Stammering: Etu ịsụ nsụ si metụta agụmakwụkwọ m mgbe m dị na nwata – Chigozie Okolie

Ịsụ nsụ na-emetụta ụfọdụ ụmụaka n'agụmakwụkwọ nakwa na-ịme enyi n'ụlọakwụwkọ ha

Ebe foto si, SIMON MAINA

Nkọwa foto, Ịsụ nsụ na-emetụta ụfọdụ ụmụaka n'agụmakwụkwọ nakwa na-ịme enyi n'ụlọakwụwkọ ha

Ịsụ nsụ bụ ọnọdụ na-emetụta ọtụtụ mmadụ ọ kachasi mgbe mmadụ dị na nwata.

Mmadụ nwekwara ike iburu ọnọdụ a ruo okenya agbanyeghi na nke a anaghị eme oge niile.

Ọnọdụ mmadụ ịsụ nsụ na-adị n'ụdị dị ịcheịche site na mmadụ gaa na mmadụ.

Ụfọdụ ndị nsụ nwereike inwe oge ịma jijiji ebe ha na-agba mbọ ikwu okwu.

Gịnị bụ ịsụ nsụ?

Ịsụ nsụ bụ ọnọdụ ahụike, ọ bụghị ọrịa mana ọ na-emetụta etu ụfọdụ ndị mmadụ sị ekwu okwu nke bụ na ikwu okwu agaghị adịrị ha mfe.

Ndị nsụ na-egosi ọnọdụ ha site na akparamagwa gụnyere: ikwugharị okwu ha kwuburu, ịdọtị okwu ha chọrọ ikwu ruo oge dị anya, ịkwụsị ahịrị okwu n'etiti okwu ma malite na mbido.

Gịnị na-akpata mmadụ ịsụ nsụ?

Ọnọdụ mmadụ ịsụ nsụ na-amalitekara n'oge mmadụ dị nwata, mgbe ọ ka na-amụta etu e si ekwu okwu nakwa usoro asụsụ.

Nwaada Uchenna Emefoh bụ onye ọkamụta n'akparamagwa nke ndị Bekee na-akpọ "Child Psychologist" kwuru na nnyocha sanyensị amatabeghi kpọm kwem ihe na-akpata ọnọdụ a kama nchọpụta ndị ọrụ ahụike gosiri na ihe a nwereike ịnọ n'ọbara mmadụ dịka ndị nsọ na-enwekari ndị ọzọ n'ezinụlọ ha na-asụ nsụ.

Nnyocha sayensị gosikwara na ọnọdụ a na-aka emetụta ụmụnwoke karịa ụmụnwaanyị.

Ndị ọrụ ahụike agbala ama na isi ihe nwereike ikpalata ọnọdụ a dị n'ime ụbụrụ isi mmadụ dịka ebe ahụ bụ ebe mmadụ si amụpụta ma mepụta nakwa chepụta atụmatụ ikwu okwu.

Ịsụ nsụ na aka njọ ma ọ bụrụ na akụkụ ụbụrụ isi ebe okwu si apụta nwee obere nsogbu nke bụ nsogbu ndị mmadụ na-esi mgbe a mụrụ ha nwee.

Nke a nwere ike ibute nkwugharị ihe mmadụ kwuru na mbụ maọbụ nkwụsị n'ike n'etiti okwu.

Nsụ nwereike ikawanye njọ mgbe nwatakịrị nwere ọtụtụ ihe ọ nwere ikwu, maọbụ nọ n'aṅụrụ, ụjọ maọbụ obi iwe.

Ka mmadụ na-eto bụrụ onye ntọrọbịa maọbụ okenya, ụfọdụ n'ime nsogbu ndị a na-eji aka ha hazịe onwe ha dịka ụbụrụ mmadụ ga-eji aka ya hazịe ọnọdụ a.

Ịsụ nsụ ekwesighi ịbụ ihe eji akwa mmadụ emo dịka ọ bụghị ihe mmadụ ji aka ya menyere onwe ya, dịka anyị sị hụ, nsụ bụ ihe ọbụrụpụta ụwa nye ọtụtụ ndị.

Nwa Okoroóbía kpuchiri ihu ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ịsụ nsụ nwereike ịbụ ihe ihere dịrị ụfọdụ ndị mmadụ, mana ọ kwesighi ịdị etu ahụ

Ihe ụfọdụ ndị nsọ gwara BBC Igbo maka ọnọdụ ha

Otu nwaamadị aha ya bụ Maazị Chukwuemeka na-achọghị ka a kpọzuo aha n'isi kwuru na ịsụ nsụ ka ji ya aka n'agbanyeghi na ọ dị afọ 28 ugbua.

O kwuru na ọnọdụ nsụ ya ebelata ugbua karịa etu ọ dị mgbe ọ bụ nwatakiri.

N'okwu ya, ọ kọwara "Ịsụ nsụ mere m ahapụ ịchụso akaraka masiri m n'oge mbụ"

Ọ gara n'ihu kwuo "Ị mee ejije bụ ihe masiri m oge m dị na nwata mana ịsụ nsụ mere m ahazịgharịa atụmatụ ahụ, ndị ihe na eme ejije ga-eme ka ụwa hụ m ebe m na-alụ ọgụ ikwu okwu".

Ugbua, Maazị Chukwuemeka na-arụ ọrụ dịka onye na-ahazị ejije egwuregwu pụrụiche nye ụmụaka nke a na-akpọ "Cartoon" na Bekee.

Otu nwaokorobịa ọzọ aha ya bụ Chigozie Okolie kwuru na nsụ nọ n'ọbara ndị be ha dịka ọbụghị naanị ya bụ onye nsụ na be ha.

O kwuru na nsụ nke ya ebelata ugbua dịka ọ bụrụla onye okorobịa.

Ọ sị "Nsụ metụtara agụmakwụkwọ m mgbe m dị na nwata"

Ọ gara n'ihu kwuo: "Ọnọdụ a metụtara atụmatụ eme enyị n'oge m nọ n'ụlọakwụkwọ Prịamarị na Sekọndịrị"

Okolie kwuru na ụjọ ị ga ụlọakwụkwọ bịara jịde ya n'ihe etu ndị enyị ya si na-akwa ya emo ma na achị ya ọchị maka ọnọdụ nsụ ya.

Ọ gara n'ihu kwuo "Ị jụ ajụjụ maọbụ zaa ajụjụ na klasị bụ nsogbu nke mere na m anaghị agwa onye nkuzi m ihe gbagwojuru m anya na klasị oge ahụ"

Okolie kwuru na ugbua, o kuzierela onwe ya etu e si eji nwanyọ kwuo okwu ma hapụ ịsụ nsụ.

O kwukwara "Ọ bụ naanị mgbe ọ na-ewe iwe ugbua ka ị nwere ike ịma na ọ na-asụ nsụ".

Ịsụ nsụ na-emetụta agụmakwụkwụ ụfọdụ ụmụaka

Ebe foto si, Leisa Tyler

Nkọwa foto, Ịsụ nsụ na-emetụta agụmakwụkwụ ụfọdụ ụmụaka

Ọnọdụ a, ọ nwere ọgwụgwọ?

Nwaada Emefoh gwara BBC Igbo etu mmadụ nwereike i ji kwụsị ịsụ nsọ maọbụ belata ya dịka ọ na-eto.

N'okwu ya, Emefoh sị "Enwere ụzọ ọgwụgwọ dị ịcheịche maka ọnọdụ a nke gụnyere:

"Ịduga nwata na-asụ nsụ ụlọọrụ ahụike ebe a na-ekuziri ụmụaka etu e si ekwu okwu sịte n'usoro a na-akpọ 'speech therapy'"

O kwukwara na ezinụlọ ebe nwata na-asụ nsụ ga anwa nyere nwata ahụ aka dịka ọ bụ mgbe ahụ ka ọgwụgwọ na-aka adị mfe.

Emefoh kwupụtara ụfọdụ usoro nwereike inyere nwata na-asụ nsụ aka dịka:

  • Mee ka be gị bụrụ ebe nwa na-asụ nsụ ga-enwe obi ruru ala banyere ikwu okwu
  • Hapụ ịchị nwata na-asụ nsụ ọchị maọbụ kwaa ya emo
  • Nye nwa na-asụ nsụ ohere ikwu okwu n'ịhụ ọha dịka n'ịhụ ezinụlọ gị, na ụlọakwụkwọ wdgz
  • Kuziere ya etu esi ekwu okwu n'ekwe ntị nke na-enyere ụfọdụ ụmụaka aka
  • Hapụ ịkwụchị nwata na-asụ nsụ ọnụ n'agbanyeghi ma ọ nọtere aka n'ihe ọchọrọ ikwu
  • Bụrụ onye na-enwe ndịdị nakwa onye na-ege nwa gị ntị n'ihe ọ chọrọ ikwu
  • Kuziere nwa na-asụ nsụ na ikwu okwu dị mkpa ma nyere ya aka na mbọ ọ na-agba, ekwela ya imalite ịnọpụrụ onwe ya iche maka ọnọdụ ya
  • Kwalite mmụọ ya site n'iti ya aka n'obi kwa mgbe kwa mgbe ma ọ na-agba mbọ ikwu okwu

Onye gaferela ịbụ nwata nwekwara ike ịnata ọgwụgwụ n'ọnọdụ a mana nke bụ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị gaferela afọ ndị ahụ na eji aka ha kwụsị ịsụ nsụ.

Ọ bụrụ na ịsụ nsụ ka jidi mmadụ aka n'okenye usoro ahụike bụ "Speech Therapy" ga-enyere onye ahụ aka.

Nke a bụ usoro e si agwọ ọnọdụ a.