Etu ụmụaka atọ si mie ala n'Imo Steeti ma bụrụ ndị a na-achọ achọ kamgbe otu izuụka

Ebe foto si, Getty Images
Obere ụmụntakịrị atọ furu na nso nso a n’Oru Ahịara dị n’okpuruọchịchị Ahịazụ Mbaise nke Imo Steeti ma tinye ndị mụrụ ha, ikwu na ibe ha nakwa ndị obodo ha n’ọnọdụ anya mmiri.
N’oge BBC Igbo gara n’obodo ahụ, nna ụmụ abụọ n’ime ha bụ Maazị Chima Onuoha kpuhere na ụmụ ya sooro nwa ọgọ ya nwaanyị gaa ịzụta mkpịsị edemede bụ ‘pencil’ n’ime ahịa Afọ Ogbe mana kemgbe ahụ enwebeghị onye hụrụ ha anya.
Ọ sịrị na ya chebuuru na ụmụ ya gawara na nke ọgọ ya mana dịka ọ chọpụtara na ha anọghị ebe ahụ, ọ gara nye mkpesa n’ụlọorụ ndị uweojii.

Dịka o siri kwuo “ọgọ m nwaanyị dunyere nwa ya nwoke nke abụọ ka ọ gaa zụta pencil n’ime ahịa Afọ Ogbe ma gwa ụmụ m ka ha ghara iduga ya mana dịka ndị mmadụ bidoro bịawa ịzụ ya ahịa, ọ maghị mgbe ha ji soro nwa ya gawa.”
“Na mbụ e cheere m na ha gawara na nke otu ọgọ m nwoke ụlọ ya dị nso n’ebe ahụ mana mgbe m chọpụtara na ha anọghị ebe ahụ, a gara m nye mkpesa n’ụlọorụ ndị uweojii,” ka o kwuru.

Ọ bụ n’ụbọchị Wenezde 13 Maachị 2024 ka ụmụntakịrị ndị ahụ gụnyere Ikechukwu Nnadozie dị afọ iri onye Umuosi, Oru Ahiara; Chioma Ikechukwu Onuoha dị afọ asaa, onye Umuiwe Oru Ahiara na Chibuikem Okechukwu Onuoha dị afọ ịse, onye Umuiwe, Oru Ahiara furu n’ahịa Afọ Ogbe dị na Mbaise.
Kọmịshọna ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Aboki Danjuma enyekwala iwu ka a chọta ụmụntakịrị atọ ahụ na-efu efu.
N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweoji bụ Henry Okoye wepụtara, o kwuru na ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-agbakọ aka ọnụ iji hụụ na a chọtara ụmụaka ndị a.
Ndị uweojii na nne na nna ụmụaka ndị a gakwara n'ihu rịọ ọhanaeze arịrịọ na onye ọbụla hụrụ maọbụ nụụ kepukepu ga-enye aka ịchọta ha biko gbaa ama.
Dịka ọ dị ugbua, ọ karịala otu izuụka (abalị asatọ) a malitere ịchọ ụmụaka ndị a achọ.








