Nwataakwụkwọ onyenkuzi ya pịanyere n'ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma anwụọla

Kọmịshọna agụmakwụkwọ nke Anambra steeti ebe ọ gara leta nwata akwụkwọ ahụ

Ebe foto si, Ngozi Chuma-Udeh/Facebook

Obere nwataakwụkwọ gbara afọ asatọ bụ Henry Chukwuemeka Okonkwo anwụọla dịka onyenkuzi ya jiiri ụtarị pịanye ya n’ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma.

Kọmịshọna na-ahụ maka agụmaakwụkwọ n’Anambara steeti bụ Ngozi Chuma Udeh kwupụtara nke a n,ụbọchị Tọzde 23 Mee 2024.

N’ozi o depụtara n’akara ọbaozi Facebook ya, Udeh sịrị na ndị Anambara na-eru uju nwata ahụ onyenkuzi amaghị nke o riri gbubiri ndụ ya n’ike ma na-akpọ oku maka ikpe nkwụmọọtọ.

Onyenkuzi nwataakwụkwọ ahụ bụ Faith Nwoye pịanyere ya ajụ n’anya n’izuụka gara aga dịka e bugara ya ụlọọgwụ n’oge ahụ maka ịnara ọgwụgwọ.

Njinji ahụ jiri n’ụlọakwụkwọ Landmark School Mgbakwu dị n’okpuruọchịchị Awka North nke Anambara steeti.

Etu onye nkuzi si pịanye nwata akwụkwọ n'ọnọdụ ọnwụ na ndụ

Akụkọ na-ekwu na ndị uweojii anwụchiela otu onye nkuzi dị afọ 30 maka ebubo ịpịa nwata akwụkwọ ihe rue mgbe o banyere n'ihe Bekee kpọrọ 'Coma'.

Kọmịshọna agụmakwụkọ na steeti ahụ bụ Ngozi Chuma Udeh gwara ndị ntaakụkọ na agbachiela ụlọ akwụkwọ ahụ.

Ọ sịkwa na ụlọakwụkwọ ahụ bụ nke adigboroja ma kwuo na ọ bụ ndị ekperima hibere ya.

Akụkọ kwukwara na ọ kpọrọ onye nwe ụlọakwụkwọ ahụ nakwa onye nkuzi ahụ oku n'ụlọorụ ya ịchọpụta ihe mere tupu a nwụchie ha.

Nwata akwụkwọ ahụ amaghị aha nọ n'ogogo 'Pramarị 2' ka nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ ugbua.

Ụlọakwụkwọ ebe ahụ mere bụ nke a kpọrọ Landmark School dị na Mgbakwu dị n'okpuruọchịchị Awka North.

Ngozi Chuma Udeh bụ Kọmịshọna Agụmakwụkwọ Anambra steeti

Ebe foto si, Ngozi Chuma-Udeh

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC na ọ nụbeghi maka akụkọ ihe mere.

Ikenga sị "anụbeghị m maka ya, ka m mee nchọpụta banyere ihe mere".

Chuma Udeh agaala nleta nwata akwụkwọ ahụ n'ụlọọgwụ ebe o dere n'akara Facebook ya sị "Ụwa na-atụgharị n'ezie...e kwetere m. Mana onye nkuzi ịpịanye nwata akwụkwọ n'ọnọdụ ọnwụ na ndụ juru m anya".