Etu aka si kpara nne na nna kwụrụ nwa ha agụụ maka ebubo ịbụ amosu

Nne nna nakwa nwa ahụ

Ebe foto si, Ify Obinabo

Nkọwa foto, A ga-akpụpụ nne na nna ahụ ụlọikpe n'izuụka na-abịa.

Ndị uweojii n'Anambara anwụchiela otu nwoke na nwunye ya maka etu ha si kwụọ nwa ha nwaanyị dị afọ ise agụụ ogologo oge nke na ọ na-ekubi ekubi.

Otu dị na nwunye, ndị Akwa-Ibom steeti kwubara nwa ha ọnụ ọtụtụ ụbọchị n'Adazi-Ani dị n'Okpuru Ọchịchị, Aniocha, Anambara steeti n'ihi ebubo na nwa ahụ bụ amosu.

Dịka nwoke ahụ na nwunye ya si kwuo, ọ bụ otu ụkọchukwu gwara nne nwa nwata ahụ na nwa ya bụ amosu nakwa na aka ya dị n'ahụhụ ọ na-ata.

Kọmịshọna ihe gbasara ụmụnwaanyị dịn'aka na steeti ahụ bụ Ify Obinabo gwara BBC Igbo n'ekwentị na nne nwa ahụ kwetara n'ezie na ọ kwụrụ nwa ya agụụ.

Obinabo sịrị, "Mgbe m jụrụ ya ihe akaebe o ji mara na nwa ya bụ amosu, nwaanyị ahụ gwara m na ọ na-anyụ onwe ya mamịrị n'abalị."

O kwukwara na ọ bụ n'elu osisi 'plank'ka nwa ahụ na-edina kemgbe afọ abụọ gara aga.

Ify Obinabo ebe ọ na-agba nne na nna nwa ahụ ajụjụ ọnụ

Ebe foto si, Ify Obinabo

Nkọwa foto, Ify Obinabo ebe ọ na-agba nne na nna nwa ahụ ajụjụ ọnụ

O kwuru na obere nwa ahụ nọ n'aka ha ugbua na-enweta onwe ya dịka ọ gachara ụlọọgwụ maka nyocha mgbe mbụ agbapụtara ya n'aka nne na nna ya.

"Ọdịmma nwata niile nọ n'Anambara steeti dị anyị n'aka na-agbanyeghị ebe ha si."

Ọ kwukwara na nne na nna ahụ nọ n'aka ndị uweojii ugbua nakwa na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe n'ụbọchị Wenezde na-abịa.