Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka mgbọ egbe Fada a sị gburu nwaokorobịa
Ụfọdụ mmadụ ekwuola okwu gbasara nwaokorobịa a sị mgbọ egbe Fada gbagburu ụbọchị a na-akwado ịka ụka e ji achụ afọ.
N'ihe onyonyoo a, nna nwaokorobịa mgbọ tụtara n'olu bụ Maazị Godwin kwuru na nwa ya nọ n'ụlọọgwu kemgbe mkpụrụ ụbọchị abụọ.
Ọ rịọrọ gọọmenti ka ha gbatara ya na ezinaụlọ ya ọsọ enyemaka.
Otu onye obodo ahụ bụ Maazị Onyebuchi kọwaara anyị ihe ọ nụrụ na nakwa nke o ji anya ya hụ n'abalị ahụ ya bụ njinji jiri.
Ọ sịrị na enweghị onye ọbụla obi dị mma gbasara ya bụ ọnọdụ ma kpọo oku ka ndị uweojii mee ihe kwesịrị ekwesị gbasara okwu ahụ.
Fada Joseph Enyinnaya a sị gbagburu nwata nwoke n'Imo steeti nọ n'aka ndị uweojii ugbua

Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha amalitela ime nnyocha iji chọpụta nke bụ eziokwu n'akụkọ na-ekwu na Fada Joseph Enyinnaya, gbagburu otu nwata nwoke oge a na-enwe ụka afọ ọhụrụ nke 2025, n'Amaimo dị n'Imo steeti.
Ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Henry Okoye kwuru na ndị uweojii ga-akọwara igwe mmadụ ihe ha chọpụtara n'akụkọ juru onye ọbụla anya.
Cheta n'akụkọ kwuru na Fada Joseph Enyinnaya bụ Fada ụlọụka St Columbas's Catholic Parish, dị n'Amaimo dị n'okpuru ọchịchị Ikeduru, Imo steeti, jiri egbe gbagbu nwata nwoke ahụ oge a na-aka ụka iji nabata afọ ọhụrụ n'abalị 31 Disemba 2024.
A na-ekwu na nwata nwoke ahụ na-agba ngwa ọkụ n'ime ụlọụka oge Rev. Fada ahụ nwere egbe gbagbu.
Ihe meberede ahụ tinyere ndị obodo ahụ na-gbagharịa nakwa iru uju.

Oge BBC Igbo gara ebe iji nụta ọnụ mmiri okwu ndị obodo ahụ, ndị gwara anyị okwu kọwara na ha nụrụ maka njiji ahụ oge ha na-akwado ụka n'abalị ụbọchị ahụ.
Ha kwuru na otu onye ọzọ meruru ahụ oge ihe ahụ mere nọ n'ụlọọgwụ ugbua enweta nleta.
Nna onye ahụ meruru ahụ bụ Mazi Godwin kwuru na "Anọ m n'ụlọ m oge a gwara na nwa nwoke meruru ahụ maka mgbọ egbe tụrụ ya, ọ bụ nwunye m gara ụlọọrụ ndị uweojii mee mkpesa banyere ọdachi ahụ".
Otu nwaanyị gwara BBC Igbo okwu na-achọghị ka a kpọ aha ya, kọwara na nwaamadị ahụ nwrụrụ abụghị onye obodo ha maọbụ onye Imo steeti.
"Nwaamadị ahụ bụ onye steeti ọzọ bịara ịrụrụ mmadụ ọrụ n'obodo anyị", ka nwaanyị ahụ kwuru.
Oku ha na-akpọ bụ ka e mee ezi nnyocha iji chọpụta ihe butere ụdịrị ọdachi a.
Anyị ga-aga n'ihu na-ewetara gị akụkọ dịka ọ na-apụta.
Mana ka ọnọdụ dị ugbua, anyị nụrụ na ụkọchukwu ahụ nọ n'aka ndị uweojii.










