Etu otu obodo n'Imo steeti si wakpoo ụlọụka maka ebubo na ụkọchukwu metọrọ nwata

"Ụlọụka ahụ ebe emebisiri ihe ma gbaa ọkụ"
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị obodo Ejealulu Oboama dị n'Aboh-Mbaise emebiela ihe ma gbaa otu ụlọ ụka ọkụ maka ebubo na ụkọịchukwu ụka ahụ metọrọ nwata nwoke si ebe ahụ n'ụzọ mmekọ.

Nwoke ahụ e nyere aha ya naanị dịka "Fada Mario" bụ onye dayọsisi nke Ahiara kwuru na ọ bụghị ụkọchukwu ha.

N'otu aka ahụ, ụlọụka Old Apostolic Catholic apụtaala kwuo na nwoke ahụ bụ nke ha kachapụrụ n'otu ha n'afọ 2021 maka imegide iwu ụlọụka ahụ.

O dobeghi anya iwu ndị ọ dara n'ezie mana ha kwọchapụrụ aka ha n'aha nwoke ahụ ma kwukwa na ihe ndị mere na Mbaise emeghi nso n'ebe ọbụla ha nwere ụlọụka nke ha.

Mgbe BBC gara n'obodo ahụ ịchọpụta ihe mere, anyị hụrụ ụlọụka ahụ ndị obodo ahụ gbara ọkụ ma kwasasịa ihe n'ime ya.

Anyị zutekwara nne na nna nwata ihe ahụ mere bụ ndị gwara anyị na ha enyefeela okwu ahụ n'aka ndị ntorọbịa nakwa PG obodo ha.

Akụkọ anyị nụrụ n'obodo ahụ bụ na nke abụghị mbụ ụkọchukwu ahụ na-eme ụdịrị ihe a mana o doghi anya ihe mere ejighị kọpụta ya mgbe ahụ.

Akụkọ ka na-abịa