Ahụrụ m ka ọtụtụ ụmụokorobịa jidere nwanne m, were mma gbuo ya – nwanne Stanley Obilor

Ebe foto si, BBC, Barr. Clement Asoluka
Ụfọdụ ndị ezinaụlọ na ndị obodo akwaala arịrị gbasara ọnwụ Stanley Obilor, onye e gburu ka o nwetechara mmeri na ntuliaka ndị ntorobịa haziri n'Umusi/Olokwu Emeabiam dị n'okpuruọchịchị Owerri West n'Imo steeti.
Innocent Obilor bụ odeeakwụkwọ kọmitii haziri ntuliaka ahụ ma bụrụkwa nwanne Stanley gosiri enweghị obi ụtọ maka ogbugbu e gburu nwanne ya.
Oge ọ na-akọwa ka ihe siri mee, ọ sịrị na ya hụrụ ka ọtụtụ ụmụokorobịa wakporo nwanne ya nwoke ma were mma gbuo ya dịkwa ka ha mebiri ụlọ ha nakwa ụlọ ndị ọzọ dị ebe ahụ.
"Oge anyị rutere ebe ọ tọgbọrọ, anyị mere ngwangwa bugaa ya ụlọọgwụ mana ọ bụ ebe ahụ ka ha nọọrọ kwuputa ya dịka onye nwụrụ anwụ," ka Innocent Obilor kwuru.
Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka Gọọmenti Imo steeti nyere ha aka inweta ikpe ziri ezi maka nwanne ya nwoke e gburu egbu.
Ọkaiwu ji okwu ahụ bụ Barr. Clement Asoluka jiri obi mwute kọwaa ọnọdụ ahụ ma kwuo na onye niile na-agba mbọ ugbua iji hụ na ndị niile mere arụ ahụ natara ntaramaahụhụ kwesịịrị ha.
Ọ sịrị na kọmịshọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Aboki Danjuma na ndị otu ya azọbatala ụkwụ n'okwu ahụ ma kwe nkwa na ha ga-eme ihe niile dị ha n'aka iji nye Stanley Obilor ikpe ziri ezi.
Ọgbaaghara dara n'abalị 3 Jenụwarị 2025 oge e kwuputachara Stanley Obilor ka onye meriri ntuliaka ndị ntorobịa a haziri n'Umusi/Olokwu Emeabiam dị n'okpuruọchịchị Owerri West n'Imo steeti.
Ndị uweojii kwuru na ọ bụ ngalaba otu nke Chinaza Nwachukwu nọ n'isi ya tinyekwara ndị nke ọzọ gbara ọsọ ka a na-enyo enyo aka ha dị na mwakpo ahụ.
Etu e siri gbuo onyendu ndị ntorobịa n'Emeabiam dị n'Imo steeti

Ebe foto si, Imo State Police Command
Akụkọ kwuru na e gburu onye ndu ndị ntorobịa aha ya bụ Stanley Obilor n'obodo Umusi/Olokwu Emeabiam dị n'okporo ọchịchị Owerri West n'Imo steeti.
Dịka akụkọ ahụ siri kwuo, e gburu Stanley Obilor mgbe a wakporo ụlọ ha n'abalị Satọde 15 Maachị 2025.
E kwuru na e gburu onye ndu ndị ntorobịa ahụ, merụọ ụmụnne ya anọ ahụ ma gbaa ụlọ itoolu ndị ọzọ ọkụ n'obodo ahụ.
Nnyocha mbụ e mere gosiri na ọgbaghara malitere mgbe ndị ntorobịa mechara ntuliaka n'abalị 3 Jenụwarị, 2025 bụ nke e kwuru na ọ bụ Stanley Obilor nwetara mmeri na ya.
A sị na ọ bụ ndị si n'otu nke onye ndu ha bụ Chinaza Nwachukwu na mmadụ ndị ọzọ ndị uweojii kwuru na ha gbara ọsọ ka a na-enyo enyo na ọ bụ ha wakporo ezinaụlọ Stanley Obilor.
Kedụ ihe ndị uweojii kwuru banyere ọnwụ Stanley Obilor?

Ebe foto si, Imo State Police Command
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Kọmishọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Aboki Danjuma katọrọ ogbugbu e gburu Stanley Obilor ma sị na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya.
Aboki Danjuma na ndị ọrụ ya gara n'obodo ahụ iji were anya ha hụrụ ihe mere na ihe ndị mebiri emebi.
Ọ kasiri ezinaụlọ e gburu onye ha obi tinyekwara ndị nke ụlọ ha gbara ọkụ mgbe e mere mwakpo ahụ.
O kwere ha nkwa na ụlọọrụ ya ga-agba mbọ ịhụ na e nwetara ikpe ziri ezi ma gbochie ụdị ọgbaghara ahụ ime ọzọ.
Ozi si n'aka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Henry Okoye kwuru na ndị uweojii anwụchiela mmadụ anọ ndị a na-enyo enyo na aka ha dị n'ihe mere onye ndu ndị ntorobịa ahụ bụ Stanley Obilor.
O kwukwara na ndị uweojii amalitela ime nnyocha iji chọpụta ihe mere dịka ha na-agbasi mbọ ike ịhụ na a nwụchiri ndị ọzọ a na-enyo enyo gbara ọsọ.
Okoye kwuru na etinyela ozu onye ahụ nwụrụ anwụ n'ọbaozu ebe ndị merụrụ ahụ na-anara ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.
N'aka nke ọzọ, Kọmishọna ndị uweojii gwara ọhanaeze na e weghachila ọnọdụ udo n'obodo Umusi/Olokwu Emeabiam dịka ha tinyere usoro nchekwa iji gbochie ọgbaghara ọzọ.

Ebe foto si, Imo State Police Command









