Etu nna si gbagbuo nwa ya nwoke maka esemokwu metụtara nri n'Abia steeti

Ebe foto si, Screengrab
Ndị uweojii Abia steeti anwụchiela otu nwoke maka ebubo na ọ gbagburu nwa ya nwoke maka nri.
Theophilus Udeh, gbara afọ 70 , onye Eziama Lokpaukwu dị n' Okpuru Ọchịchị Umunneochi n'Abia Steeti, gbagburu nwa ya nwoke n'iwe.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na nwa ya nwoke bụ Sunday Udeh batara , banye n'usekwu ha, buru nri e dofọro n'ite, rie.
Nke a kusuru nna ya bụ onye were iwe na ọ nataghị ya ikike tupu ọ ga buru nri ahụ, ọ banyere n'ime ụlọ ya bute agba gbagbuo nwa ya nwoke.
Ndị obodo gbakọrọ nwuchi Maazị Udeh ma kee ya agbụ tupu ndị uweojii abịa nwụrụ ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia steeti bụ Maureen Chinaka gwara BBC igbo na akụkọ ọnwụ nwata nwoke ahụ bụ eziokwu.
O kwuru na ogige ndị uweojii ngalaba Umunneochi nwetara mkpesa banyere ya, ha gara nwuchie nwoke ahụ , buga ozu nwa ya ụlọozu maka nnyocha ihe gburu ya.
O kwukwara na ha ewegala okwu ahụ na ngalaba ha na-enyocha mpụ a kpọrọ SCID(state Criminal Invesigation Division) n'ịchafụ.
"N'abalị 26 nke ọnwa Febụwarị, anyị nwetara ozi site na ogige Ndịuweojii Ngalaba nke Umunneochi na otu nwoke bụ Theophilus Udeh gbara afọ 70, onye Eziama Lokpaukwu dị n'Umunneochi gbagburu nwa ya nwoke bụ Sunday Udeh, gbara afọ 27."
"Ka e nwetara ozi ahụ , ndị nnyocha si ngalaba Isuochi gara ebe ihe mere buru ozu dọnye n'ụlọozu maka nnyocha."
"E nwetakwara ighe aka ebe ma nwuchie onye a na-enyo maka ihe mere."















