Ka ụlọọrụ mmanụ agbịdị Port Harcourt ga-esi metụta ọnụahịa mmanụ ụgbọala

Ebe foto si, Getty Images/BBC
Kemgbe ụlọọrụ NNPCL wepụtara ozi na ụlọọrụ mmanụ agbịdị dị na Port Harcourt Refining Company, Rivas steeti amalitela ọrụ ọzọ, ọnụ jupụtara ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa obi ebe ụfọdụ kwuru na ọ bụ ihe a na-atụghị anya ya.
Onyeisi mgbasaozi NNPCL bụ Femi Soneye gbara ama a n’akwụkwọ ozi o wepụtara ụbọchị Tuzde 26, 2024 .
Soneye kwuru na ụlọọrụ mmanụ agbịdị ahụ ga na-emepụta barrel mmanụ agbidi dị narị puku naịra isii (600,000) kwa ụbọchị.
Naịjirịa so na mba kachasị emepụta mmanụ agbịdị n’Afrịka mana ọ ka na-enwe nnukwu ụkọ mmanụ ụgbọala n’agbanyeghị na e nwere ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbịdị anọ na Naịjirịa.
Ụlọọrụ mmanụ agbịdị Port Harcourt ọ ga-emetụta ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa?
Ihe ndị maara ihe ekwe na-akụ kwuru
Bala Zakka onye maara ihe ekwe na-akụ banyere akụnaụba, ụtụisi na mmanụ, gwara BBC Igbo na mmalite ọrụ ụlọọrụ mmanụ agbịdị dị na Port Harcourt bụ ezigbo ihe meere Naịjirịa.
"Ọ bụ ihe ịtụ n'anya nye anyị niile bụ ndị maara ihe ekwe na-akụ bamyere mmanụ" ka Bala Zakka kwuru.
O kwuru na a tụrụ anya na ụlọọrụ mmanụ agbịdị ahụ ga-amalite ịrụ ọrụ maka gọọmenti kwuru na ha amalitela ọrụ idozi ụlọọrụ ahụ.
Ka anyị jụrụ ya etu nke a ga-esi metụta ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjriịa, lee ihe Zakka kwuru.
"Ọ bụrụ na ihe niile dị etu o kwesịrị, ọnụahịa mmanụ gbọala kwesịrị ibelata tinyere na a ga-enwe mmanụ zuruoke na naịjirịa niile gbaa gburugburu".
Zakka gara n'ihu kọwaa na ọ bụrụ na ụlọọrụ mmanụ agbịdị Port Harcourt ga-enweta ọrụ nye ndị obodo ebe ọ dị ma mee ka mmanụ ụgbọala mụbawanye nwee mee ka Naịjirịa malite iziga mmanụ na mba ofesi. O kwuru na nke a ga-eme ka akụnaụba bawanye.
N'aka nke ọzọ, Adeola Yusuf onye na-ede banyere mmanụ agbịdị kwuru na nke bụ eziokwu bụ na a na-atụanya na ọnụahịa mmanụ ụgbọala ga-ebelata site na mmepegharị ụlọọrụ mmanụ agbịdị Port Harcourt.
"Nke a bụ ihe kwesịrị ime mana ọ dị mkpa ka ụmụafọ Naịjirịa ghara ịtụ anya na nso nso a", ka Adeola gbakwunyere.

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ Port Harcourt Refining Company e mepere n’afọ 1965, bụ ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbịdị kachasị na Naịjirịa. E mepere nke abụọ ya na 1989.
N’afọ 2019, akụkọ kwuru na ego ruru otu narị ijeri naịra na iri isii na asaa (167 billion naira) funarịrị Port Harcourt Refining Company maka ọ rụghị ọrụ ọtụtụ afọ.
Ọgbakọ Nigeria Federal Executive Council nọrọ n’ọnwa Maachị 17, 2021 kwado ego ruru otu ijeri dọla na ụma ise ($1.5billion) ka e jiri dozie ụlọọrụ Port Harcourt Refining Company.
Oge ahụ, onye bụbu mịnịsta nta na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ Timipre Sylva kwuru na ndozie ahụ ga-enwe nkeji atọ. Nke mbụ bụ ga-enwe ọnwa iri abụọ na asatọ (28), agba nke abụọ ọnwa iri abụọ na anọ (24) ebe agba nke abụọ ga-enwe ọnwa iri anọ na anọ (44).








