Onweghi arịrịọ mgbaghara ọbụla Speed Darlington rịọrọ Burna Boy - Ọkaiwu Alieke
Ọkaiwu na-achọchiteanya Speed Darlington bụ Stanley Alieke ekwuola na ọ rịọghị Burna Boy mgbaghara ọbụla tupu a tọhapụ ya.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọkaiwu Alieke kwuru na e tinyegodu Darlington egbe n'isi ka ọ rịọ Burna Boy, na ọ gaghị eme ya.
O kwuru na ọ nweghi uru ọbụla ọ baara ịrịọ arịrịọ maka na ọ bụzi ụlọikpe ka ọ dị n'aka ikpebi ma o mere Burna Boy ihe ọjọọ.
Kwuru na mgbe mbụ ha dere akwụkwọ ịrịọ arịrịọ na ọ bụ ya bụ ọkaiwu dere ya na ọ bụghị Speed Darlington.
Ọkaiwu Alieke rụtụkwara aka n'ọnọdụ ndị e jiri gbapụta ya n'ụlọmkpọrọ bụ ebe ọ nọrọla ọnwa atọ.
O kwuru na a naara Darlington akwụkwọ njem ya ebe otu onye ọrụ bekee nwere ụlọ n'Abuja binyere aka n'akwụkwọ mgbapụta ya.
Kirie ihe ndị o kwuru n'uju;
Ụlọikpe eyigharịala ikpe dị n'etiti Speed Darlington na onyeisi ndị uweojii Naịjirịa

Ụlọikpe ukwu etiti Naịjirịa dị n'Abuja enyigharịala ikpe dị n'etiti Speed Darlington a mara dịka 'Akpi' na onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Cheta na Speed Darlington kpụpụrụ onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun ụlọikpe maka ịmetọ ikike ya.
Cheta na ndị uweojii nwụchiri otiegwu Speed Darlington a maara dịka 'Akpi' bụ n'onwa Ọktoba 2024, ma nwụchigharịa ya ụbọchị Satọde 23 Novemba 2024 ma kpọchie ya kemgbe ahụ maka ihe onyonyo o kesara n'akara soshal midịa ya banyere otiegwu Damini Ebunoluwa Ogulu a maara dịka Burna Boy.
N'okwu ya oge ụlọikpe nụrụ ikpe ahụ ụbọchị Mọnde 13 Jenụwarị, 2025, ọkaiwu ndị uweojii bụ Garba Audu kwuru na ihe mere ndị uweojii ji ghara ịtọhapụ Speed Darlington bụ maka na Speed Darlington emezubeghị iwu ntọhapụ beelu ụlọikpe nyere ya kemgbe 6 Jenụwarị, 2025.
Audu gara n'ihu kwuo na n'agbanyeghị na Speed Darlington gbara akwụkwọ 'counter affidavit' maka ịmetọ ikike ya, ọkaiwu ya enyebeghị ya akwụkwọ banyere nke a.
Ka ọ dị ugbua, Audu enwetala akwụkwọ ahụ nke mere ka ụlọikpe nyigharịa ikpe ahụ ụbọchị Mọnde 27 Jenụwarị iji nye ọkaiwu Audu ohere ịgụ ma nye nzaghachi.
Speed Darlington akpụpụla onyeisi ndị uweojii n'ụlọikpe maka imetọ ikike ya

Ebe foto si, Speed Darlington/Instagram/Nigeria Police/X
Ụlọikpe Federal High Court Abuja amapụtala Mọnde 13 Jenụwarị, 2025 maka ịnụ akwụkwọ ikpe Speed Darlington a maara dịka 'Akpi' gbara onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Adeolu Egbetokun maka ịmetọ ikike ya.
Cheta na ndị uweojii nwụchiri otiegwu Speed Darlington a maara dịka 'Akpi' bụ n'onwa Ọktoba 2024, ma nwụchigharịa ya ụbọchị Satọde 23 Novemba 2024 ma kpọchie ya kemgbe ahụ maka ihe onyonyo o kesara n'akara soshal midịa ya banyere otiegwu Damini Ebunoluwa Ogulu a maara dịka Burna Boy.
Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe Akpi na-ebo Burna Boy ebubo dị iche iche gụnyere mmekọ ya na otiegwu mba Amerịka bụ P Diddy, onye a nwuchiri maka ebubo imetọ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị.
Mana ka ọ dị ugbua, Speed Darlington akpọpụla onyeisi ndị uweojii ụlọikpe maka ịga n'ihu kpochie ya n'agbanyeghị na ụlọikpe nyere iwu ka a tọhapụ ya.
N'akwụkwọ ahụ Speed Darlington gbara, o kwuru ka Kayode Adeolu Egbetokun kwụọ ya N300m maka imetọ ikike ya dịka nwaafọ Naịjirịa.
Mgbe ụlọikpe nyere iwu ka a tohapụ Speed Darlington

Ebe foto si, Speed Darlington/Instagram
Ọkaikpe Musa Suleman Liman nke ụlọikpe Federal High Court dị n'Abuja enyela iwu ka a tohapụ Speed Darlington a maara dịka Akpi ma kpọnye ya ọkaiwu ya bụ Marshal Abubakar.
Nke na-abịa dịka ọkaiwu Speed Darlington rịọrọ ka a tọhapụ ya ụbọchị Mọnde 6 Jenụwarị, 2025.
Cheta na ndị uweojii nwụchiri otiegwu Speed Darlington a maara dịka 'Akpi' n'onwa Ọktoba 2024, ma nwụchigharịa ya ụbọchị Satọde 23 Novemba 2024.
Akụkọ kwuru na ọ bụ Damini Ebunoluwa Ogulu a maara dịka Burna Boy kpọrọ ndị uweojii ahụ nwụchiri Speed Darlington.
N'agbanyeghị na ọkaiwu Burna Boy gbara mbọ igbochi ntọhapụ nwaamadị ahụ, Ọkaikpe Liman nọrọ ụbọchị Mọnde Jenụwarị 6, 2025, nye iwu ka a tọhapụ Speed Darlington.
Ụlọikpe mechara yigharịa ikpe ahụ ụbọchị Mọnde Jenụwarị 13, 2025.
Ụlọikpe enyela Speed Darlington 'Akpi' beelu

Ebe foto si, Speed Darlintv/Instagram
Ọkaiwu na-anọchite anya Otiegwu Darlington Okoye Achakpo a ma dịka 'Akpị' bụ Stan Alieke ekwuola na ụlọikpe atọghapụla ya na beelu.
Ọ gbara ama nke a na mkparịtaụka ekwentị ya na BBC Igbo nwere n'ụtụtụ ụbọchị Monde dịka o kwuru na ha na-ahazi usoro ga-eme ka ọ pụta nsonso a.
Cheta na o kwuburu na ndị uweojii na-akwadobu ijichi Akpi rue ọnwa Jenụwarị afọ ọhụrụ na-abịa mana ọ mịtaghị mkpụrụ.
O karịala izuụka abụọ a nwụchigharịrị otiegwu Akpi maka ịmebi usoro beelu enyeburu ya mbụ n'agbanyeghi nkọwa ọkaiwu ya nyere ndị uweojii.
Kemgbe ahụ, ndị mmadụ na soshal midia na-ekwuputa iwe ha maka njichi ejichiri ya bụ otiegwu ma na-akpọ oku ka atọghapụ ya.
Ha na-ebo ebubo na njichi ya bụ mkpagbu maka okwu dị n'etiti ya na otiegwu ibe ya Burna Boy.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ndị uweojii chọrọ ikpọchi Speed Darlington ruo Jenụwarị 15 - Ọkaiwu Stan Alieke

Ebe foto si, Speed Darlington/Instagram
Ọkaiwu na-anọchiteanya Speed Darlington bụ Stan Alieke ekwuola na ndị uweojii achọghị inye Speed Darlington e ji 'Akpi' mara ntọhapụ beelu n'agbanyenghị na ọ bụ ihe ha kwesịrị ime.
Ọkaiwu Alieke kwuru na ka ọ dị ugbua, ndị uweojii ekwuola na ọ bụ ụlọikpe nwere ikike inye Speed Darlington ntọhapụ beelu.
N'okwu ya "Anyị degaara ụlọikpe akwụkwọ iji nweta beelu Speed Darlington, ọ bụ ụbọchị Mọnde 23 Disemba ka anyị ga-ama mkpebi ụlọikpe banyere nke a".
Maka ihe mere ndị uweojii ji wuchigharịa Speed Darlington, ọkaiwu Alieke kwuru na "Ndị uweojii kwuru na Speed Darlington dara iwu ntọhapụ beelu e nyere ya na mbụ maka njem mba Amerịka o mere, mana nke ahụ abụghị eziokwu".
"Njem mba Amerịka ahụ Speed Darlington mere bụ maka ahụike ya, anyị gwara ndị uweojii tupu o mee njem ahụ," ka Ọkaiwu Alieke kwuru.
Cheta na oge mbụ ndị uweojii nwụchiri otiegwu Speed Darlington a maara dịka 'Akpi' bụ n'onwa Ọktoba 2024, ma nwụchigharịa ya ụbọchị Satọde 23 Novemba 2024.
Akụkọ kwuru na ọ bụ Damini Ebunoluwa Ogulu a maara dịka Burna Boy kpọrọ ndị uweojii ahụ nwụchiri Speed Darlington.
Nnwuchi a bụ maka ihe onyonyo Speed Darlington kesara n'akara soshal midịa ya.
Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe Akpi na-ebo Burna Boy ebubo dị iche iche gụnyere mmekọ ya na otiegwu mba Amerịka bụ P Diddy, onye a nwuchiri maka ebubo imetọ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị.
Ihe mere ndị uweojii ji achọghị ịtọhapụ Speed Darlington – Deji Adeyanju

Ebe foto si, Speed Darlington/Burna Boy/Instagram
Ọkaiwu Deji Adeyanju ekwuola na ndị uweojii ajụla ịtọhapụ Speed Darlington Okoye a na-akpọ Akpị maọbụ kpụpụ ya ụlọikpe kemgbe ha nwuchigharịrị ya ụbọchị Mọnde 23, Nọvemba, 2024, n'Owerri isi obodo Imo steeti.
Ozi Adeyanju wepụtara n'akara soshal midịa X kwuru na ndị uweojii kwuru na ihe mere ha ji achọghị ịtọhapụ Speed Darlington bụ na ha na-eche na o nwereike ịgba ọsọ maka na oge mbụ ha nyere ya ntọhapụ beelu, o mere njem mba Amerịka.
Mana ọkaiwu Adeyanju kwuru na okwu ndị uweojii a abụghị eziokwu. Ọ kọwara na ọ gwara ndị uweojii na Sapeed Darlington ga-eme njem mba Amerịka ahụ ma kwuo na ọ ga-alaghachita.
N'aka nke ọzọ, ọkaikpe Stan Alieke bụ ọkaikpe Speed Darlington kwuru na nọ n'ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abuja anụghị ikpe Speed Darlington maka na ndị ọkaikpe ụlọikpe gara ọgbakọ.
O kwuru na ọ bụ naanị ụlọikpe nwereike ikwu ihe ga-eme n'ikpe a.
Ndị uweojii anwuchigharịala Speed Darlington n'ihi BurnaBoy - Deji Adeyanju

Ebe foto si, SpeedDarlington/x
Speed Darlington Okoye a na-akpọ Akpị na-ewu maka akụkọ pụtara etu ndị uweojii siri nwuchie ya n'Owere, Imo steeti.
BBC Igbo jụrụ ese ya n'aka onye okaiwu ya bụ Deji Adeyanju ya asị:
"Ee ndị uweojii anwuchiela Speed Darlington n'Owerri n'ihe dịka elekere 2:30 n'ụtụtụ ụbọchị 23 Novemba 2024 n'ụlọ ezumike ọ na-ehi ụra ka o tichara egwu."

Ebe foto si, Otiegwu Burna boy na Speed Darlington/ X
Adeyanju gara n'ihu kwuo na, “Ọ bụ Burnaboy na-eme ihe niile a”.
"Ndị uweojii na-ebu Speed Darlington aga Abuja ka anyị na-ekwu."

Ebe foto si, BurnaBoy/Instagram
Ihe BurnaBoy nwere ikwu maka nwuchigharị Speed Darlington
Damini Ebunoluwa Ogulu nke ndị mmadụ ma dịka Burna Boy site n'ọnụ ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Buki, si "o nweghị ihe ha nwereike ikwu maka okwu a ugbua."
Nwa nkenke ihe i kwesịrị ịma maka Burna Boy
- Ezigbo aha ya bụ Damini Ebunoluwa Ogulu
- E chiri ya MFR bụ Member Order of the Federal Republic dịka onye otu ọgaranya mba Naịjirịa
- Aha e jiri mara ya bụ Burna Boy.
- Ọ bụ ọgụụ egwu Naịjirịa turu ugo na mba dị icheiche, ma na-edekwa, edekọ, eti ma na-ahazị egwu.
- Ihe e jiri mara ya bụ ka ọ wepụtara egwu ya nke 2012 nke ọ kpọrọ "Like to Party", n'ime ndekọ egwu ya a na-akpọ L.I.F.E
- Aha nne ya bụ Bose Ogulu, o nwere ụmụ nne abụọ a ma.
Onye bụ Speed Darlington?
Kedụkwanụ onye bụ onye a a na-akpọ Speed Darlington?
- Ezigbo aha ya bụ Darlington Okoye Achakpo.
- A ma ya dịka Speed Darlington maọbụ Akpị.
- O si n'Arọndịzọgụ n'Imo steeti.
- Ọ bụ nwa Pericoma, ọgụụ egwụ nwụrụ anwụ.
- A ma ya dịka ọgụụ egwu na-agazu mba ụwa niile.










