Etu nwaanyị dị ime si tụtuo di ya site n'ụlọelu n'Ebonyi Steeti

Nwaanyị dị ime

Ebe foto si, BBC

Mkpamkpa mere n’Abakaliki bụ isiobodo Ebonyi Steeti dịka otu nwaanyị dị ime si n’ụlọelu ogogo abụọ ma kwatuo di ya maka nghọtahie ha nwere n’ezinaụlọ.

Otu onye hụrụ ka ihe a siri mee kọwara na o mere n’ụtụtụ ụbọchị Tuzde mgbe nwaanyị ahụ dị ime kwaturu dị ya a kpọrọ Nwoga Maduabuchi site n’ụlọelu ahụ.

Akụkọ kwuru na nwamadị a bụ onye obodo Akparata nke Igbeagu dị n’okpuruọchịchị Izzi ebe nwunye ya ahụ bụ nke abụọ si n’obodo Uburu nke okpuruọchịchị Ohaozara dịcha n’Ebonyi Steeti.

Otu onye ọrụ nchekwa ọdịnala na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntaakụkọ BBC na nwoke ahụ na nwunye ya nke abụọ ahụ nọ na-arụrịtaụka banyere ezinaụlọ mgbe nke a mere.

Nwaanyị si n'ụlọelu tutuo di ya n'Ebonyi Steeti

“nwoke a bụ onye dabara na nsogbu mwakpo ime ezinaụlọ”

“Ọ lụrụ nwaanyị abụọ, ha nọ na-arụrịtaụka mgbe nwunye ya nke abụọ kwara ya aka o si n’ụlọelu ahụ daa ma nwụọ.”

Onye ọzọ kwuru na nke a abụghị mbụ ya na nwunye ya na-enwe nsogbu, na ọ bụ ihe na-eme kwa mgbe kwa mgbe.

Ndị uweojii Ebonyi Steeti ekwubeghi ihe ọbụla banyere nke a, onye ntaakụkọ BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ha bụ Ukandu Joshua ugboro ugboro mana ọ zaghị ekwentị ya.

Akụkọ ka na-abịa ...