Ọ bụghị ndị Hausa maọbụ Fulani wakporo ụmụakwụkwọ FUTO - Ndị uweojii

Ebe foto si, FUTO Owerri
Ụmụakwụkwọ agbasasịala ma gbahapụ Federal University of Technology Owerri (FUTO) dị n'Owere Imo state maka ọgbaghara pụtara ebe ahụ na mgbede Tọzde.
Akụkọ na-ekwu na otu onye ọgbatumtum ji mma sụgbuo nwata akwụkwọ so na ndị nchekwa Mahadum ebe ahụ.
Ozi anyị nwetara kwuru na onye ọrụ nchekwa aha ya bụ Chinagorom Marvellous Kingsley aha bụ onye ji ọkwa Man O’ War 10(2) ma bụrụkwa nwataakwụkwọ nọ n’ogo nke anọ (400L) na ngalaba ọmụmụ ihe ‘School of Agriculture and Agricultutal Technology’ na mahadum FUTO nwụrụ mgbe a sụrụ ya mma.
Ọ bụ n’ụbọchị Tọzde 29 Febụwarị, 2024 ka a magburu onye ọrụ nchekwa ahụ dịka ọ na-akpagharị n’okpuru akwa mmiri dị na mahadum FUTO n’oge abalị.
E bugara ya n’ụlọọgwụ mahadum ahụ ma sitezie ebe ahụ bugaa ya n’ụlọọgwụ Federal University Teaching Hospital Owerri bụ ebe a nọọrọ kwupụta ya dịka onye nwụrụ anwụ.
N’oge anyị kpọtụụrụ onyeisi na-ahụ maka ime njem nke otu jikọtara ụmụakwụkwọ na mahadum FUTO bụ Maazị Emetu, ọ sịrị na “a magburu onye ọrụ Man O’ War na mahadum FUTO mana nnyocha ka na-aga n’ihu iji chọpụta ihe kpatara nke ahụ.”
N’okwu nke ya, osote onyeisi ụmụakwụkwọ nke ngalaba ọmụmụ ihe ‘School of Biological Studies’ bụ Sommy kwuru na “ọ bụ eziokwu na e gburu onye ọrụ Man O’ War na mahadum FUTO, a nụkwara m na e nwere ebe a lụrụ ọgụ na mahadum anyị n’anyasị ụnyaaahụ. E nweghị ọmụmụ ihe na-aga n’ihu ugbua na mahadum anyị n’ihi na ụjọ ji ụmụakwụkwọ dịkwa ka ha na-eche ka ndị isi mahadum anyị gwa ha okwu.”
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Imo state Police
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Henry Okoye ziputekwara ozi na ọ bụghị ndị Hausa maọbụ Fulani mara nwata akwụkwo ahụ mma.
N'ozi ahụ, ọ kwuru na ọ bụ nwata akwụkwọ ọzọ si na mahadum Imo steeti aha ya bụ Francis Marvellous bụ onye mara ibe ya mma dịka ha na-ese okwu.
"Anyị zọpụtara ya dịka ndị mmadụ na-anwa iti ya ihe maka onye nwụrụ anwụ.
"E bugala ozu onye nwụrụ n'ụlọ nchekwa ozu dị n'ụlọọgwụ gọọmentị etiti bụ FMC dị n'Owerre" ka ozi ya kwuru.
Okoye kwuru na ọ bụ ndị aghụghọ na-ekesa akụkọ na-ekwu na ọ bụ ndị Hausa Fulani gburu nwata akwụkwọ nwụrụ anwụ.
Ha kwukwara na nyocha ka na-aga n'ihu.









