Ndị a ma ama nwụrụ n'afọ 2024

Ebe foto si, Emmanuel Iwuanyanwu, Onyeka Onwenu, John Ikechukwu Okafor, Ogbonnaya Onu, Junior Pope na Ifeanyi Ubah/Instagram/Facebook
Obumneme Odonwodo 'Junior Pope' - Omee ejije Nollywood

Ebe foto si, Junior Pope/Instagram
Junior Pope nwụrụ n'Asaba n'ihe mberede ụgbọmmiri ụbọchị Wenezde, 10 Eprel, 2024 ka ọ gbara afọ 43.
Ozi ikpeazụ Junior Pope hapụrụ n'akara soshal midia Instagram n'ụtụtụ Wenezde tupu ọdachi ahụ emee bụ nke gosiri ebe ya na ndị ogbo ya nọ n'ụgbọ mmiri na-eme njem.
Nwa amadi ahụ gbara ama na ha na-eme ejije n'elu mmiri na-ejighị ihe nchekwa Bekee kpọrọ 'life jacket' kwuo sị, "Lee etu anyị si etinye ndụ anyị n'ihe oke egwu iji wetara ụnụ ihe obiụtọ."
E liri ya ụbọchị Fraịde 17 Mee 2024 n'obodo ya dị n'Ukehe, Nsukka dị n'okpuruọchịchị igboetiti, Enugwu steeti.
Emmanuel Iwuanyanwu - Onye na-egwu ndọrọndọrọọchịchị ma bụrụkwa onye ngwa ahịa

Ebe foto si, Emmanuel Iwuanyanwu/Facebook
Emmanuel Iwuanyanwu nwụrụ dịka ọ gbara afọ 82.
Tupu ọ nwụọ, ọ bụ onyeisi Ohanaeze Ndịgbo.
Iwuanyanwu banyere n'ọkwa ọchịchị Ohaneze Ndịgbo dịka onye nọbu n'ọkwa ahụ bụ George Obiozor nwụrụ n'afọ 2022.
Otu ndị okenye nke Ohaneze Ndigbo a na-akpọ 'Imeobi Ohaneze' họpụtara ya ma duo ya n'iyiọrụ n'ụbọchị 30 nke ọnwa Eprel afọ 2023.
Ifeanyi Ubah - Sinetọ nọchịrị Anambra Saụt

Ebe foto si, Ifeanyi Ubah/Facebook
Sịnetọ na-anọchiteanya Anambra Saụt n'ụlọ omeiwu Sinet Naịjirịa bụ Ifeanyi Ubah nwụrụ ụbọchị Satọde 27 Julaị 2024 ka ọ gbara afọ 52 na London.
Ifeanyi Ubah bụ onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti n'otu pati All Progressive Congress, APC na ntụliaka a ga-eme n'afọ 2025.
O so na ndị na-akpọ oku ka gọọmeti etiti tọhapụ Mazi Nnmadi Kanu mana ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ ya na-ekwu na aka ya dị na nwuchi a wuchiri Nnamdi Kanu.
N'ọnwa Septemba 2022, ndị oji egbe wakporo ụgbọala Ifeanyi Ubah ma gbuo mmadụ ise ndị ọrụ ya na mpaghara Nkwo Enugwu-ukwu dị n'okpuruọchịchị Njikoka.
Olili ozu Sịnetọ Ifeanyi Ubah kpọtụrụ ụbọchị Fraịde, 22 Nọvemba, 2024 na be ya dị n'Umuanuka, Otolo Nnewi dị n'Anambra steeti.
Onyeka Onwenu - Ọgụụ egwu a ma ama

Ebe foto si, Onyeka Onwenu/Instagram
Otiegwu a ma ama na Naịjịrịa bụ Onyeka Onwenu nwụrụ dịka ọ gbachara afọ iri asaa na abụọ (72yrs).
Akụkọ kwuru na nwada a nwụrụ n'abalị ụbọchị Tuzde 30 Julaị, 2024 mgbe ọ dara n'ala dịka o tichara egwu n'otu emume ncheta ọmụmụ mmadụ e mere na Legọs.
A mụrụ Onyeka Onwenu n'abalị 31 Jenụwarị 1952 n'Arọndịzuọgụ dị n'Okpuru ọchịchị Ideato North n'Imo steeti.
Ọ mụrụ ụmụ abụọ ndị gụnyere Tijani Ogunlende na Abraham Ogunlende.
Ọ malitere iti egwu n'afọ 1980 ma tipụta egwu nke mbụ ya ọ kpọrọ "For the Love of You" n'afọ 1981.
Onyeka Onwenu mere ọtụtụ ejije ndị gụnyere Nightmare, Conspiracy, Widows' Cot, The Tyrant, Rising Moon, Half of a Yellow Sun, Lion Heart, God Calling, Ọbara M na ndị ọzọ.
E liri ozu ya ụbọchị Fraịde 30 Ọgọst, 2024.
Ogbonnaya Onu - Aka chibụru Abia Steeti

Ebe foto si, Ogbonnaya Onu/Instagram
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onye bụbu Mịnịsta Sayensi na Nka na ụzụ bụ Maazị Ogbonnaya Onu nwụrụ n'otu ụlọọgwụ dị n'Abuja ụbọchị Tọzde 11 Eprel, 2024 dịka ọ gbachara afọ 72.
Ogbonnaya Onu bụbu aka chịrị Abia Steeti ma bụrụkwa Mịnịsta Sayensị na Nkanụụzụ n'okpuru ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari.
A họpụtara Ogbonnaya Onu dịka gọvanọ Abia Steeti mbụ n'afọ 1991 dịka ọ bụkwaara onyeisioche mbụ nke otu jikọtara ndị gọvanọ Naịjirịa.
Ọ bụ ya hụrụ maka nhiwe Abia Technology Village, College of Technical Education Arochukwu, Michael Okpara Federal University of Agriculture Umudike nakwa Abia Steeti Polytechnic.
Ogbonnaya Onu gakwara ozi dịka onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Nigerian Peoples Party (ANPP) nke adịghizi ugbua bụ ebe ọ nọọrọ nweta mmeri iji aha pati ahụ zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 1999.
Ọ nọgidere na pati ANPP ruo mgbe ejikọrọ ya na CPC na ACN iji hiwe APC.
Onyeisiala Naịjirịa pụrụ apụ bụ Mụhammadu Buhari họpụtara ya dịka Minịsta Sayensi na Nkanụụzụ n'afọ 2019.
Oliliozu ya kpotụrụ ụbọchị Fraịde 8 Nọvemba, 2024.
Elizabeth Evoeme 'Ovularia' - Omee ejije Nollywood

Ebe foto si, Elizabeth Evoeme 'Ovularia'/Facebook
Onye na-eme ejije bụ Madam Elizabeth Evoeme a maara nke ọma dịka 'Ovularia' nwụrụ na Pọtakọt nke Rivas steeti n'ụbọchị Sọnde 5 Mee 2024 dịka ọ rịachara ọrịa.
A nọburu n'abalị 5 nke ọnwa Nọvemba 2019 kwupụta na nwaanyị ahụ anwụọla mana ka e mesịrị, ezinaụlọ ya kọwara nke ahụ dịka ozi ụgha.
Ovularia bụ onye ejije a ma ama tụmadị n'ejije 'The New Masquerade'.
E liri ya ụbọchị Fraịde 6 Disemba, 2024.
John Ikechukwu Okafor 'Mr Ibu' - Omee ejije Nollywood

Ebe foto si, realmribu/Instagram
N'ụbọchị Satọde 2 Maachị ka ozi pụtara banyere ọnwụ nwaamadị a ma ama na-eme ihe ejije mkpaọchị aha ya bụ John Okafor onye e ji Mr Ibu mara.
Mr. Ibu nwụrụ n'ụlọọgwụ dị na Legọs bụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ n'ụkwụ e bere ya n'ọnwa Nọvemba afọ 2023.
Mr Ibu nọ n'ọrịa kemgbe afọ 2023.
Nke bụ eziokwu bụ na ọ gbara ihe niile n'anwụ oge ọ rịọrọ ka ọha nyere ya aka n'ọnwa Oktoba afọ 2023.
Nwa ya nwaanyị bụ Jasmine gwara BBC Igbo oge ahụ na; 'a mabeghi ihe na-arịa nna m', mana e mechara o kwuo na a wara ya ahụ ihe ruru ugboro ise.
E liri ozu Mr Ibu n'obodo ya Amuri dị n'okpuru ọchịchị Nkanu West dị n'Enugwu steeti ụbọchị Fraịde 28 Juun 2024.
Amaechi Mounagor - Omee ejije Nollywood

Ebe foto si, Amaechi Mounagor/Facebook
Onye e ji ịkpa ọchi na ime ejije Nollywood a maara bụ Amaechi Mounagor nwụrụ n'ehihie ụbọchị Sọnde 24 Maachị 2024 ka ọ rịachara ọrịa ọnwa ole ma ole.
Ọ gbara afọ 61 tupu ọ nwụọ.
Amechi Muonagor bụ onye Obosi nke dị na okpuru ọchịchị Idemmili North , Anambra steeti. A mụrụ ya na ụbọchị 20th August 1962, nke pụtara na ọgbara afọ 61 tupu ọlaa mụọ.
Ọ malitere ndụ ya site na ị ga akwụkwọ nke praimari na St. marys Praimari skuul Obosi. Onwetara nzere mmụta "BSC Economics" n'ụlọ akwụkwọ mahadum nke University of Naijiria Nsukka n'afọ 1987.
E liri ozu ya ụbọchị Fraịde Juun 21, 2024.









