Etu ule na agụmakwụkwọ si a da mba n'Imo steeti kemgbe 2021

Ụmụakwụkwọ na-ele ule

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ ruru BBC Igbo ntị na-ekwu na kemgbe afọ 2021, ụmụakwụkwọ nọ na klassị abụọ na-ele ule dị mkpa eleghi ya bụ ule mgbe ibe ha na mpaghara Naịjirịa niile na-ele ya.

Ule ndị ahụ bụ nke akpọrọ Federal Common Entrance Examinations bụ nke a na-ele na ngwụcha ụlọakwụkwọ Pramarị nakwa Junior WAEC Examinations a na-ele na ngwụcha ụlọakwụkọ sekọndrị nke obere.

O doghi anya ihe mere ụmụakwụkwọ a anaghị e so ibe ha n'ala Naịjirịa ele ule mgbe oge ruru mana ụfọdụ ụmụakwụkwọ bụ ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ha abanyela klassị ọhụrụ tupu e zie ha ozi ịbịa lee ule ahụ.

Ule abụọ dị mkpa ọ kachasị nke ngwụcha ụlọakwụkwọ Pramarị n'ihi na o so n'akwụkwọ ndị a na-ana mmadụ ma ọ chọọ ịbanye Mahadum, ị nweta ọrụ maọbụ ịzọ ọkwa n'ala Naịjirịa.

Asambodo si na ya bụ naanị ihe akaebe gosiri na mmadụ gụchara ụlọakwụkwọ Pramarị na Naịjriịa.

Gịnị ka ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi na-ekwu

Otu onye nkuzi n'ụlọakwụkwọ gọọmentị dị n'Imo gwara BBC etu ya bụ ihe si metụta ya na nwa ya.

Ọ kọwara na nwa ya eleghi ule Junior Waec mgbe o si kwesi.

"Nwa m nọzị na klassị ikpeazụ n'ụlọakwụkwọ Sekọndrị mana rue ugbua, o nwetabeghi mpụtara ule Junior Waec o lere".

Ọ sịkwa na nwa ya abanyela klassị nke nọ n'ihu bụ SS1 tupu akpọọ ya bịa lee ule o kwesiri ịle mgbe ọ nọ na JSS3.

Nwata akwụkwọ ọzọ anyị jụrụ ajụjụ bụ Emmanuel gwara BBC na ihe na-aga na-ewute ya.

Ọ sị "Ọ na-ewute m na ma kwadochara maka ule ahụ mana emechazi m lee ya mgbe ibe m lere ya".

Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghizi isi ịle ya bụ ule dịka ọ banyela na klassị nọ n'ihu bụ SS1.

BBC Igbo nwara ịnweta Kọmịshọna agụmakwụkwọ n'Imo steeti bụ Johncliffe Nwadike mana rue ugbua ọ zabeghi ekwentị ya.