E gburu nwunye m dị ime ọnwa ise ka a rịchara ya elu n'ike

Aha onyonyo, E gburu nwaanyị dị ime ọnwa ise aha ya bụ Chinwendu Amadi.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ihe onyonyoo a na-egosi etu di Chinwendu Amadi bụ nwaanyị e gburu n'afọ ime siri nabata ọnwụ nwunye ya.

Ụfọdụ ndị obodo na ndị ndu obodo gosikwara iwe ha gbasara ya bụ ọnọdụ.

Etu e si rịa nwaanyị dị ime elu n'ike ma gbuo ya n'Imo Steeti

Ihe ngosi ụzọ dị n'ime obodo Ngor Okpala
Nkọwa foto, Ihe ngosi ụzọ dị n'ime obodo Ngor Okpala

E gbuola nwaanyị dị ime ọnwa ise aha ya bụ Chinwendu Amadi n'obodo Umuamadi Awogwu Logara dị n'Okpuru ọchịchị Ngor Okpala n'Imo steeti.

Akụkọ anyị nwetara kwuru na njinji ahụ jiri n'ụbọchị Fraịde 18 Ọktoba 2024 oge ndị ndakpo rịrị nwaanyị ahụ elu n'ike ma magbuo ya n'obodo Umueze Ezemba dị n'azụ ọdọụgbọelu Sam Mbakwe Airport.

Oge onye ntaakụkọ BBC Igbo garuru n'ezinaụlọ nwaanyị ahụ, di ya bụ David Ikechukwu Amadi gosiri enweghị obiụtọ gbasara ụzọ ndị ndakpo siri rịa nwunye ya dị ime ya nke mbụ elu n'ike ma gbuo ya.

O kwuru sị n'ụbọchị ahụ, o chegidere nwunye ya ka ọ lọta ahịa mana nke ahụ enweghị isi, bụzi nke mere o ji malite ịkpọ ndị mmadụ aghara aghara.

Mana ka e mesịrị, ha chọtara ozu nwunye ya n'obodo Umueze Ezemba dị n'azụ ọdọụgbọelu Sam Mbakwe Airport.

Ime obodo Umuamadi Logara
Nkọwa foto, Ime obodo Umuamadi Logara

N'okwu nke ya, otu onye ndu obodo bụ Nze Leo Ugochukwu kwuru na ihe butere ọdachi ahụ bụ nleghara anya gọọmenti na ndị nlekọta ọdọụgbọelu ahụ site n'ịhapụ ka ọhịa ruchie n'okporoụzọ e si abata n'obodo ha.

Oge ọ na-ekwu okwu, Odeakwụkwọ ndị Logara bụ Chukwuemeka Boniface Njoku gosiri enweghị ojuju afọ n'ọnọdụ ahụ ha hụtara onwe ha.

O kwuru sị ọ bụrụ na ọhịa eruchighị okporoụzọ e si abata obodo ha, ndị nchekwa ọdọụgbọelu gaara ahụ mgbe a na-awakpo nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ.

Ka o siladị, anyị a kpọtụrụla ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye mana enwebeghị ọsịsa o nyere anyị.