Gịnị mere ụmụntakịrị ndị nwaanyị dị afọ isii ji ahụzi nsọ ha ma yie ụmụagbọghọ?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Deepali Jagtap, Sushila Singh
- Ndị mere akụkọ a, BBC News Marathi / BBC News Hindi correspondents
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Archana, nne nwata nwaanyị dị afọ isii, chọpụtara mgbanwe pụtara ihe n'ahụ nwa ya nwaanyị nke na-ekwesịghị ekwesi, nke a malitere inye nchekasị ahụ.
"Ụjọ tụrụ m ịhụ ụdịrị ihe n'afọ obere a. Ọ malitere ịna-enwe mgbakasị ahụ n'obere ihe. Mgbanwe ndị a nọ na-enye nchekasị," ka o kwuru.
Archana nke abụghị ezi aha ya na ezinaụlọ ya bi n'otu obodo dị na Satara nke mpaghara western India.
Ya na di ya nakwa ụmụaka ha abụọ - otu nwoke na otu nwaanyị, bi n'obere ụlọ a rụrụ n'ọrụ ugbo.
Mgbe Ada Archana malitere ịdị ka nwagbọghọ karịa afọ ya, o kpebiri idu ya aga hụụ dọkịnta ahụike.
'Ọ raara anyị ahụ ịnabata ya'

Ebe foto si, Getty Images
N'aka nke ọzọ, Rashi onye bi na Delhi, malitekwara ịhụ mgbanwe n'ahụ nwa ya nwaanyị ma kpọ ya ihe nkịtị.
Nwa ya nwaanyị dị afọ isii buru ibu dị n'ogogo 40kg mana ọ hụtara ya dịka "nwata ahụ gbasiri ike".
Mana otu ụbọchị, nwa Rashi nke nwaanyị a kwuru na ọbara malitere isi n'ahụ ya apụta.
Mgbe ha gachara hụụ onye dọkịnta, a chọpụtara na nwata ahụ amalitela ịhụ nsọ ya.
"Ọ raara anyị ahụ ịnabata ihe a. Nwa m nwaanyị aghọtaghị ihe na-eme ya," ka Rashi kwuru.
N'otu mgbe ahụ, otu onye dọkịnta ọdịnala, nyere Archana ndụmọdụ ka ọ kpọpụrụ onye dọkịnta pụrụiche na-ahụ maka ahụ ụmụnwaanyị a kpọrọ 'gynaecologist'.
"Mgbe Archana kpọtaara anyị nwa ya, mgbe anyị mechara nyocha ahụ ya, anyị chọpụtara na o nwere njirimaara niile nke ito nwagbọghọ n'ahụ ya. Ahụ ya dịka nke onye dị afọ 14 ruo 15, o nwereike ịmalite ịhụ nsọ ya n'oge na-adịghị anya," ka Dkt. Sushil Garud nke ụlọọgwụ Motherhood dị na Pune kwuru.

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dkt Garud kwuru na akụrụngwa 'hormone' dị n'ahụ nwata nwaanyị karịrị ka o kwesịrị n'afọ ya, ma sị na ọtụtụ ihe nwereike ibute nke a.
"Archana gwara m na e nwere okporo ọgwụ ọtapịapịa 'pesticides' abụọ ibu ha dị 5kg n'otutu, nke nwa ya nwaanyị na-eji egwu egwu. Ya mere nke nwereike ịbụ otu n'ime ihe mere 'hormone' nwata ahụ jiri gbanwee," ka dọkịnta kwuru.
Dkt Garud kwuru na ụdịrị mgbanwe a n'ahụ ụmụaka ka a na-akpọ 'precocious puberty or early puberty'.
Oge ntolite 'Puberty' bụ usoro na-eweta mgbanwe n'ahụ nwata nwoke maọbụ nwaanyị, akụkụ anụahụ ha ji enwe mmekọrịta nwoke na nwaanyị na-apụta ihe, ha enwee ike ịmụpụta nwa.
Ọtụtụ ụmụaka ndị nwoke na-epu ajị n'ihu nakwa n'ebe ha jiri bụrụ nwoke, olu ha na-agbanwe na-ada ụda. Ọtụtụ ụmụaka ndị nwaanyị na-epu ajị n'ihe ha ji bụrụ nwaanyị, kpụọ ara ma malite ịhụ nsọ ha.
Ọ bụ ihe nkịtị, ka ntolite a malite ngwa ngwa n'ahụ nwaanyị n'agbata afọ 8 ruo 13 ebe nke nwoke nwereike ịbụ n'agbata afọ 9 ruo 14.
Dkt Vaishakhi Rustegi, na-ahụ maka ntolite ụmụaka a kpọrọ 'paediatrician and adolescent endocrinologist' nke na-ebe anya na akụrụngwa 'hormone' nakwa ọrịa ndị metụtara ya kwuru na ọ hụtara mgbanwe n'ahụ ụmụaka nwaanyị n'afọ ole ma ole gara aga.
"Anyị na-ahụbu na ụmụaka nwaanyị na-ahụta nsọ ha n'ọnwa 18 ruo afọ atọ mgbe mbụ ha malitere ịhụ mgbanwe n'ahụ ha mana ugbua ha na-ahụzi nsọ ha n'ime ọnwa atọ ruo anọ," ka ọ gwara BBC.
O kwuru na ndị nwoke na-agbazi ahọọnụ n'ime otu afọ ruo otu afọ n'ụma ha malitere ntolite, mana mgbe mbụ ọ na-ewecha ihe ruru afọ anọ.

Ebe foto si, Getty Images
Dkt Suchitra Surve, nke ọrụ ahụike 'Child Health Research Department na ngalaba 'Indian Council of Medical Research (ICMR)', na nyocha o mere, chọpụtara na etu ụmụaka sizi etolite n'ogogo 'puberty' na-arịzi elu.
Nyocha nke ụlọọrụ 'National Institute for Research in Reproductive and Child Health (ICMR-NIRRCH) mere ụmụaka ụmụnwaanyị dị 2,000 gosiri na ndị nne anaghị ọghọta njirimaara ntolite 'puberty'
Ụlọọrụ a na-eme nyocha banyere ihe na-ebute ntolite n'oge nakwa ọghọm dị na ya n'ebe ụmụaka ụmụnwaanyị dị n'okpuru afọ itoolu.
N'afọ 2020, ụlọọgwụ Bai Jerbai Wadia dị na Mumbai nakwa ICMR gbakọtara aka mee nyocha maka ntolite ụmụaka ụmụnwaanyị nọ n'agbata afọ isii ruo itoolu.
“Ụmụaka ụmụnwaanyị iri isii, nọ n'agbata afọ isii na itoolu hụtara ntolite ngwa ngwa ebe ụfọdụ nwereike ịmalite nsọ ha n'oge na-adịghị anya,” ka Dkt Sudha Rau, na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ ahụ na ngalaba 'paediatrician' kwuru.
Gịnị na-eme ntolite 'puberty' bido n'oge?

Ebe foto si, Getty Images
Ndị dọkịnta kwuru na ọtụtụ ihe nwereike ibute ntolite ngwa ngwa ahụ na ọ bụghị naanị otu ihe maka na nyocha ka na-aga n'ihu.
Ha kwenyere na ọtapịapịa 'pesticides', ihe ndị e ji echekwa nri, mmetọ nakwa ibu nwereike iso n'ihe ndị na-ebuta ya.
Dkt Prashant Patil, na-enyocha nsogbu a na Mumbai, kwuru na oke ibu so na n'ihe ndị kachasị ebute ntolite 'puberty' ngwa ngwa ma sị na nsogbu a arịala elu maka etu ọtụtụ ụmụaka si ebuzi oke ibu, ọkachasị n'oge ahụ Covid-19 na-akpa ike.
Ihe karịrị ụmụaka nde 390 nọ n'agbata afọ 5 ruo 19 nwere nsogbu oke ibu n'afọ 2022, gụnyere mmadụ nde 160 nwere ọrịa a ibu, dịka ngalaba ahụike mbaụwa World Health Organization (WHO) si kwuo.
Ọrịa ibu a kpọro 'Obesity' bụ ọrịa ọjọọ nke ihe na-ebute ya bụ nnukwu abụba n'ahụ mmadụ nke nwereike imerụ mmadụ ahụ.
A na-eji akụrụngwa 'body mass index (BMI)' a chọpụta ogogo ya, nke gụnyere ụdịdị ahụ, afọ ole, ibu ahụ nakwa ogolgo nwata ahụ.
Oke ịpị aka n'ekwentị, ikiri TV nakwa ihe onyonyo ndị ọzọ, anaghị emegharị ahụ so n'ihe ndị nwereike ibute ya.
Dr Vaisakhi kwuru n'afọ abụọ maọbụ atọ gara aga, na mmadụ ise n'ime isii na-ahụ nsọ ha kwa ụbọchị na-abụkaarị ụmụaka ụmụnwaanyị na ngalaba ụlọọgwụ ha.
"E nwere m oge ụfọdụ ndị nne na-asị na ha hụtara mgbanwe n'ahụ ụmụaka ha ndị nwaanyị n'ọnwa Eprelụ ebe nsọ ha na-amalite n'ọnwa Juun - Julaị. Ugbua ụdịrị ihe a na-emekwa n'ebe ụmụnwoke nọ," ka o kwuru.
O kwuru na ịnọte aka n'ekiri ihe onyonyo so na-ebute ntolite 'puberty' n'oge.
Ugbua nwa nwaanyị Archana na Rashi na-anata ọgwụgwọ nwereike ịdọla oge nsọ ha azụ ruo opekatampe afọ 10 maọbụ 11.
Ndị dọkịnta kwuru na afọ ole a ha dị ugbua, na ụmụaka ndị a akabeghi aka ilekọta ma dosa onwe ha ọcha n'oge nsọ ha.
Ndị dọkịnta a kwuru na ụmụaka ndị malitere ntolite 'puberty' n'oge na-enwekaarị nsogbu echiche mmekọrịta a kpọro 'psychosocial'.
Nocha gosiri na ụmụaka ụmụnwaanyị nwereike inwe nsogbu nkatọ ahụ ha, ebe ụmụaka ibe ha nwereike ị na-akọ ha ọnụ maka mgbanwe ndị dị n'ahụ ha.









