Corpse kidnappers: Ndị na-ebula ozu a tọọrọ ka nọ n’aka ndị ntọ

Igbe ozu na ndị nọ ụlọọnwụ

Ebe foto si, Collins Ugwuanyi

Taa mere ya ụbọchị anọ ndị na ebụna ozu atọorọ n’Enugwu steeti ga-anọ n’aka ndị ntọ ha.

Cheta na ebe ezinaụlọ na ụfọdụ mmadụ na-ebuna Israel Ugwuanyi nwuru anwu mgbe ndị ntọ tọọrọ onye ọkwọ ụgbọala bu ozu ya nakwa mmadụ abụọ ndị ezinaụlọ ya so ozu ya.

Ndị ahụ si Legọs ala Enugwu iga li Ugwuanyi n’ụbọchị Mọnde bụ abalị ịrị na ịtọọlụ nke ọnwa Febụwarị, 2024.

Oto onye achọghị ka akpọ aha ya na ezịnaụlọ ahụ kwuru “taa mere ya abalị anọ ha nọ na aka ndị ntọlị”.

“Anyị anụbeghị ịhe nwere ịsị n’aka ndị ụweọjịị ma ọ bụ gọọmentị” ka o kwukwara.

Ndị ntọ atọọrọ ozu na ndị na-ebula ya? Lee ihe anyị ma maka ya

Igbe ozu na ndị nọ ụlọọnwụ

Ebe foto si, Collins Ugwuanyi

Akụkọ na-efegharị na soshal midia kwuru na a tọọrọ ozu otu nwoke na ndị be ha na-ebula ozu ya obodo ha bụ Ameze Owerre, Umabor dị n'okpuru Ọchịchị Nsuka na 'Ninth Mile' Enugwu ụbọchị Monde.

Israel Ugwuanyi, gbara afọ 5o, bụ ojiegoachụ ego nwụrụ n'ụbọchịụka, ndị ezinaụlọ ya ebulawa ozu ya mana ha danyere n'aka ndị ntọ ndị tọọrọ ụmụnne ya abụọ na ọkwọụgbọala kwọ ha, dịka nwana ya nwoke si gwaa BBC Igbo.

Kemgbe akụkọ ahụ dapụtara, ụfọdụ na-ekwu na a tọọrọ ozu nakwa ndị na-ebula ya, ebe ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ naanị ndị na-ebula ozu ka a tọọrọ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mana lee ihe anyị chọpụtara:

Nwanne Israel bụ Collins Ugwuanyị gwara BBC na nwane ya nwoke na-azụbu ahịa ọkwụ n'Anambra steeti tupu ihe siwere ya ike ọ gbagote Legọs ịchụ nta ego. bụ ebe ọ dara ọrịa.

“Na Legọs ka o nwere ọrịa mkpọnwụahụ ihe dịka afọ ise gara aga. Ọrịa dara ya ụbịam mee ka o ree ihe nịle o nwere.

“N' ụbọchịụka ka a kpọrọ m gwa m na ọrịa ya na akawaye njọ. ihe dịka isi ụtụtụ pụtara Monde ka a kpọrọ m gwa m na ọ nwụọla”.

“Maka na ọ rịala ọrịa ahụ oge ogologo oge, anyị agbaazụ ka ebulata ya lie”.

“Mgbe ikpeazụ m na umunwanne na-ebulata kpara ha ekwentị, ha agwa m na ha na etinyezị isi ebe 'Oji River'”.

"Nwanne m ọzọ bụ Boniface kpọrọ m sị na ya na-akpọ Sunday nke sọ na-ebulata ozu ahụ mana ha adịghị aza ekwentị ha, ma sị m kpọọ ha.

"Akpọrọ m Sunday ugboro ugboro mana ọ zaghị m”.

Nwantịtị oge, “Mmadụ ejiri ekwenti Sunday akpọghachị m azụ, sị na ya bụ onye agha gwa m na ọ dịka Sunday ha adabara n' aka ndị omekome."

" M jụọ onye ahụ ebe e ka o nwetara ekwentị ahụ, ọ sị na ọ bụ n'ime ụgbọala bụ ozu nwanne nwoke m ka o nwetara ekwentị ahụ, na ha hụrụ ụgbọala na ebụlata ọzụ ebe ha nọ, ọ sị na ha ahụghị ha.”

“Akpọghachịrị m ha azụ, jụọ na ha apụtala maka na-eche m na o nwere ike ọ bụrụ na ha gara mpọsi n’ ime ọhịa, mana onye agha ahụ sịrị mba.

Ọ gwara m ka m bịa n' Umuokar ebe adọbara ozu ahụ nakwa ụgbọala bụ ya.

Agwara m ya ka ha buru ozu ahu bugara ndị uweojị, mana ndị uweoji ekweghị anabata ọzụ ahụ."

"M riọrọ ndịagha ahụ ka ha buru ozu ahụ buga n' ụlọọzụ dị nso ka m bịa echi bi mara n’ ọkwa nwanne m."

"O mechara kpọọ m ka m na onye na-elekọta ozu n' ụlọọzụ kwuo, ebe m nọ gwa ya ka ọ nabata ọzụ nwanne m na m ga abịa echi."

“N'ụbọchị Monde ka m gara were hụ na ọ bụ nwanne m nwoke n' eziokwu.

"Anyị aga hụ ndịagha ahụ nata ha akwụkwọ akaebe ndị ọrụ na ụlọọzụ nyere ha jịrị nabata ọzụ nwanne m nwọke nakwa ekwentị nwanne m nwoke”.

“Anyị jekwara na ụlọ ndị ụweọjị kọwara ha ịhe mere ma gwa ha na anyị chọrọ ịbụrụ ọzụ ya ga rịe maka ọrịala ọrịa kengbe. Ha kwere ma anyị ebulu ọzụ ya laa”

“Ugbua m na gị na ekwu ọkwụ, anyị na eme ka adọnyị ya na ala”

N'okwu ndị a tọọrọ, Collins kwuru sị, “Mmadụ atọ ka a tọọrọ. Ha bụ nwanne m nwoke na nwanne nwaanyị nakwa ọkwọụgbọaala bu ha.”

'Anyị enweghị ọgba-aghara ezinaụlọ'

Collins Ugwuanyi gwara BBC Igbo na ha enweghị esemokwu ezinaụlọ dịka ụfọdụ sịrị kwuo nwere ike ịkpata ndị ntọrị ịtọrọ umunne ha na-ebunala ọzụ.

O kwuru nke a n'ihi ụfọdụ na-ekwu na o nwere ike ịbụ ọgbaghara ezinaụlọ mere ka ya bụ ihe dapụta.

Collins kwuru, “Anyi eburu ozu ya sị na Legọsị na-abata Enugwu, anyi kwụrụ narị puku abụọ (N200,000.00).

Ọ bụrụ na-anyị na-ese ọkwụ, anyị aga na-ezigara ha ego na Legosị ka o rie ihe maọbụ gbakọ ọnụ zị ga egọ ejiri ebụlata ya Enugwu?”

Ihe ndị uweojii kwuru

Mgbe BBC Igbo kpọrọ Charlse Ndukwe bu ọnụ na ekwuru ndị uweojii na Enugwu steetị maka akụkọ ahụ, ọ kwụrụ na ndị ntọrị tụhapụrụ ozu ma tọrụ ndị sọ ọzụ ahụ.

Ndukwe kwuru na kọmịsịona ndị uweoji na Enugwu enyeala ịwụ ka enyọchaa ịhe mere ma gbakwunye na ndị ụweojị enwetala ọzụ ahụ.

Na okwu ya “anyị amaghị maka akụkọ na atọọlụ ọzụ, enweghị ịhe dịka ya; ma enwere ndị na ebunata ọzọ dabara n’ aka ndị ntọrị”.

“Anyị amachaghị ịhe nịle gbasara ịhe a mere, ma na ịmaala na ịtụlee mkpaghara obodo anyị sị na Naịjirịa ọtụtụ ịhe nwere ịke ịkpata ịhe mere. Mana achọghị m ịhe ọ ga abụ m kwụọ ọ mebịe nyọchaa ana eme ụgbụa”.

“Anyị na etinye anya na ndị asịrị na atọọlụ, CP enyeala ịwụ ka enyochaa ịhe a mere”.

O kwuru n’ ya ama-nkwu ọtụtụ okwu maka na-ana eme nyocha gbasara ya. Ma tinyekwa na akụkọ ahụ edọchebeghị anya.