A nwụchiela onye a ma ama maka ebubo idina ụmụakwụkwọ FUTO n'ike

Federal University of Technology Owerri

Ebe foto si, FUTO Owerri

A nwụchiela nwataakwụkwọ mahadum 'Federal University of Technology' Owerri (FUTO) a na-ebo ebubo idina ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị mahadum ahụ n’ike.

Ndị uweojii Nekede nwụchiri Okoroafor Emmanuel Chinedu bụ nwataakwụkwọ ahụ nọ n’afọ ikpeazụ ya na mahadum Futo.

A sị na Okoroafor jiiri ọkwa ya dịka onyeisi otu nchekwa Man-O-War na mahadum FUTO na-akwaso ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị iko n’ike aghara aghara.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwuru n'ezie na ndị uweojii nwụchiri Okoroafor.

Okoye kpuhere nke a n’ụbọchị Mọnde abalị15 Julaị 2024 oge onye ntaakụkọ BBC kpọrọ ya n’ekwentị.

Ọ sịrị, “Anyị nwetara mkpesa ma nwụchie nwataakwụkwọ ahụ a na-enyo enyo maka ị bụ onye na-akwaso ụmụakwụkwọ iko n’ike aghara aghara."

"Anyị na-eme nnyocha miri emi ugbua iji chọpụta ogogo arụ ọ kparala.”