Onitsha building collaspe: "Amaghị m na ụlọ anyị nọ n'ime ya na-ada ada ruo mgbe m hụrụ onwe m n'ime ụvụrụ aja"

Aha onyonyo, Onitsha building collaspe: Anọ m n'ime ụlọ ahụ mgbe ọ dara ma dagide mụ na ndị ọzọ

Ụfọdụ ndị zọrọ ndụ n'ụlọahịa ahụ dara ada bụ gọọmentị Anambra Steeti na-arụ n'Ochanja dị n'Onitsha akọwaala ihe ha gabigara mgbe ụlọ ahụ dakwasịrị ha.

Otu n'ihe ha kwuru na ọ rụchaala ọrụ na mgbede ụbọchị Mọnde ahụ, n'ihe dịka ọkara gafee elekere isii mana ọ ka nọ n'ogogo otu nke ụlọelu ahụ.

O kwuru na ọ malitere na-anụ mkpọtụ, ọ maghị na ọ bụ ụlọahụ ọ nọ n'ime ya bụ ihe na-ada mana tupu ọ mata ụlọahụ adakwasịla ya na ndị ọzọ.

O kwuru na ọ nọrọ ebe ahụ ihe dịka nkeji iri na ise na-eti mkpu tupu ndị mmadụ abịa zọpụta ya.

Ụlọahịa dara n'Ochanja, Anambra Steeti

Onye nke ọzọ kwuru na ọ nọ n'elu elu ụlọ ahụ na-anụ mkpọtụ ndị mmadụ, o chere na ọ bụ ọgụ ka a na-alụ ọ maghị na ụlọ na-ada.

O kwuru ihe zọrọ ya ụfọdụ ndị ndụ bụ na ha nọ n'elu elu ụlọ nke mere na ụlọelu adakwasịghị ha.

O kwuru na ọ gaghị agụtanwu ọnụọgụgụ ndị nọ n'ụlọ ahụ mgbe ọ dara kama na ha nwereike iru iri ise.

Anya hụrụ ka ihe a siri mee kọwara na ha na-ere ahịa n'akụkụ mgbe ha rụrụ ụda dịka 'ke ke ke ke' tupu ha mara ihe na-eme, ụlọ ahụ adaala.

Ụlọ a dara n'ahịa Ochanja gburu ihe ruru mmadụ isii ma merụọ ihe karịrị mmadụ iri abụọ na isii ahụ.

A ga-ata 'contractor' na-arụ ụlọahịa ahụ ahụhụ - Gọọmentị Anambra

Gọọmentị Anambra Steeti ekwuola na onye ọrụ ngo na-arụ ụlọahịa anataghị akwụkwọ ikike tupu ọ malite ịrụ ya nke socha mee ka ụlọahịa daa.

Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ bụ Ifeanyi Okoma gwara BBC Igbo nke a n'ekwenti ma sị na onye ọrụ ngo ahụ na-anata ntaramahụhụ ruuru ya ma e mechaa nyocha.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị gọọmentị nwe ụlọahịa ahụ a na-arụ ọhụrụ na ọ bụ mmadụ nkiti nwe ya na aka gọọmentị adịghịkwa na ya.

Okoma kwuru na ọdachi ahụ bụ ihe nwute na anyammiri na ọ bụ mere gọọmentị jiri kpebie ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ ndị niile merụrụ ahụ na ya.

Otu onye nọ n'okpuru ụlọ dara kpọrọ ezinaụlọ ya n'ekwentị na ọ ka dị ndụ

Ulo ochanja dara

BBC Igbo achọpụtala taa na o nwere ndị ka dị ndụ n'okpuru ebe ụlọ dara n’ahịa Ochanja dị n'Anambra steeti.

Nke a pụtara ihe dịka anyị laghachiri n'ebe ahụ ima ihe na-eme were nụ na oke igwe gọọmenti ji eme nchọpụta bụ Caterpillar nọ ebe ahụ achọ otu nwoke a sị ji ekwentị kpọọ ụmụnne ya na ọ ka dị ndụ.

Ọ gwara ha na ọ nọ n'okpuru ebe ụlọ dara dị n'akụkụ ebe igwe ọkụ latrik bụ 'Transformer' dị.

Ndị nọkwa ebe ihe mere kwuru na azọpụtara otu nwoke ọzọ na mgbede ụnyaahụ mana ụkwụ ya abụọ site n'ukwu ya alaala. 

Cheta na ọnụọgụgụ gọọmentị wepụtara kwuru na mmadụ isii nwụrụ ebe mmadụ iri na abuo merụrụ ahụ 

Gịnị mere ụlọ ji daa?

Ebe ahu ulo dara

Otu onye bụ ọkachamara n'ịrụ ụlọ bụkwa onyeisi otu jikọrọ ndị na-arụ ụlọ n'Anambra steeti aha ya bu Kingsley Nweke kọwara ihe mere.

Nweke kwuru na ihe ndị so me ka ya bụ ụlọ daa bụ etu e si rụ ya ngwa ngwa. 

Ọ sị na ụlọ ahụ ekwesighi ị nọ n'ogogo ebe ọ nọ ugbua tupu ọ daa.

Ihe ọzọ ọ rụrụ aka bụ na ekweghị ka aja na simenti agwakọrọ kọọ ọfụma tupu amalite ịrụ ụlọ elu n'elu ya.

Igwe a na-akpọ rọdụ eji rụ ụlọ bụ ihe ọzọ nwoke ahụ kwuru butere ọdịda ụlọ ahụ.

Ọ sị na ọ bụghị nke ezigbo ya tozuru ogo ụlo ahụ ka eji rụ ya. 

Onitsha Building Collapse: Ọrụ gbatagbata akwụsịla ebe ahụ agbanyeghi na ndị mmadụ nwereike ka tọrọ n'okpuru

Aha onyonyo, Ọrụ gbatagbata akwụsịla n'Ọnitsha

BBC gara leta ebe ụlọelụ ato dara n'Idu Igbo ahịa Ọchanja dị n'Ọnịcha Anambara steeti ịma etu ọrụ gbatagbata si aga mana anyị chọpụtara na ọrụ akwụsịla ebe ahụ.

Anyị hụrụ igwe 'escavator' anọ n'ebe ahụ mana ọ nweghi nke nọ ọrụ, ma o nweghikwa nke mmadụ nọ n'ime ya.

Anyị ahụkwa ndị ọrụ gbatagbata National Emergency and Management Agency ọbụla ebe ahụ.

Nke a bụ agbanyeghi na mmadụ nwereike ka tọrọ n'ime uzuzu ụlọ ahụ dara.

Anyị gbara onye ozi goomentị bụ Christian Aburime ajụjụọnụ gbasara nke ahụ mana o kwuru na ọrụ gbatagbata ga-abịghachite.

Mmadụ isii anwụọla n'ụloelu dara n'ahịa Ọchanja n'Onitsha

Aha onyonyo, "Ihe bụ a bụ ihe ịgba anya mmiri" - Soludo

Aka na-achị Anambara Steeti bụ Charles Soludo enyela iwu ka igwe niile e ji egwu ala dị n'Anambara gaba n'ahịa Ọchanja n'Ọnịcha ebe ọtụtụ ndị mmadụ tọrọ n'ime uzuzu n'ụlọelu dara n'ahịa ahụ ụbọchị Mọnde.

Soludo kwuru nke a oge ọ gara ileta ụdirị mbibi mere ebe ahụ ụbọchị Tuzde.

N'okwu ya, "agwala m kọmịshọna ọrụ ka o buta igwe 'escavator' niile di n'Anambara, site n'amara Chukwu, anyị ga-agbapụta mmadụ niile ka nọ n'ime ebe ahụ tupu chie ejie taa".

Ndị nọ oge ihe ahụ mere kwuru na ọrụ na-aga n'ihu ebe ahụ ụtụtụ, ehihie na abalị.

N'okwu gọvanọ Soludo, "anụrụ m na ọ bụ ndị ọrụ onye na-arụ ụlọ ahụ gụnyere ndị na-arụ ọrụ abalị bụ ndị tọọrọ n'ime uzuzu ahụ, ihe a na-agba anya mmiri"

Aha onyonyo, Ụlọ dara n'ahịa Ochanja n'Ọnịcha

Ụloelu atọ n'ime ụlọahịa 'plaza' ise a na-arụ n'ahịa Odu Igbo n'Ochanja dị n'Ọnịcha n'Anambara Steeti adara na mgbede ụbọchi Mọnde abalị 26 ọnwa Febuwarị.

Ndị ọrụ gbatagbata National Emergency Management Agency NEMA agbapụtala mmadụ iri abụọ ebe mmadụ isii nwụrụla anwụ.

E burula mmadụ iri abụọ na isii ndị ahụ gaa n'ụlọọgwụ nakwa n'ụlọozu.

Ọtụtụ ndị mmadụ ka tọrọ n'okpuru uzuzu ahụ ebe ndị ọrụ gbatagbata ka na-aga n'ihu ịgbapụta ha.

Ụlọelu ahụ bụ ndịisi ahịa ọchanja nyere otu onye na-arụ ụlọ ọrụ ahụ.

Ebe ulo dara

Ebe foto si, ABS Awka

ụloelu dara

Ihe Gọọmentị Anambara kwuru

Soludo

Ebe foto si, Anambra Goomenti

Aka na-achị Anambara Steeti bụ Chukwuma Charles Soludo agaala leta ụdị mbibi mere ebe ahụ ụlọelu dara n'ahịa Ọnịcha.

O bere arịrị n'ụdị mkpamkpa kpara ebe ahụ ma kwuo na ụdị ihe ahụ ekwesighi ime.

N'okwu ya, "aga m agba m mbọ hụ na ndị na-arụ ụlo adigboroja ga-anata ntaramahụhụ so ya."

Ọ gara n'ihu kwuo "ndị rụrụ ụlo adịgboroja a ga-eji aka ha bịa kutuo ụlọọrụ adịgboroja ha rụrụ".

Anyị ka na-ewetara gị akụkọ a dịka ọ na-aga n'ihu.