Okpala ruo mgbe ha kpochapụrụ ndị omekome niile nọ n'ime ha.