Etu aka si kpara nne na nna kwụrụ nwa ha agụụ maka ebubo ịbụ amosu

Ebe foto si, Ify Obinabo
Ndị uweojii n'Anambara anwụchiela otu nwoke na nwunye ya maka etu ha si kwụọ nwa ha nwaanyị dị afọ ise agụụ ogologo oge nke na ọ na-ekubi ekubi.
Otu dị na nwunye, ndị Akwa-Ibom steeti kwubara nwa ha ọnụ ọtụtụ ụbọchị n'Adazi-Ani dị n'Okpuru Ọchịchị, Aniocha, Anambara steeti n'ihi ebubo na nwa ahụ bụ amosu.
Dịka nwoke ahụ na nwunye ya si kwuo, ọ bụ otu ụkọchukwu gwara nne nwa nwata ahụ na nwa ya bụ amosu nakwa na aka ya dị n'ahụhụ ọ na-ata.
Kọmịshọna ihe gbasara ụmụnwaanyị dịn'aka na steeti ahụ bụ Ify Obinabo gwara BBC Igbo n'ekwentị na nne nwa ahụ kwetara n'ezie na ọ kwụrụ nwa ya agụụ.
Obinabo sịrị, "Mgbe m jụrụ ya ihe akaebe o ji mara na nwa ya bụ amosu, nwaanyị ahụ gwara m na ọ na-anyụ onwe ya mamịrị n'abalị."
O kwukwara na ọ bụ n'elu osisi 'plank'ka nwa ahụ na-edina kemgbe afọ abụọ gara aga.

Ebe foto si, Ify Obinabo
O kwuru na obere nwa ahụ nọ n'aka ha ugbua na-enweta onwe ya dịka ọ gachara ụlọọgwụ maka nyocha mgbe mbụ agbapụtara ya n'aka nne na nna ya.
"Ọdịmma nwata niile nọ n'Anambara steeti dị anyị n'aka na-agbanyeghị ebe ha si."
Ọ kwukwara na nne na nna ahụ nọ n'aka ndị uweojii ugbua nakwa na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe n'ụbọchị Wenezde na-abịa.









